Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Aha Ole Ka Chineke Nwere?

Aha Ole Ka Chineke Nwere?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke nwere naanị otu aha. Otú e si ede ya n’asụsụ Hibru bụ יהוה ma a na-akpọ ya “Jehova” n’asụsụ Igbo. * Chineke si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya kwuo, sị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” (Aịzaya 42:8) Aha ahụ bụ́ Jehova gbara ihe dị ka ugboro puku asaa na Baịbụl ndị e ji aka dee n’oge ochie. Ọ karịrị ugboro ole aha ndị ọzọ a na-etu ya gbara na Baịbụl, karịakwa ugboro ole aha onye ọ bụla ọzọ gbara na Baịbụl. *

Chineke ò nwere aha ndị ọzọ?

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na Chineke nwere naanị otu aha, ma e nwere ọtụtụ aha a na-etu ya. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ aha ndị e turu Chineke na ihe nke ọ bụla n’ime ha na-akụziri anyị gbasara ya.

Utu aha

Ebe ọ dị na Baịbụl

Ihe ọ pụtara

Allah

(E nweghị ebe o dị na Baịbụl)

E si n’asụsụ Arabik nweta ya. “Allah” abụghị ezigbo aha Chineke, kama ọ bụ utu aha ya nke pụtara “Chineke.” Ndị sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Arabik nakwa n’asụsụ ndị ọzọ ji “Allah” dochie anya “Chineke” n’ebe ndị ọ gbara na Baịbụl ha.

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile

Jenesis 17:1

O nwere ike na-enweghị atụ. Okwu Hibru bụ́ ʼEl Shad·daiʹ, ma ọ bụ “Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” gbara ugboro asaa na Baịbụl.

Alfa na Omega

Mkpughe 1:8; 21:6; 22:13

“Onye mbụ na onye ikpeazụ,” ma ọ bụ “mmalite na ọgwụgwụ,” pụtara na e nweghị Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ọzọ bu Jehova ụzọ, e nweghịkwa Chi ọzọ ga-esochi ya. (Aịzaya 43:10) Alfa na Omega bụ mkpụrụ akwụkwọ mbụ na mkpụrụ akwụkwọ ikpeazụ n’asụsụ Grik.

Onye Ochie Ahụ

Daniel 7:​9, 13, 22

O nweghị mmalite; ọ dị adị site n’ebighị ebi ruo n’ebighị ebi, tupu onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla amalite ịdị.​—Abụ Ọma 90:2.

Onye Kere Ihe Niile

Aịzaya 40:28

Ọ bụ ya mere ka ihe niile malite ịdị.

Nna

Matiu 6:9

Ọ bụ Onye na-enye ndụ.

Chineke

Jenesis 1:1

Onye dị ike a na-efe ofufe. Okwu Hibru bụ́ ʼElo·himʹ na-egosi na Jehova dị ebube, dị ùgwù, o nweghịkwa o yiri.

Chi kasị chi niile

Diuterọnọmi 10:17

Ọ bụ Chi kasị elu ma e were ya tụnyere ‘chi ndị na-abaghị uru’ ụfọdụ ndị na-efe.​—Aịzaya 2:8.

Onye Ozizi Ukwu

Aịzaya 30:20, 21

Ọ na-akụzi ihe ndị bara ezigbo uru. Na-enyekwa ntụziaka.​—Aịzaya 48:17, 18.

Onye Ukwu kere ihe

Abụ Ọma 149:2

Ọ bụ ya mere ka ihe niile dịrị.​—Mkpughe 4:​11.

Chineke bụ́ onye obi ụtọ

1 Timoti 1:​11

Ọ bụ ọṅụ na obi ụtọ ka e ji mara ya.​—Abụ Ọma 104:31.

Onye na-anụ ekpere

Abụ Ọma 65:2

Ọ bụ ya na-anụ ekpere ọ bụla e ji okwukwe kpeere ya.

Abụ M Ihe M Bụ

Ọpụpụ 3:​14, Bible Nsọ nke Union Version

Ọ na-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ iji mezuo nzube ya. Otú ọzọ e si sụgharịa okwu ahụ bụ “M Ga-abụ ihe ọ bụla dị m mma” ma ọ bụkwanụ “M Ga-abụ Ihe M Chọrọ Ịbụ.” (The Emphasised Bible, nke J. B. Rotherham sụgharịrị; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ) Ihe a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe aha Jehova e kwuru okwu ya n’amaokwu na-esonụ pụtara.​—Ọpụpụ 3:​15.

Ekworo

Diuterọnọmi 5:9, Bible Nsọ nke Union Version

Ọ naghị achọ ka a na-efe ya na chi ọzọ. Otú ọzọ e si sụgharịa ya bụ ‘Chineke nke anaghị ekwe ka ya na chi ọbụla ọzọ tụọ aka’ na “Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.”​—Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Eze mgbe ebighị ebi

Mkpughe 15:3

Ihe niile e kere eke nọ n’okpuru, ha ga-anọkwa n’okpuru ya ruo mgbe ebighị ebi.

Onyenwe anyị

Abụ Ọma 135:5

Onye nwe ma ọ bụ nna ukwu; otú e si dee ya na Hibru bụ ʼA·dhohnʹ na ʼAdho·nimʹ.

Onye nwe ụsụụ niile nke ndị agha

Ndị Rom 9:​29, Bible Nsọ nke Union Version

Ọchịagha nke ìgwè ndi mmụọ ozi. Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa utu ahụ bụ́ “Onye nwe ụsụụ niile nke ndị agha” bụ “Jehova nke ụsụụ ndị agha.”​—Ndị Rom 9:29, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Onye Kasị Elu

Abụ Ọma 47:2; Daniel 7:​18, 27

E nweghị onye ya na ya ha. Ọ bụ ya kacha ihe niile elu.

Onye Kasị Nsọ

Ilu 9:​10

Ọ dị nsọ, dịkwa ọcha karịa onye ọ bụla.

Onye kpụrụ anyị

Aịzaya 64:8

Ọ ka onye ọ bụla na mba ọ bụla ike, otú ahụ onye na-akpụ ihe na-aka ájá o ji akpụ ihe ike.​—Ndị Rom 9:​20, 21.

Onye Mgbapụta

Aịzaya 41:14; Bible Nsọ nke Union Version

Onye ji àjà Jizọs chụrụ napụta ma ọ bụ zụtaghachi anyị n’aka mmehie na ọnwụ.​—Jọn 3:​16.

Oké nkume

Abụ Ọma 18:2, 46

Ebe dị elu e wusịrị ike na onye nzọpụta.

Onye Nzọpụta

Aịzaya 45:21

Ọ na-anapụta anyị n’ọdachi.

Onye Ọzụzụ Atụrụ

Abụ Ọma 23:1

Ọ na-elekọta ndị na-efe ya.

Ọkaakaa Onyenwe anyị

Jenesis 15:2

Ọ kacha ihe niile ike; Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ʼAdho·naiʹ.

Aha ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru

Aha Chineke dị n’aha ebe ụfọdụ a kpọrọ aha na Baịbụl, ma ọ pụtaghị na aha ebe ndị a bụ aha ọzọ Chineke nwere.

Aha ebe

Ebe ọ dị na Baịbụl

Ihe ọ pụtara

Jehova-jaịre

Jenesis 22:13, 14

“Jehova Ga-egbo Mkpa.”

Jehova-nisaị

Ọpụpụ 17:15

“Jehova Bụ Ebe Mgbaba M,” ma ọ bụ “ọkọlọtọ m.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Jehova bụ onye ndị na-efe ya nwere ike ịgbakwuru, ya echebe ha ma nyere ha aka.​—Ọpụpụ 17:13-​16.

Jehova-shelọm

Judges 6:​23, 24

“Jehova Bụ Udo.”

Ihe mere anyị ji kwesị ịma aha Chineke ma na-akpọ ya aha ahụ

  • Ọ ga-abụrịrị na Chineke ejighị aha ya bụ́ Jehova egwu egwu mere o ji mee ka e dee ya ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl.​—Malakaị 1:11.

  • Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs, kwuru banyere aha Chineke ọtụtụ ugboro, si otú ahụ gosi na aha Chineke dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, o kpeere Jehova ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.”​—Matiu 6:9; Jọn 17:6.

  • Ọ bụ mmadụ ịmata aha Chineke ma na-akpọ ya aha ahụ bụ ụzọ mbụ onye ahụ ga-esi amalite ịbịaru Jehova nso. (Abụ Ọma 9:10; Malakaị 3:16) Onye ahụ bịaruo Chineke nso, ọ ga-eme ka nkwa a Chineke kwere mezuo n’ahụ́ ya. Ọ sịrị: “N’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu, m ga-emekwara ya ụzọ mgbapụ. M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m.”Abụ Ọma 91:14.

  • Baịbụl kwuru, sị: “E nwere ndị a na-akpọ ‘chi,’ ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, dị nnọọ ka e nwere ọtụtụ “chi” na ọtụtụ ‘ndị nwe mmadụ.’” (1 Ndị Kọrịnt 8:5, 6) Ma, o kwuru hoo haa na e nwere naanị otu ezi Chineke aha ya bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

^ para. 3 Ọ bụ “Yahweh” ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta asụsụ Hibru na-akacha ede ma ha dewe aha Chineke.

^ para. 3 Ndebiri aha Chineke bụ “Jaa.” Ọ gbara ihe dị ka ugboro iri ise na Baịbụl, ma a gụnye ebe ndị ọ gbara na “Haleluya,” ma ọ bụ “Aleluya,” bụ́ nke pụtara “Toonụ Jaa.”​—Mkpughe 19:1; Bible Nsọ nke Union Version; Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Ọtụtụ ndị weere ya na Atọ n’Ime Otu bụ “ozizi dị mkpa n’okpukpe Ndị Kraịst.” Lee ihe Baịbụl kwuru.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Baịbụl Ò Kwuru na Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu?

Ọtụtụ ndị chọọchị na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ihe a ha na-akụzi ò sị na Baịbụl?