Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu Grik e si na ya nweta aha akwụkwọ Baịbụl a a na-akpọ Mkpughe bụ A·po·kaʹly·psis (apọkalips). Ihe ọ pụtara bụ “Imeghe” ma ọ bụ “Ikpughe.” Aha akwụkwọ a gosiri na o meghere ihe ndị e zochiri ezochi, kpugheekwa ihe ndị ga-emenụ ọtụtụ afọ e dechara akwụkwọ a. Ọtụtụ amụma ndị e dere na ya emezubeghị.

Isi ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe

  • Okwu mmalite.Mkpughe 1:1-9.

  • Ozi Jizọs zigaara ọgbakọ asaa.Mkpughe 1:10-3:22.

  • Ọhụụ Jọn hụrụ ka Chineke nọ n’ocheeze ya n’eluigwe.Mkpughe 4:1-11.

  • Ọhụụ dị́ iche iche Jọn hụrụ, ya hụchaa otu, ọzọ esochie:

    • Ihe asaa a kara akara.Mkpughe 5:1-8:6.

    • Opi asaa, atọ ndị nke ikpeazụ n’ime ha kpatara ahụhụ.Mkpughe 8:7-14:20.

    • Efere asaa. Ihe dị́ n’ime nke ọ bụla n’ime ha bụ ihe otiti, ya bụ, ikpe Chineke nke a ga-awụpụ n’ime ụwa.Mkpughe 15:1-16:21.

    • Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara mbibi ndị iro Chineke.Mkpughe 17:1-20:10.

    • Ọhụụ ndị Jọn hụrụ gbasara otú Chineke ga-esi agọzi eluigwe na ụwa.Mkpughe 20:11-22:5.

  • Okwu mmechi.Mkpughe 22:6-21.

Ihe ndị ga-enyere mmadụ aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe

  1. Ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe bara uru, ọ bụghị ihe na-emenye ndị na-efe Chineke egwu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị na-ekwu na “apọkalips” pụtara oké ọdachi, ma ihe e kwuru ná mmalite akwụkwọ Mkpughe nakwa ná ngwụcha ya bụ na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.Mkpughe 1:3; 22:7.

  2. E nwere ọtụtụ “ihe atụ” ma ọ bụ ihe nnọchianya n’akwụkwọ Mkpughe. E kwesịkwara ịghọta ha ka ihe atụ.Mkpughe 1:1.

  3. E nweela ebe ndị ọzọ na Baịbụl e bu ụzọ dee gbasara ọtụtụ ndị e kwuru okwu ha n’akwụkwọ Mkpughe nakwa ọtụtụ ihe atụ e dere na ya:

  4. Ọhụụ ndị ahụ bụ maka ‘ụbọchị Onyenwe anyị,’ nke malitere mgbe Alaeze Chineke bidoro n’afọ 1914, Jizọs amalitekwa ịchị. (Mkpughe 1:10) Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịtụ anya na ihe ndị e dere n’akwụkwọ Mkpughe ga-akacha emezu n’oge anyị a.

  5. Ihe ndị ga-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Mkpughe bụkwa ihe ndị na-enyere anyị aka ịghọta akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ, ya bụ, amamihe sí n’aka Chineke na aka ndị ghọtarala ihe Baịbụl na-ekwu ga-enyere anyị.Ọrụ Ndịozi 8:26-39; Jems 1:5.

GỤKWUO GBASARA YA

Ì Kwesịrị Ịtụ Ọgwụgwụ Ụwa Egwu?

Ihe Baịbụl kwuru banyere ọgwụgwụ ụwa nwere ike iju gị anya.

Olee Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Ị Na-agụ na Baịbụl?

Ma ị̀ gụrụ akwụkwọ ma ị́ gụghị, ị ga-aghọtali ihe Chineke na-agwa anyị n’Akwụkwọ Nsọ.