Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 3 n'Afọ 2017

 ṄOMIE OKWUKWE HA | SERA

“Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma”

“Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma”

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ Sera ka o guzo n’ime ụlọ ha na-elegharị anya. Ọ mara mma nwaanyị. Ka ị na-ele ya, ihu ya ọ̀ dị ka onye ihe na-ewute? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ezigbo ihe nwere ike ịkpata ya. O nwere ọtụtụ ihe ọ na-agaghị echefu echefu merela n’ụlọ a. Ọ dịla anya ya na Ebreham di ya ọ hụrụ n’anya biwere na ya. * Ha gbara mbọ mee ka obi na-eru ibe ha ala n’ụlọ ha.

Ebreham na Sera bi na Ọọ. Ọtụtụ ndị bi na Ọọ bara ọgaranya. E nwekwara ọtụtụ ndị na-azụ ahịa na ndị ọrụ aka na ya. O doro anya na Ebreham na Sera nwere ọtụtụ ihe n’ụlọ ha. Ma, ụlọ ha abụghị naanị ebe ha na-akwakọba ihe ndị ha nwere, kama, ọ bụ ebe ha na-anọ enwe obi ụtọ ma na-akasikwa ibe ha obi mgbe ha nwere nsogbu. Ha anọọla n’ụlọ a kpeere Jehova, bụ́ Chineke ha ha hụrụ n’anya, ekpere ugboro ugboro. E nwere ọtụtụ ihe mere Sera ejighị ụlọ ha a egwu egwu.

Ma Sera ejikerela ugbu a ịhapụ ihe niile a na-eme ya obi ụtọ kwaga ebe ọ na-amaghị. N’agbanyeghị na ọ dị ihe dị ka afọ iri isii, ọ na-achọ ịgawa ebe ndị ọ na-amaghị. Ọ ga-ebi n’ebe ndị dị ize ndụ, ihe ga-esikwara ya ike. Ọ maghịkwa ma ọ̀ ga-emecha laghachi n’ụlọ ha. Gịnị kpataara ya ụdị mgbanwe a? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’okwukwe Sera?

‘SI N’ALA GỊ KWAPỤ’

Ọ ga-abụ na Sera toro na Ọọ. Ma ebe ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe. Ma n’oge Sera dịrị ndụ, ndị ahịa na-eji ụgbọ mmiri ebubata ngwá ahịa ha n’obodo ahụ. Ha na-esi n’ebe dị iche iche buru ngwá ahịa bịa. Ha na-esi n’Osimiri Yufretis ebubata ngwá ahịa ndị ahụ na Ọọ. Ndị mmadụ na-ekwo ekwo n’okporo ụzọ ya dị rịgọ rịgọ ma dị warara. Ụgbọ mmiri bu ngwá ahịa na-eju eju n’ọdụ ụgbọ mmiri ya. Ahịa ha na-ejukwa eju ná ngwá ahịa. Weregodị ya na ị nọ mgbe Sera na-eto n’obodo a na-ekwo ekwo. O yiri ka ọ̀ ma aha ọtụtụ ndị bi na ya. Ọ ga-abụkwa na ọtụtụ ndị ma ya n’ihi na ọ mara ezigbo mma. O nwekwara ọtụtụ ndị ikwu na ibe n’obodo a.

A ma Sera ama na Baịbụl ka onye nwere ezigbo okwukwe na Chineke, ọ bụghị na chi ọnwa ndị Ọọ na-efe. E nwere nnukwu ogidi a kpụụrụ chi a. Ebe ọ bụla mmadụ nọ na Ọọ, ọ ga na-ahụ ya. Ma Sera na-efe ezi Chineke bụ́ Jehova. Baịbụl agwaghị anyị otú o si malite inwe okwukwe na Chineke. Nna ya fetụrụ arụsị. Sera mechara lụọ Ebreham. Ebreham ji afọ iri tọ ya. * (Jenesis 17:17) E mechara kpọwa Ebreham “nna nke ndị niile nwere okwukwe.” (Ndị Rom 4:11) Ebreham na nwunye ya na-akwanyere ibe ha ùgwù, na-ekwurịtakwa okwu nke ọma. Ha na-ejikwa otu obi emekọ ihe ma ha nwee nsogbu. Ma otu ihe kacha mkpa bụ na ha hụrụ Chineke ha n’anya.

 Sera hụrụ di ya n’anya nke ukwuu, ha abụọ bi n’obodo Ọọ ebe ndị ikwu ha bi. Ma, mgbe obere oge gara, ha nwere nsogbu. Baịbụl gwara anyị na Sera “bụ nwaanyị aga, ọ mụtaghị nwa.” (Jenesis 11:30) Ọ dịghịrị Sera mfe n’ihi na n’oge ahụ, a na-ewere onye na-amụtaghị nwa ka onye ihe ọjọọ mere. Ma, o meghị ka Sera hapụ Chineke ya, ọ hapụghịkwa di ya. Ha weere Lọt, nwa nwanne ha nwụrụ anwụ, ka nwa ha. Ha weere ndụ ha otú ha si hụ ya ruokwa ụbọchị ihe niile gbanwere.

N’ụbọchị ahụ, Ebreham ji obi ụtọ gbara gawa ka ọ gwa Sera ihe Chineke gwara ya. Ọ dị ya ka ọ̀ nọ ná nrọ. Chineke ha zitere mmụọ ozi ya, ya abịa zie ya ozi. Were ya ka ị̀ na-ahụ Sera ka o legidere di ya anya ma jụọ ya, sị: “Gịnị ka ọ gwara gị? Gwanụ m, biko.” Ọ ga-abụ na Ebreham bugodị ụzọ nọdụ ala, ma chee otú ọ ga-esi agwa ya ihe ahụ. Ọ gwaziri ya na Jehova kwuru, sị: “Si n’ala gị, n’etiti ndị ikwu gị, kwapụ gaa n’ala m ga-egosi gị.” (Ọrụ Ndịozi 7:2, 3) Mgbe obi tọchara ha ụtọ maka ozi ahụ, ha echebarazie ihe a gwara ha echiche. Ọ pụtara na ha ga-ahapụ ebe ahụ ha bi ahụ́ ruru ha ala ma malite ịna-akwagharị akwagharị. Olee ihe Sera ga-eme ugbu a? Ebreham nọ na-ele ya ka ọ mara ihe ọ ga-eme. Ọ̀ ga-eji obi ya niile kweta iso ya?

O nwere ike anyị agaghị aghọtacha ihe ya na Sera na-alụ. Anyị nwere ike iche sị, ‘Chineke agwatụbeghị m mee ụdị ihe a. Ọ gwatụbeghịkwa di m ma ọ bụ nwunye m mee ya.’ Ma, ọ̀ bụ na e nweghị mgbe a na-achọ ka anyị mee ụdị mkpebi a? Anyị bi n’ụwa ebe ọtụtụ ndị na-achụ ego ọnwụ ọnwụ. A na-achọ ka anyị buru ụzọ kpata ego ma nwee ọtụtụ ihe ga-eme ka ahụ́ ruo anyị ala. Ma, Baịbụl chọrọ ka anyị mee ihe dị iche. Ọ chọrọ ka anyị bute ife Chineke ụzọ. (Matiu 6:33) Ka anyị na-eche banyere ihe Sera mere, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe m ga-ebute ụzọ ná ndụ m?’

HA ‘SI N’ALA AHỤ KWAPỤ’

Ka Sera na-akwakọta ihe ya, o siiri ya ike ịma nke ọ ga-ahapụ na nke ọ ga-ebu apụ. O nwere ike ịhapụ ihe ọ bụla ịnyịnya ibu na-agaghị ebuli na ihe ndị na-enweghị uru ọ ga-abara ha. O doro anya na e nwere ihe ụfọdụ ha ga-achọ ire ma ọ bụ nye ndị mmadụ. Ha ga-ahapụkwa ahịa ha na-aga azụ ihe ndị dị ka nri, anụ, mkpụrụ osisi, uwe na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.

Okwukwe Sera mere ka o kweta iso di ya hapụ ebe a ha bi ahụ́ ruru ya ala

Ọ ga-abụ na ihe kacha siere Sera ike bụ ịhapụ ụlọ ha. Ihe ndị e gwupụtarala n’ala n’obodo Ọọ gosiri na ụlọ ndị dị na ya na-ama ezigbo mma, nweekwa ihe niile mmadụ chọrọ n’ụlọ. Ọ bụrụ na ụlọ Sera hà dị otú ahụ, ọ pụtara na ihe ọ ga-ahapụ abụghị obere ihe. Ụfọdụ ụlọ ndị ahụ nwere ihe karịrị ọnụ ụlọ iri na abụọ, ebe e si agbata mmiri ọṅụṅụ, nakwa ebe mmiri na-adịghị ọcha na-esi agbapụ. A na-akụdị ụlọ ndị a ga-asị na ha enwezughị ihe  ndị a ezigbo gbamgbam, mgbidi ha na-esikwa ike, ha na-enwekwa ibo ndị siri ike a na-agbachi agbachi. Ma, ebe ha na-aga ibi ugbu a bụ ụlọ ntu, o nweghịkwa ihe ndị a. N’ihi ya, ndị ohi nwere ike ịbịa zuo ha ohi. Ọdụm, agụ owuru, anụ ọhịa bea, na nkịta ọhịa nwekwara ike ịna-enye ha nsogbu ebe ọ bụ na ha juru eju n’obodo ndị ha na-aga ibi.

Sera na-agakwa ịhapụ ndị ikwu ya. Chineke gwara ha ka ha ‘si n’ala ha, n’etiti ndị ikwu ha, kwapụ.’ Ọ ga-abụ na ihe a siiri Sera ezigbo ike. Sera bụ nwaanyị obiọma. Ọ ga-abụkwa na o nwere ụmụnne, ụmụ ụmụnne, ụmụnne papa ya na mama ya, bụ́ ndị ọ hụrụ n’anya ọ ga-ahapụ. O nwere ike ọ gaghị ahụkwa ha ọzọ. N’agbanyeghị ihe ndị a, Sera jisiri ike na-akwado maka ọpụpụ ha.

N’agbanyeghị ihe a niile na-esiri Sera ike ịhapụ, ọ kwakọtachara ihe ya na-eche ụbọchị ha kwuru ha ga-apụ. Nna ha aha ya bụ Tira ga-esokwa ha n’agbanyeghị na ọ dị ihe dị ka narị afọ abụọ. (Jenesis 11:31) O doro anya na ilekọta nna ha a merela agadi agaghị adịchara Sera mfe. Lọt ga-esokwa ha ka ha ‘si n’ala ndị Kaldia na-akwapụ’ otú ahụ Chineke gwara ha mee.—Ọrụ Ndịozi 7:4.

Ha bu ụzọ gaa Heran. Obodo Heran dị ihe dị ka narị kilomita itoolu na iri isii n’ebe ugwu. Ha si n’akụkụ Yufretis na-aga. Ha biri na Heran obere oge. Ọ ga-abụ na Tira rịawara ọrịa mgbe ha ruru ebe a nke na o nweghịzi ike iso ha na-aga. Ha nọrọ na Heran ruo mgbe Tira nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise. Tupu ha akwalie ọzọ, Jehova gwara Ebreham okwu ọzọ. Ọ gwara ya ka o si ebe ahụ gaa n’ala ọ ga-egosi ya. Ma, na nke ugbu a, Chineke kwere ya nkwa mere ya obi ụtọ. Ọ gwara ya, sị: “M ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu.” (Jenesis 12:2-4) Ma, mgbe ha hapụrụ Heran, Ebreham dị afọ iri asaa na ise, Sera adịrịkwa afọ iri isii na ise, ma ha enweghị nwa ọ bụla. Oleezi otú Ebreham ga-esi aghọ mba ukwu? Ọ̀ ga-alụnụ nwaanyị ọzọ? N’oge ahụ, ndị mmadụ na-alụ karịa otu nwaanyị. Sera nwekwara ike ịna-eche ma Ebreham ọ̀ ga-alụ nwaanyị ọzọ.

N’agbanyeghị ihe ha na-eche, ha hapụrụ Heran. Olee ndị so ha pụọ na nke ugbu a? Baịbụl gwara anyị na Ebreham na ezinụlọ ya buuru akụ̀ niile ha kpatara, kpọrọkwa “mkpụrụ obi ha nwetara na Heran” pụọ. (Jenesis 12:5) Olee ndị bụ mkpụrụ obi ndị a? Ọ ga-abụ ndị na-ejere ha ozi. Ọ ga-abụkwa na Ebreham na Sera kọọrọ ndị niile chọrọ ige ha ntị gbasara Chineke ha. Ihe ụfọdụ ndị Juu oge ochie kwuru gbasara amaokwu a gosiri na ndị ahụ sonyeere Ebreham na Sera bụ ndị sooro ha fewe chi ha bụ́ Jehova. Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na okwukwe siri ike Sera nwere mere ka ọ gwa ha gbasara Chineke ya na olileanya ya otú mere ka ha kweta iso ya fewe ya. Anyị kwesịrị ichebara ihe a o mere echiche ebe ọ bụ na ndị mmadụ enwechaghị okwukwe na olileanya n’oge anyị a. E nwee ihe dị mma ị mụtara na Baịbụl, ị̀ na-akọrọ ya ndị ọzọ?

‘HA GBADARA IJIPT’

Mgbe ha gafechara Osimiri Yufretis, ha gawara n’ebe ndịda, n’ala ahụ Jehova kwere ha ná nkwa. O yiri ka ọ̀ bụ na Naịsan 14, n’afọ 1943 Tupu Oge Ndị Kraịst ka ha gafere Osimiri Yufretis. (Ọpụpụ 12:40, 41) Were ya na ị na-ahụ ka Sera na-elegharị anya n’ala ahụ, otú ala ahụ si maa mma na otú ọ dị amasị ya. Jehova gwakwara Ebreham okwu ọzọ n’akụkụ osisi ukwu dị na More, nke dị nso na Shikem. Ọ gwara ya, sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a.” Mgbe Ebreham nụrụ “mkpụrụ” gị, o nwere ihe ọ ga-echetara ya. Ọ ga-abụ na o mere ka o cheta ihe Jehova kwuru n’ogige Iden. O kwuru na otu ụbọchị, a ga-enwe mkpụrụ nke ga-ebibi Setan. Jehova agwala Ebreham na ọ ga-aghọ mba ukwu, nakwa na a ga-esi n’aka mba a gọzie ndị niile nọ n’ụwa.—Jenesis 3:15; 12:2, 3, 6, 7.

Ma, ọ pụtaghị na Ebreham na ezinụlọ ya agaghị enwe nsogbu ọ bụla. Mgbe ha nọ n’ala Kenan, ụnwụ dara ebe ahụ, Ebreham akpọrọzie ezinụlọ ya gawa ebe ndịda Ijipt. Ka ha na-aga, Ebreham chọpụtara otu ihe obodo ndị dị ebe ahụ na-emekarị nke nwere ike ịkpatara ya nsogbu. N’ihi ya, ọ gwara Sera, sị: “Biko, amaara m nke ọma na ị bụ nwaanyị mara mma. Ya mere, ọ ga-erukwa na ndị Ijipt ga-ahụ gị wee sị, ‘Onye a bụ nwunye ya.’ Ha ga-egbukwa m, ma ha ga-ahapụ gị ndụ. Biko, kwuo na ị bụ nwanne m nwaanyị, ka ihe wee gaziere m n’ihi gị, mkpụrụ obi m ga-adịkwa ndụ n’ihi gị.” (Jenesis 12:10-13) Gịnị mere Ebreham ji sị nwunye ya kwuo na ọ bụ nwanne ya?

 Ụfọdụ ndị na-agba Baịbụl ụkwụ kwuru na Ebreham ghara ụgha, nakwa na ọ bụ onye ụjọ. Ma, ihe ndị a ha kwuru abụghị eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Sera bụ nwanne Ebreham. E nwekwara ezigbo ihe mere Ebreham ji sị ya kwuo ihe ahụ o kwuru. Ebreham na Sera ma na Jehova kwuru na a ga-esi n’aka Ebreham nweta nwa pụrụ iche ga-aghọ mba ukwu. Ihe a Jehova kwuru dị ha mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-eme Ebreham. Ihe ọzọ bụ na ihe ndị mgbe ochie e gwupụtara n’ala gosiri na ọ na-abụkarị ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Ijipt hụ di na nwunye, ha egbuo di ahụ ma kpọrọ nwunye ya. Ọ bụ ya mere ihe ahụ Ebreham mere ji dị mma, Sera nwunye ya akwadokwa ya.

O gbughị oge ihe ahụ Ebreham na-atụ ụjọ ya emee. Ụfọdụ ndị Fero mere ndị isi hụrụ na Sera mara mma dị egwu n’agbanyeghị afọ ndụ ya mgbe ahụ. Mgbe ha hụrụ ya, ha gara gwa Fero, ya agwa ha kpọta ya. Ọ ga-abụrịrị na obi kooro Ebreham na Sera n’elu mgbe ahụ. Ma, o yiri ka e meghị Sera ka onye e ji eji, kama, ha kwanyeere ya ùgwù. O nwekwara ike ịbụ na Fero chọwara iji akụnụba ya mee ka ihe ya masịwa Sera. E mechazie, ya na Ebreham, Sera sịrị na ọ bụ nwanne ya, akpaa otú ọ ga-esi lụwa ya.—Jenesis 12:14-16.

Were ya ka ị̀ na-ahụ Sera ka ọ nọ n’obí eze, si na windo na-ele otú Ijipt si maa mma. Olee otú i chere obi ga-adị ya ugbu a ọ hụrụ onwe ya ọzọ n’ezigbo ụlọ, a na-enyekwa ya ezigbo nri? Sera ò kwere ka ihe ndị a megharịa ya anya, ebe ọ bụ na o nwere ike ọ nọtụbeghị n’ụdị ebe dị ka ụlọ Fero mbụ? Chegodị otú obi gaara esi tọọ Setan ụtọ ma á sị na Sera hapụrụ Ebreham, lụwazie Fero. Ma Sera emeghị ụdị ihe ahụ. Ọ hapụghị di ya na Chineke, ọ gbaghịkwa n’èzí. Ọ ga-amagbu onwe ya ma á sị na onye ọ bụla lụrụla di ma ọ bụ nwunye ga na-eme ka Sera n’ụwa a ịkwa iko na-egbu ọtụtụ ndị ka mmanya. Ì nwere ike ịna-eme ka Sera, ma ghara ime ihe ga-ewute ndị enyi gị na ndị ezinụlọ unu?

N’agbanyeghị ihe ndị na-adọrọ adọrọ Sera hụrụ n’obí Fero, ọ hapụghị di ya

Jehova mere ihe ka Fero ghara ịkpa ezigbo nwaanyị a aka. O tiri Fero na ezinụlọ ya ihe otiti. Mgbe Fero matara na Sera bụ nwunye Ebreham, ọ kpọghachiiri ya di ya ma gwa ha ka ha si n’Ijipt pụọ. (Jenesis 12:17-20) Obi tọrọ Ebreham ezigbo ụtọ mgbe a kpọghachiiri ya nwunye ọma ya. Ị ga-echeta na ọ gwara ya, sị: “Amaara m nke ọma na ị bụ nwaanyị mara mma.” Ma, o nwere ihe ọzọ kacha mee ka Ebreham hụ Sera n’anya. Ọ bụ àgwà ọma ya. Àgwà ọma ya karịrị mma ọ mara n’elu ahụ́. Jehova ejighịkwa ndị nwere àgwà ọma ka Sera egwu egwu. (1 Pita 3:1-5) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ka Sera. Anyị ga na-eme ka Sera ma ọ bụrụ na anyị ana-ebute ihe gbasara ofufe Chineke ụzọ, na-akọrọ ndị ọzọ ihe anyị na-amụta gbasara Chineke, ma na-eme ihe ọ chọrọ ma ọnwụnwa bịara anyị.

^ para. 3 Ọ bụ Ebram na Seraị ka ha na-azabu. Ma ihe e ji mara ha karịchaa bụ aha Jehova mechara gụọ ha.—Jenesis 17:5, 15.

^ para. 8 Otu nna ji Sera na Ebreham. Aha nna ha bụ Tira. (Jenesis 20:12) Ọ bụ eziokwu na mmadụ ịlụ onye otu nna ji ya na ya taa adịghị mma, ma anyị ga-echeta na otú ihe dị ugbu a abụghị otú ihe dị n’oge ahụ. Ezughị okè akpawabeghị ike n’ahụ́ ndị dịrị ndụ n’oge ahụ otú ọ na-akpa n’ahụ́ anyị taa. Ọ bụ ya mere ọrịa ndị mmadụ na-ebute n’ihi ịlụ nwanne ha anaghị arịa ụmụ ha n’oge ahụ. Ma, mgbe ihe dị ka narị afọ anọ gachara, ndị mmadụ anaghịzi adịte ndụ aka otú ahụ ọ dịkwa taa. N’oge ahụ, Iwu Mozis kwuru na mmadụ na onye ikwu ya ekwesịghị inwe mmekọahụ́.—Levitikọs 18:6.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.