Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?

Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Babịlọn Ukwu ahụ a kọwara n’akwụkwọ Mkpughe bụ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, bụ́ ndị Chineke na-anaghị anabata ofufe ha. * (Mkpughe 14:8; 17:5; 18:21) N’agbanyeghị na e nwere otú okpukpe ndị ahụ si dị́ iche n’ibe ha, ha niile anaghị enyere ndị mmadụ aka ife ezi Chineke, bụ́ Jehova.Diuterọnọmi 4:35.

Ihe ụfọdụ ị ga-eji amata Babịlọn Ukwu ahụ

  1. Babịlọn Ukwu ahụ nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Baịbụl kpọrọ ya “nwaanyị,” kpọọkwa ya “oké nwaanyị akwụna.” O kwukwara na o nwere aha nke bụ́ “ihe omimi: ‘Babịlọn Ukwu ahụ.’” (Mkpughe 17:1, 3, 5) Ihe dị́ n’akwụkwọ Mkpughe bụ ihe e gosiri Jọn Onyeozi “n’ụzọ ihe atụ.” N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na Babịlọn Ukwu ahụ abụghị nwaanyị nkịtị, kama o nwere ihe ọ nọchiri anya ya. (Mkpughe 1:1) Ihe ọzọ bụ na ọ “nọ n’elu ọtụtụ mmiri” nke nọchiri anya “ndị dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche.” (Mkpughe 17:1, 15) Nwaanyị nkịtị agaghị emeli ihe ahụ.

  2. Babịlọn Ukwu ahụ nọchiri anya ihe zuru ụwa ọnụ. A kpọrọ ya “obodo ukwu ahụ nke nwere alaeze na-achị ndị eze nke ụwa.” (Mkpughe 17:18) N’ihi ya, o zuru ụwa ọnụ. E nweghịkwa ebe ike ya na-erughị.

  3. Babịlọn Ukwu ahụ bụ òtù okpukpe, ọ bụghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ òtù azụmahịa. Na Babịlọn oge ochie, e nwere ọtụtụ chi ndị mmadụ na-efe. Ihe e ji mara obodo ahụ bụ ‘ịgwọ ọgwụ’ na ‘ịgba afa.’ (Aịzaya 47:1, 12, 13; Jeremaya 50:1, 2, 38) N’eziokwu, ha na-ekpe okpukpe ụgha, bụ́ ihe ezi Chineke, bụ́ Jehova, kpọrọ asị. (Jenesis 10:8, 9; 11:2-4, 8) Ndị ọchịchị Babịlọn dị mpako ma bulie onwe ha elu karịa Jehova na ofufe ya. (Aịzaya 14:4, 13, 14; Daniel 5:2-4, 23) Otú ahụ ka ọ dị Babịlọn Ukwu ahụ. E ji ‘mgbaasị ọ na-eme’ mara ya. Ihe a gosiri na ọ bụ òtù okpukpe.Mkpughe 18:23.

    Babịlọn Ukwu ahụ abụghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na “ndị eze ụwa” ga-akwara ya ákwá mgbe a ga-ebibi ya. (Mkpughe 17:1, 2; 18:9) Ọ bụghịkwa òtù azụmahịa n’ihi na Baịbụl gosiri na ọ dị iche ná “ndị ahịa nke ụwa.”Mkpughe 18:11, 15.

  4. Ebe a kpụrụ Eze Babịlọn aha ya bụ Nabonaịdọs na chi atọ bụ́ Sin, Ishta na Shamash

    Ihe Babịlọn Ukwu ahụ na-eme na-egosi na ọ bụ okpukpe ụgha. Okpukpe ụgha anaghị akụziri ndị mmadụ otú ha ga-esi bịaruo ezi Chineke bụ́ Jehova nso, kama ha na-eme ka ha fewe chi ọzọ. Baịbụl kpọrọ ihe a ha na-eme “mmekọahụ rụrụ arụ.” (Levitikọs 20:6; Ọpụpụ 34:15, 16) Ozizi Atọ n’Ime Otu, ozizi mkpụrụ anaghị anwụ anwụ, nakwa iji ihe onyinyo efe ofufe malitere na Babịlọn oge ochie. Ọ bụkwa ihe okpukpe ụgha na-akụzi taa. Okpukpe ndị a na-eme ka ndị na-ekpe ha na-ahụ ụwa n’anya. N’ihi otú ha na ụwa si emekọ ihe, Baịbụl kpọrọ ha ndị na-akwa iko.Jems 4:4.

    Akụnụba okpukpe ụgha nwere na otú ha si eme okomoko dabara n’ihe Baịbụl kwuru banyere Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ onye “yi ákwà odo odo na ákwà uhie uhie,” jirikwa “ọlaedo na nkume dị oké ọnụ ahịa na nkume pel chọọ onwe ya mma.” (Mkpughe 17:4) Ọ bụ Babịlọn Ukwu ahụ bụ isi nke “ihe arụ nke ụwa” ma ọ bụ ozizi na omume ndị na-eme ka a ghara ịna-akwanyere Chineke ùgwù. (Mkpughe 17:5) Ọ bụ ndị nọ n’okpukpe ụgha bụ “ndị dị iche iche na ìgwè mmadụ na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche” na-akwado Babịlọn Ukwu ahụ.Mkpughe 17:15.

Aka Babịlọn Ukwu ahụ dị n’ọnwụ “ndị niile e gburu n’ụwa.” (Mkpughe 18:24) Kemgbe ụwa, ọ bụ okpukpe ụgha na-akpata agha nakwa arụrụ ala ndị ọzọ ndị mmadụ na-arụ. Ha anaghịkwa akụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova, bụ́ Chineke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ihe ha na-eme emeela ka a kwafuo ọtụtụ ọbara. N’ihi ya, ndị chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma kwesịrị ‘isi n’ime ya pụta,’ ya bụ, wepụ aka n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha.Mkpughe 18:4; 2 Ndị Kọrịnt 6:14-17.

^ para. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Achọta Ezigbo Okpukpe?”

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Ma ị̀ gụrụ akwụkwọ ma ị́ gụghị, ị ga-aghọtali ihe Chineke na-agwa anyị n’Akwụkwọ Nsọ.