Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Ihe Baịbụl kwuru

O nweghị ebe Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị na-eme taa. Otú Baịbụl kwuru Chineke na-esi ata ndị nupuuru ya isi ahụhụ dị iche n’otú ọdachi ndị na-emere onwe ha si eme.

  1. Ọ bụghị onye ọ bụla ka Chineke na-ata ahụhụ. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”—1 Samuel 16:7.

  2. Ebe ọ bụ na Jehova na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi, ọ na-ebibi naanị ndị ọ chọpụtara na ha bụ ndị ajọ mmadụ.—Jenesis 18:23-32.

  3. Chineke na-ebu ụzọ adọ ndị mmadụ aka ná ntị ka ha chegharịa.

Ma ọdachi ndị na-emere onwe ha na-eme na mberede. Ọ na-atakwa isi onye ezi omume na onye ajọ omume. Ndị mmadụ ejirila aka ha mee ka ọdachi ndị a na-akakwu njọ. Ụfọdụ na-aga ewu ụlọ n’ebe ndị ha na-ekwesịghị iwu ụlọ, dị ka n’ebe ala ọma jijiji nwere ike ime ma ọ bụ n’ebe mmiri nwere ike itochi.

GỤKWUO GBASARA YA

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-egosi na Obi Tara Chineke Mmiri?

Ebe ọ bụ na Chineke kpọrọ ihe ọjọọ asị, gịnị mere o ji kwe ka ọdachi ndị na-emere onwe ha na-egbu ndị aka ha dị ọcha?