Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa nke E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?

Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Nwere Isi Asaa nke E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 13?

Ihe Baịbụl kwuru

Anụ ọhịa nwere isi asaa nke e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị niile e nwere n’ụwa.

  • O nwere ikike, nwee ocheeze, na-akpakwa ike. Nke a gosiri na ọ na-achị achị.Mkpughe 13:2.

  • Ọ na-achị “ebo niile na ndị niile na asụsụ niile na mba niile.” N’ihi ya, ọ karịrị otu ọchịchị na-achị obodo.Mkpughe 13:7.

  • O nwere ihe niile anụ ọhịa anọ e kwuru okwu ha na Daniel 7:2-8 nwere, ma ihu agụ owuru, ụkwụ anụ ọhịa bea, ọnụ ọdụm, ma mpi iri. Anụ ọhịa ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amụma Daniel pụtara ndị eze dị́ iche iche ma ọ bụ alaeze dị́ iche iche, ndị ga-achị ma ibe ha chịchaa. (Daniel 7:17, 23) N’ihi ya, anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 nọchiri anya ọchịchị niile.

  • O si “n’oké osimiri” pụta. Ọ pụtara na ọ bụ n’etiti ụmụ mmadụ ndị na-anaghị erubere Chineke isi, ndị nọ́ n’ọgba aghara, ka e si enweta ndị ọchịchị ụmụ mmadụ.Mkpughe 13:1; Aịzaya 17:12, 13.

  • Baịbụl kwuru na aha anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba ya bụ 666, kwuokwa na ọ bụ “nọmba nke mmadụ.” (Mkpughe 13:17, 18) Ihe a a kpọrọ ya gosiri na anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 gbasara ụmụ mmadụ, ọ bụghị ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ mmụọ a na-anaghị ahụ anya.

Ọ bụ eziokwu na mba dị́ iche iche anaghị ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe, ma ha niile kwekọrịtara na ha ga na-achị achị kama ikwe ka Alaeze Chineke chịwa ha. (Abụ Ọma 2:2) Ha niile ga-ejikọta aka lụso Jizọs Kraịst na ndị mmụọ ozi Chineke agha n’Amagedọn. Ma, a ga-ebibi ha niile n’agha ahụ.Mkpughe 16:14, 16; 19:19, 20.

“Mpi iri na isi asaa”

Ọnụ ọgụgụ ụfọdụ e dere na Baịbụl nwere ihe ha nọchiri anya ha. Dị ka ihe atụ, asaa na iri pụtara ihe zuru ezu. Gịnị ga-enyere anyị aka ịghọta ihe “mpi iri na isi asaa” nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi 13 pụtara? Ọ bụ anụ ọhịa ọzọ na-acha uhie uhie nke nwere isi asaa na mpi iri. Mkpughe isi 17 kpọrọ ya “onyinyo nke anụ ọhịa ahụ.” (Mkpughe 13:1, 14, 15; 17:3) Baịbụl kwuru na isi asaa nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie pụtara “ndị eze asaa,” ma ọ bụ ọchịchị dị́ iche iche.Mkpughe 17:9, 10.

N’ihi ya, isi asaa nke anụ ọhịa ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 13:1 nọchiri anya ọchịchị asaa a ma ama ndị kpara ike n’ụwa, bụ́ ndị kpagbukwara ndị Chineke. Ha bụ ọchịchị Ijipt, Asiria, Babịlọn, Midia na Peshia, Gris, Rom, na Briten na Amerịka. Ọ bụrụ na mpi iri ahụ nọchiri anya mba niile na-achị onwe ha, ma ndị ukwu ma ndị nta, okpueze iri ahụ na-egosi na ọ bụ n’otu oge ahụ ọchịchị ndị ahụ na-akpa ike n’ụwa chịrị ka mba ndị ahụ na-achị onwe ha na-achịkwa.