Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee, Chineke ga-agbaghara gị ma i mee ihe ndị i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru na Chineke ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’ nakwa na ọ ‘ga-agbaghara anyị mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’ (Nehemaya 9:17; Abụ Ọma 86:5; Aịzaya 55:7) Ọ na-agbaghara mmehie anyị kpamkpam. Ọ na-ehichapụ mmehie anyị. (Ọrụ Ndịozi 3:19) Chineke agaghịkwa echeta mmehie anyị n’ihi na o kwuru, sị: “Agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jeremaya 31:34) Ọ gbaghara anyị, ọ naghịzi echeta mmehie anyị mere n’oge gara aga ka o nwee ike ịta anyị ahụhụ ugboro ugboro ma ọ bụ kwuo na anyị bụ ndị ọjọọ.

Ma, ihe mere Chineke ji agbaghara anyị abụghị maka na Chineke adịghị ike ma ọ bụ na ọ na-ele anyị anya n’ihu. Ọ naghị agbanwe iwu ya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị agbaghara ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-emejọ.Jọshụa 24:19, 20.

Ihe ị ga-eme ka Chineke gbaghara gị

  1. Kweta na i mehiere megide Chineke. N’agbanyeghị na e nwere ike inwe ndị ihe i mere na-ewute, i kwesịrị ibu ụzọ ghọta na onye ọ bụla mehiere bụ Chineke ka o mejọrọ.Abụ Ọma 51:1, 4; Ọrụ Ndịozi 24:16.

  2. Kwupụtara Chineke mmehie gị n’ekpere.Abụ Ọma 32:5; 1 Jọn 1:9.

  3. Ihe i mere kwesịrị iwute gị nke ukwuu. Ọ bụrụ na mmadụ enwee “mwute dị ka uche Chineke si dị,” ọ ga-eme ka onye ahụ chegharịa. (2 Ndị Kọrịnt 7:10) Ọ pụtakwara ịkwa ụta banyere ihe mere i ji mee mmehie ahụ.Matiu 5:27, 28.

  4. ‘Chigharịa,’ ya bụ, gbanwee otú i si akpa àgwà. (Ọrụ Ndịozi 3:19) O nwere ike ịpụta ịkwụsị ihe ọjọọ ahụ ị na-eme ma ọ bụkwanụ ịgbanwe otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà.Ndị Efesọs 4:23, 24.

  5. Gbaa mbọ mezie ihe ị na-emetaghị. (Matiu 5:23, 24; 2 Ndị Kọrịnt 7:11) Rịọ ndị i mejọrọ ma ọ bụ ndị ihe i mere wutere mgbaghara, gbalịakwa mezie ihe ndị i nwere ike imezi.Luk 19:7-10.

  6. Rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị n’ihi àjà Jizọs chụrụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ị chọọ ka Chineke za ekpere gị, i kwesịrị ịgbaghara ndị mejọrọ gị.Matiu 6:14, 15.

  7. Ọ bụrụ na i mere mmehie dị́ oké njọ, gwa ya onye ruru eru ga-eji Baịbụl nyere gị aka, onye rukwara eru ikpere gị ekpere.Jems 5:14-16.

Ihe na-abụghị eziokwu ụfọdụ na-eche banyere otú Chineke si agbaghara mmehie

“Mmehie m karịrị akarị, Chineke agaghị agbaghara m.”

Chineke gbaghaara Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ

Ọ bụrụhaala na anyị emee ihe Baịbụl kwuru ka anyị mee ma anyị mehie, Chineke ga-agbaghara anyị n’ihi na e nweghị mmehie ọ na-agaghị agbagharali. Ọ ga-agbagharali mmehie ndị dị oké njọ nakwa ndị e mere ugboro ugboro.Ilu 24:16; Aịzaya 1:18.

Dị ka ihe atụ, Chineke gbaghaara Eze Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ. (2 Samuel 12:7-13) Pọl onyeozi chere na ọ bụ ya kacha bụrụ onye mmehie, ma a gbaghaara ya. (1 Timoti 1:15, 16) Chineke tara ndị Juu ụta na ọ bụ ha gburu Jizọs, bụ́ Mesaya. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ha chegharịa, a ga-agbaghara ha.Ọrụ Ndịozi 3:15, 19.

“Ọ bụrụ na m kwupụtara ụkọchukwu ma ọ bụ onye ozi Chineke mmehie m, a kagbuola mmehie m.”

E nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịgbaghara mmadụ ibe ya mmehie o mere megide Chineke. N’agbanyeghị na ịgwa onye ọzọ ihe anyị mejọrọ nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị mehiere, ọ bụ naanị Chineke na-agbaghara mmehie.Ndị Efesọs 4:32; 1 Jọn 1:7, 9.

Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị ọ bụla mmehie ha, a gbagharawo ha mmehie ndị ahụ; ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmehie nke ndị ọ bụla, a gbagharaghị ha”? (Jọn 20:23) Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya bụ ike ọ ga-enye ndịozi ya mgbe ọ ga-enye ha mmụọ nsọ.Jọn 20:22.

Dị ka o kwere ha ná nkwa, o nyere ndịozi ya onyinye a mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 2:1-4) Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji nwee ike ikpe Ananayas na Safaịra ikpe. Chineke mere ka Pita mata na ihe ha kwuru abụghị eziokwu, ikpe ọ mara ha gosikwara na a gaghị agbaghara ha mmehie ha.Ọrụ Ndịozi 5:1-11.

Onyinye ahụ nakwa onyinye ndị ọzọ e si n’ike mmụọ nsọ nye ha, dị ka, ịgwọ ọrịa na ịsụ asụsụ ọzọ, kwụsịrị mgbe ndịozi Jizọs nwụchara. (1 Ndị Kọrịnt 13:8-10) N’ihi ya, e nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịkagbu mmehie mmadụ ibe ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Uru Ekpere Ga-abara Gị

Olee uru ikpe ekpere mgbe niile ga-abara gị?

Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

Chọpụta ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile, otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere, na ihe anyị ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso.