Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

Gịnị Bụ Agha Amagedọn?

Ihe Baịbụl Kwuru

Agha Amagedọn bụ agha ikpeazụ a ga-alụ n’ụwa a. Ọ bụ Chineke na ndị ọchịchị ga-alụ ya. Ndị ọchịchị a na ndị na-akwado ha ebidolarị imegide Chineke ugbu a ebe ọ bụ na ha ekweghị anabata ọchịchị ya. (Abụ Ọma 2:2) Ọ bụ agha Amagedọn ka Chineke ga-eji bibie ọchịchị ụmụ mmadụ.Daniel 2:44.

Ọ bụ naanị otu ugbo ka “Amagedọn” gbara na Baịbụl. Ọ gbara ná Mkpughe 16:16. N’akwụkwọ Mkpughe, e buru amụma na a ga-akpọkọta “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” “n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru” “maka ibu agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”Mkpughe 16:14.

Ole ndị ga-alụ agha Amagedọn? Jizọs Kraịst ga-edu ndị agha nọ n’eluigwe bịa bibie ndị iro Chineke. (Mkpughe 19:11-16, 19-21) Ndị na-emegide ọchịchị Chineke na ndị kpọrọ Chineke asị so ná ndị a a ga-ebibi.Ezikiel 39:7.

À ga-alụ agha Amagedọn naanị ná mba Izrel ma ọ bụ n’ebe dị ya nso? Mba. Ọ bụghị naanị n’otu ebe ka a ga-alụ agha Amagedọn. Ọ bụ agha ga-ezu ụwa niile ọnụ.Jeremaya 25:32-34; Ezikiel 39:17-20.

Okwu ahụ bụ́ Amagedọn pụtara “Ugwu Megido.” Otú ọzọ e sikwa ede ya bụ “Ha-Magedọn” (otú e si ede ya n’asụsụ Hibru bụ Har Meghiddohnʹ). Megido bụ obodo dịbu n’ala Izrel. A nọkwa n’ebe ndị dị nso na Megido lụọ ọtụtụ agha ndị e ji mara ndị bụ́ ọkaibe. E dere banyere ụfọdụ agha ndị ahụ na Baịbụl. (Ndị Ikpe 5:19, 20; 2 Ndị Eze 9:27; 23:29) Ma, Amagedọn abụghị ugwu nkịtị dị́ nso na Megido oge ochie. O nweghị nnukwu ugwu dị na Megido, Ndagwurugwu Jezril dị́ nso ebe ahụ agaghịkwa aba ndị niile ga-alụso Chineke agha. N’Amagedọn, mba dị iche iche ga-ezukọta nke ikpeazụ ya imegide ọchịchị Chineke.

Gịnị ka Chineke ga-eji alụ agha Amagedọn? Anyị amachaghị ihe Chineke ga-eji alụ ya. Ma, anyị ma na o nwere ọtụtụ ihe o ji lụọ agha n’oge ochie o nwekwara ike iji lụọ agha a, dị ka, akụ́ mmiri igwe, ala ọma jijiji, oké mmiri ozuzo, ọkụ na sọlfọ, àmụ̀mà, na ọrịa na-efe efe. (Job 38:22, 23; Ezikiel 38:19, 22; Habakọk 3:10, 11; Zekaraya 14:12) Jehova nwekwara ike itinye ụfọdụ ndị iro ya n’ọgba aghara, ha egburịtawa ibe ha. Ma, ha ga-emecha mata na ọ bụ Chineke na-ebuso ha agha.Ezikiel 38:21, 23; Zekaraya 14:13.

Agha Amagedọn ọ̀ ga-eweta ọgwụgwụ ụwa? Ọ gaghị eme ka ụwa anyị a gharazie ịdị n’ihi na Chineke kere ụwa a ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; 96:10; Ekliziastis 1:4) A gaghịkwa ebibi mmadụ niile n’agha Amagedọn. Kama, a ga-eji ya zọpụta ụmụ mmadụ n’ihi na Baịbụl kwuru na a ga-azọpụta “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị ohu Chineke.Mkpughe 7:9, 14; Abụ Ọma 37:34.

N’ebe ụfọdụ e kwuru gbasara “ụwa” na Baịbụl, ihe a na-ekwu bụ ụwa nkịtị. Ma, e nwere ebe ụfọdụ “ụwa” a na-ekwu okwu ya bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. (1 Jọn 2:15-17) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na “ụwa” a na-ekwu okwu ya bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọ dabara adaba ikwu na Amagedọn ga-eweta “ọgwụgwụ ụwa.”Matiu 24:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Olee mgbe a ga-alụ agha Amagedọn? Mgbe Jizọs na-ekwu banyere “oké mkpagbu” nke ga-ebi n’agha Amagedọn, o kwuru, sị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ, ndị mmụọ ozi nke eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama ọ bụ naanị Nna m maara.” (Matiu 24:21, 36) Ma, Baịbụl kwuru ihe gosiri na a ga-alụ agha Amagedọn n’oge ọnụnọ Jizọs. Ọnụnọ Jizọs ebidola kemgbe afọ 1914.Matiu 24:37-39.