Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”?

Olee Otú Àjà Jizọs Chụrụ Si Bụrụ “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”?

Ihe Baịbụl kwuru

Àjà Jizọs chụrụ bụ ihe Chineke ji anapụta ma ọ bụ azọpụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ. Baịbụl kpọrọ ọbara Jizọs ji chụọ àjà ihe mgbapụta. (Ndị Efesọs 1:7; 1 Pita 1:18, 19) N’ihi ya, Jizọs kwuru na ya bịara ka ‘o were ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’Matiu 20:28, Bible Nsọ nke Union Version.

Gịnị mere o ji dị mkpa ka a gbapụta anyị?

Nwoke mbụ, bụ́ Adam, zuru okè mgbe e kere ya. Ọ gaara adị ndụ ebighị ebi ma a sị na o nupụrụghị Chineke isi. (Jenesis 3:17-19) Mgbe ọ mụtara ụmụ, o bufere ha mmehie. (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na Adam “rere” ma onwe ya ma ụmụ ya ka ha bụrụ ohu mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 7:14) Ebe ọ bụ na ha ezughị okè, e nweghị onye n’ime ha ga-akwụli ụgwọ a ga-eji nwetaghachi ndụ zuru okè ahụ Adam tụfuru.Abụ Ọma 49:7, 8.

Chineke nweere ụmụ Adam ọmịiko n’ihi na ha enweghị olileanya ọ bụla. (Jọn 3:16) Ma, ebe ọ bụ na Chineke na-ekpe ikpe ziri, ọ gaghị eleghara mmehie ha anya ma ọ bụ gbaghara ha n’enweghị ezigbo ihe mere ọ ga-eji gbaghara ha. (Abụ Ọma 89:14; Ndị Rom 3:23-26) Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, n’ihi ya, o wetara ihe ruru eru a ga-eji gbaghara ha mmehie ha, nke ga-emekwa ka ha pụọ n’aka mmehie kpamkpam. (Ndị Rom 5:6-8) Ọ bụ ihe mgbapụta bụ ihe ahụ ruru eru a ga-eji maka ya gbaghara ụmụ mmadụ.

Gịnị ka ihe mgbapụta ahụ pụtara?

Na Baịbụl, okwu ahụ bụ́ “ihe mgbapụta” pụtara ihe atọ ndị a:

  1. Ụgwọ a na-akwụ akwụ.Ọnụ Ọgụgụ 3:46, 47.

  2. Ihe e ji agbapụta ihe ma ọ bụ atọhapụ ihe.Ọpụpụ 21:30.

  3. Ya na ihe e ji ya akwụ ụgwọ ya na-aha nhata. *

Legodị otú àjà mgbapụta Jizọs Kraịst chụrụ si mezuo ihe atọ a.

  1. Ụgwọ a na-akwụ akwụ. Baịbụl kwuru na “e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta” Ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrịnt 6:20; 7:23) Ihe ahụ e ji zụta ha bụ ọbara Jizọs, nke o ji “zụtara Chineke ndị mmadụ si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile.”Mkpughe 5:8, 9.

  2. Iji gbapụta ihe. Àjà Jizọs chụrụ bụ ‘ihe mgbaputa tọhapụrụ’ anyị ná mmehie.1 Ndị Kọrịnt 1:30; Ndị Kọlọsi 1:14; Ndị Hibru 9:15.

  3. Ịha nhata. Àjà Jizọs chụrụ na ihe Adam tụfuru hà, ya bụ, ndụ zuru okè. (1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22, 45, 46) Baịbụl kwuru, sị: “N’ihi na ebe ọ bụ na e mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye ahụ [Adam], otú ahụkwa ka a ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ [Jizọs Kraịst].” (Ndị Rom 5:19) Ihe a gosiri otú ọnwụ otu onye ga-esi gbapụta ọtụtụ ndị n’aka mmehie. N’eziokwu, àjà Jizọs chụrụ bụ nnọọ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile,” bụ́ ndị na-eme ihe ha kwesịrị ime iji rite uru na ya.1 Timoti 2:5, 6.

^ para. 11 Na Baịbụl, okwu e si sụgharịta “ihe mgbapụta” pụtara ụgwọ ma ọ bụ ego a kwụrụ maka ihe. Dị ka ihe atụ, okwu Hibru bụ́ ka·pharʹ pụtara “ikpuchi ihe.” Ọ na-apụtakarị ikpuchi mmehie. (Abụ Ọma 65:3) Okwu yiri ya bụ́ koʹpher pụtara ego a kwụrụ iji kpuchie ihe ma ọ bụ gbapụta ihe. (Ọpụpụ 21:30) Okwu Grik bụ́ lyʹtron, nke e si sụgharịta “ihe mgbapụta,” nwere ike ịpụta “ego e ji gbapụta ihe.” (Matiu 20:28; The New Testament in Modern Speech, nke R. F. Weymouth dere) Ndị na-ede akwụkwọ n’asụsụ Grik na-asụgharị ya ụgwọ a kwụrụ iji tọhapụ onye a kpụụrụ n’agha ma ọ bụ iji tọhapụ ohu.