Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Hel? Ọ̀ Bụ Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ Ruo Ebighị Ebi?

Gịnị Bụ Hel? Ọ̀ Bụ Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ Ruo Ebighị Ebi?

Ihe Baịbụl kwuru

Ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl dere “hel” n’ebe e dere okwu Hibru bụ́ “Shiol,” deekwa ya n’ebe e dere okwu Grik bụ́ “Hedis.” Shiol na Hedis pụtachara ili. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ Ndịozi 2:27) Ọtụtụ ndị kweere na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ otú a e sere na foto a dị n’aka nri. Ma, ihe a abụghị ihe Baịbụl kwuru.

  1. Ndị nọ na hel amaghị ihe ọ bụla. N’ihi ya, ha agaghị anụli ụfụ ihe. “Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol.”Ekliziastis 9:10.

  2. Ndị ezi omume na-aga hel. Ndị ezi omume aha ha bụ Jekọb na Job kwuru na ha ga-aga hel.Jenesis 37:35; Job 14:13.

  3. ụgwọ ọrụ mmehie, ọ bụghị ịta mmadụ ahụhụ n’ọkụ. “A tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.”Ndị Rom 6:7.

  4. Ọ bụrụ na Chineke na-ata mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ ruo ebighị ebi, ọ pụtara na ọ naghị ekpe ikpe ziri ezi. (Diuterọnọmi 32:4) Mgbe nwoke mbụ bụ́ Adam mechara mmehie, Chineke gwara ya na ọ ga-akwụsị ịdị adị. Ọ sịrị ya: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Jenesis 3:19) Ọ bụrụ na Chineke tụbara Adam n’ọkụ ala mmụọ, ọ pụtara na ọ tụọla asị.

  5. Ịta ndị mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ abatatụbeghị Chineke n’obi. Iche na Chineke ga-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke. Baịbụl sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.”1 Jọn 4:8; Jeremaya 7:31.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ? Ànyị ga-ahụ ndị anyị nwụrụ anwụ ọzọ?