Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ihe Baịbụl Na-akụzi

Baịbụl ga-enyere mmadụ aka ịgbara nsogbu ọsọ n’ụwa a nsogbu juru. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ mata azịza ajụjụ ndị na-esiri ya ike ịma. Kemgbe ụwa, ihe na-agara ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru nke ọma. N’ebe a, anyị nwere ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka ị mata na Baịbụl bara uru n’oge anyị a.—2 Timoti 3:16, 17.

Isiokwu Ndị Anyị Bipụtarala

Olee ndị bụ ndị mmụọ ozi?

Hà dị ole? Hà nwere aha n’otu n’otu nakwa àgwà e ji mara ha?

Gịnị Mere Chineke Ji Kee Ụwa?

Ụwa anyị a mara ezigbo mma. Chineke mere ka ọ dịrị ebe kwesịrị ekwesị, ka ọ ghara ịdị ezigbo nso ma ọ bụ ezigbo anya n’anyanwụ. Gịnị mere o ji kee ụwa otú a?

Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka

ỤMỤAKA

Jehova Ga-enyere Gị Aka Ịkata Obi

Olee ihe ga-enyere gị aka ịkata obi gwa ndị ọzọ banyere Jehova?

NDỊ DI NA NWUNYE

Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo

Naanị ichebara ajụjụ abụọ dị mkpa echiche ga-enyere gị aka ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ebi n’udo.

NDỊ NNE NA NNA

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.

NDỊ NA-ETO ETO

Olee Ihe M Kwesịrị Ime Ma M Mejọọ Ihe?

Onye ọ bụla na-emejọ ihe, ma ọ bụghị onye ọ bụla na-esi n’ihe o mejọrọ mụta ihe.