Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?

Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?

Ihe Baịbụl Kwuru

Ọtụtụ ndị chọọchị na-ekwu na e nwere pesịn atọ dị n’otu Chukwu. Ma, otu akwụkwọ ọkọwa okwu a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na o nweghị ebe e dere atọ n’ime otu ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri ya n’Agba Ọhụrụ. Kama na ọ bụ ndị mmadụ ji aka ha wepụta ozizi Atọ n’Ime Otu ọtụtụ afọ gara aga.

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru na e nwere pesịn atọ dị n’ime otu Chukwu. Kama, lee ihe Baịbụl kwuru:

Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—Diuterọnọmi 6:4.

Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Chineke bụ naanị otu.”—Ndị Galeshia 3:20.

Olee ihe mere ọtụtụ ndị chọọchị ji ekwu na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu?

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Ozizi Atọ n’Ime Otu Si Bido?

O nweghị ebe Baịbụl kwuru na e nwere pesịn atọ dị n’otu Chukwu. Gịnị mere Baịbụl ekwughị ụdị ihe ahụ?