Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere Chineke Ji Gba Nkịtị E Gbukpọọ Ndị Juu Bi na Yurop?

Gịnị Mere Chineke Ji Gba Nkịtị E Gbukpọọ Ndị Juu Bi na Yurop?

Ndị na-ajụkarị ajụjụ a bụ ndị e gbụrụ ndị nke ha n’oge ahụ e gbukpọrọ ndị Juu. Ha chọkwara ka a kasie ha obi, ọ bụghị naanị ka a zaa ha ihe ha na-ajụ. Ụfọdụ na-ewerekwa ya na mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu bụ ihe ọjọọ kachanụ ụmụ mmadụ metụrụla. O meziri ka ọ na-esiri ha ike ikwere na Chineke.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-eche gbasara Chineke na mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu

Ụgha: Anyị ekwesịghị ịjụwa Chineke ihe mere o ji gba nkịtị ka e gbukpọọ ndị Juu.

Eziokwu: Ndị fere Chineke n’oge gara aga nwere mgbe ha jụrụ Chineke ihe mere o ji gba nkịtị ka ihe ọjọọ na-eme. Dị ka ihe atụ, Habakọk onye amụma jụrụ Chineke, sị: “Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m, gịnị mere esemokwu ji na-adị, gịnịkwa mere e ji na-alụ ọgụ?” (Habakọk 1:3) Chineke abaraghị Habakọk mba maka ajụjụ ahụ ọ jụrụ, kama, o mere ka e dee ihe ahụ ọ jụrụ na Baịbụl.

Ụgha: Chineke achọghị ịma ma ụmụ mmadụ hà na-ata ahụhụ.

Eziokwu: Chineke kpọrọ mmegbu asị. Ọ naghịkwa amasị ya ịhụ ka a na-ata ndị mmadụ ahụhụ. (Ilu 6:16-19) N’oge Noa, ime ihe ike juru n’ụwa ‘wutere Chineke n’obi.’ (Jenesis 6:5, 6) Anyị makwa nke ọma na mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu wutere Chineke nke ukwuu.—Malakaị 3:6

Ụgha: Chineke ji mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu taa ndị Juu ahụhụ.

Eziokwu: Chineke kwere ka ndị Rom bibie Jeruselem n’afọ 70. (Matiu 23:37–24:2) Mana, mgbe nke ahụ mechara, Chineke anaghịzi ahọrọ otu agbụrụ ọ ga-emere ihe ọma ma ọ bụ nye ntaramahụhụ. N’anya Chineke, ‘ọ dịghị ihe dị iche n’etiti ndị Juu na ndị mba ọzọ.’—Rom 10:12, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ụgha: Ọ bụrụ na e nwere Chineke hụrụ anyị n’anya, nweekwa ike dị ukwuu, ọ gaaraghị ekwe ka e gbukpọọ ndị Juu.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na Chineke anaghị akpata ihe ọjọọ, ma ọ na-ahapụtụ ka ihe ọjọọ mee mgbe ụfọdụ.—Jems 1:13; 5:11.

Gịnị mere Chineke ji gba nkịtị e gbukpọọ ndị Juu?

Ihe mere o ji gba nkịtị e gbukpọọ ndị Juu bụ otu ihe ahụ mere o ji gba nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, ya bụ, ka a mata onye ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ihe Baịbụl kwuru mere ka o doo anya na ọ bụghị Chineke na-achị ụwa, kama na ọ bụ Ekwensu. (Luk 4:1, 2, 6; Jọn 12:31) Isiokwu dị n’ala ala peeji a kacha kọwaa ihe mere Chineke ji kwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Ma, ka anyị kwuo ihe abụọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịma ihe mere Chineke ji gba nkịtị e gbukpọọ ndị Juu.

  1. Ọ bụ ihe ọjọọ ndị mmadụ ji aka ha kpebie ime kpatara mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu? Chineke gwara Adam na Iv ihe ọ chọrọ ka ha mee, ma, o nweghị mgbe ọ manyere ha ime ya. Adam na Iv họọrọ iji aka ha kpebie ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Adam na Iv họọrọ ime ihe ọjọọ. Ihe a ha mere kpataara anyị ọtụtụ nsogbu. Ọ bụkwa otú ahụ ka ihe ọjọọ ndị mmadụ na-ahọrọ ime taa na-akpatara anyị ọtụtụ nsogbu. (Jenesis 2:17; 3:6; Ndị Rom 5:12) Ọ bụ otu ihe a ka akwụkwọ a na-akpọ Statement of Principles of Conservative Judaism kwuru. Ọ sịrị: “Ihe na-akpata ọtụtụ nsogbu a na-enwe taa bụ na anyị na-eji aka anyị ahọrọ ime ihe na-adịghị mma.” Chineke ejighị maka ihe a nara ụmụ mmadụ ikike o nyere ha ịhọrọ ime ihe ha chọrọ, kama, ihe o mere bụ ịhapụtụgodị ụmụ mmadụ ka ha na-eme otú dị ha mma.

  2. Chineke ga-edozi nsogbu niile mgbukpọ ahụ e gbukpọrọ ndị Juu kpatara. Chineke na-ekwe anyị nkwa na ya ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ma ndị Juu ahụ e gburu na Yurop. Chineke ga-emekwa ka ndị Juu ndị ọzọ a na-egbughị gharazie ịna-enwe obi mgbawa maka ihe ahụ merenụ. (Aịzaya 65:17; Ọrụ Ndịozi 24:15) Obi siri anyị ike na Chineke ga-emezu ihe a o kwuru n’ihi na anyị ma na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya.—Jọn 3:16.

Ọtụtụ ndị e gburu n’oge ahụ e gbukpọrọ ndị Juu fegidere Chineke ruo mgbe ahụ e gburu ha, ọtụtụ ndị nke a na-egbughị ka jikwa obi ụtọ na-efe Chineke. Otu ihe nyeere ha aka bụ na ha ghọtara ihe mere Chineke ji gbagodị nkịtị ka ihe ọjọọ na-eme, nakwa otú ọ ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile kwụsị n’ọdịnihu.