Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 3 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OTÚ NDỊ NA-AGBA ỊNYỊNYA ANỌ SI GBASA GỊ

Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?

Ị gụọ ma ọ bụ nụ banyere ndị na-agba ịnyịnya anọ ahụ, o nwere ike ịtụ gị ụjọ ma ọ bụ yie gị ihe mmadụ na-agaghị aghọtali. Ma o kwesịghị ịdị otú ahụ. Maka gịnị? Maka na ihe Baịbụl kwuru banyere ha na ihe ndị na-eme n’oge anyị a na-enyere anyị aka ịghọta ihe nke ọ bụla n’ime ha nọchiri anya ya. Ọ bụ eziokwu na ha na-egosi na a ga-enwe nsogbu n’ụwa, ma ha nwere ike ime ka obi tọọ gị na ndị ezinụlọ gị ụtọ. Olee otú ọ ga-esi mee? Ka anyị bugodị ụzọ mata ihe nke ọ bụla n’ime ndị ahụ na-agba ịnyịnya ndị ahụ nọchiri anya ya.

ONYE NA-AGBA ỊNYỊNYA ỌCHA AHỤ

Otú a ka Baịbụl si bido ịkọ gbasara ọhụụ ahụ: “M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya ọcha; onye nọ n’elu ya ji ụta; e nyekwara ya okpueze, o wee gaa na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya.”—Mkpughe 6:2.

Ònye bụ onye ahụ na-agba ịnyịnya ọcha a? Ihe ọzọ e mechara kwuo ná Mkpughe mere ka anyị mata onye ọ bụ. E kwuru na onye na-agba ya bụ “Okwu Chineke.” (Mkpughe 19:11-13) Ọ bụ Jizọs Kraịst ka a na-akpọ Okwu ahụ n’ihi na ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke. (Jọn 1:1, 14) A na-akpọkwa Jizọs “Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu.” Ihe ọzọ a na-akpọ ya bụ “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile.” (Mkpughe 19:11, 16) O doro anya na Jizọs nwere ike ibu agha n’ihi na ọ bụ eze, ọ naghịkwa e ji ike ya eme ihe na-adịghị mma. Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ịma.

Ònye nyere Jizọs ikike imeri ndị iro ya? (Mkpughe 6:2) Daniel onye amụma hụrụ ọhụụ ebe e kwuru na e nyere “nwa nke mmadụ,” ya bụ, Mesaya “ọchịchị na ùgwù na alaeze.” Ọ bụ “Onye Ochie ahụ,” ya bụ, Jehova Chineke * nyere ya ihe ndị ahụ. (Daniel 7:13, 14) N’ihi ya, ọ bụ Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, nyere Jizọs ike ịchị ụwa na ibibi ndị ajọ omume. Ọ dabara adaba na Ọkpara Chineke na-agba ịnyịnya ọcha n’ihi na agha ọ na-ebu ziri ezi. Baịbụl na-ejikarị ihe dị ọcha anọchi anya ezi omume.—Mkpughe 3:4; 7:9, 13, 14.

Olee mgbe ndị ahụ na-agba ịnyịnya ndị ahụ malitere ịgba? Baịbụl kwuru na Jizọs bụ́ onye mbụ ná ndị ahụ na-agba ịnyịnya ndị ahụ malitere ịgba nke ya mgbe e nyere ya okpueze. (Mkpughe 6:2) Olee mgbe e chiri Jizọs Eze n’eluigwe? Ọ bụghị mgbe ọ laghachiri n’eluigwe. Baịbụl kwuru na o cheere ruo oge ụfọdụ. (Ndị Hibru 10:12, 13) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eji ama mgbe oge ahụ ọ na-echere ga-agwụ, nakwa mgbe ọ ga-amalite ịchị n’eluigwe. O kwuru na ya bido ịchị, ihe ga-agbanwe n’ụwa. Nsogbu ma ọ bụ ihe ọjọọ ga-arịwa ibe ya elu. A ga-enwe agha, ụkọ nri na ajọ ọrịa na-efe efe. (Matiu 24:3, 7; Luk 21:10, 11) Ozugbo Agha Ụwa nke Mbụ bidoro n’afọ 1914, ọ bịara doo anya na ụmụ mmadụ abanyela n’oge nsogbu ahụ Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’—2 Timoti 3:1-5.

Ma, gịnị mere ihe ji na-aka njọ n’ụwa kemgbe e chiri Jizọs eze n’afọ 1914? Ọ bụ n’ihi na Jizọs malitere ịchị n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa. Ozugbo ọ malitere ịchị, agha dara n’eluigwe. Maịkel, ya bụ, Jizọs, chụdara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpughe 12:7-9, 12) Ebe a chụdara Setan n’ụwa, ezigbo iwe ji ya n’ihi na ọ ma na oge ọnwụ ya eruwela. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi Setan ka uche ya nwee ike ime n’ụwa a. (Matiu 6:10) Ugbu a, ka anyị hụ otú ndị na-agba ịnyịnya atọ ndị nke ọzọ si mee ka o doo anya na anyị bi “n’oge ikpeazụ.” Anyị amatala na onye na-agba ịnyịnya nke mbụ nọchiri anya onye dị adị. Ma, ndị na-agba ịnyịnya atọ ndị nke ọzọ nọchiri anya ihe ndị na-eme n’ụwa niile. Ihe ndị ahụ na-akpakwa ndị mmadụ aka ọjọọ.

 ONYE NA-AGBA ỊNYỊNYA NKE NA-ACHA UHIE UHIE

“Ịnyịnya ọzọ wee pụta, bụ́ ịnyịnya na-acha uhie uhie; e nyere onye nọ n’elu ya ikike iwepụ udo n’ụwa ka ha wee gburịta ibe ha; e nyekwara ya oké mma agha.”—Mkpughe 6:4.

Onye na-agba ịnyịnya a nọchiri anya agha. Ị̀ chọpụtara na e kwuru na o wepụrụ udo n’ụwa, ọ bụghị ná mba ole na ole? N’afọ 1914, a malitere ịlụ agha ụwa nke mbụ. Mgbe a lụchara ya, a lụkwara agha ụwa nke abụọ. Agha a mebiri ihe n’ụwa karịa nke mbụ. Ụfọdụ nchọpụta e mere gosiri na agha ataala isi ihe karịrị otu narị nde mmadụ n’ụwa kemgbe afọ 1914. Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị taa nwere nkwarụ n’ihi agha.

Olee ihe gosiri na agha ka e ji mara oge anyị a? O yiri ka ụmụ mmadụ hà nwere ngwá agha ha ga-eji ekpochapụ mmadụ niile nọ n’ụwa taa. E nwetụbeghị ụdị ya mbụ. Òtù dị iche iche a sịrị na ha na-eme udo n’ụwa, dị ka Òtù Mba Ụwa, enwebeghị ike ịkwụsị onye ahụ na-agba ịnyịnya ahụ na-acha uhie uhie ịna-agba.

ONYE NA-AGBA ỊNYỊNYA OJII AHỤ

“M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya ojii; onye nọ n’elu ya ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ gbara mkpị n’aka ya. M wee nụ otu olu nke dị ka à ga-asị na o si n’etiti ihe anọ ahụ dị ndụ. Olu ahụ sịrị: ‘A na-ere otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kwọt nke ọka wit otu mkpụrụ ego dinarịọs, a na-erekwa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kwọt atọ nke ọka bali otu mkpụrụ ego dinarịọs; emebikwala mmanụ oliv na mmanya.’”— Mkpughe 6:5, 6.

Onye na-agba ịnyịnya a nọchiri anya ụkọ nri. Ihe e kwuru na Baịbụl ebe ahụ gosiri na nri ga-adị ezigbo ụkọ nke na a ga-eji otu dinarịọs zụta naanị otu kwọt ọka wit (ya bụ, ihe dị ka iko ọka wit anọ). Otu dinarịọs bụ ụgwọ a na-akwụ onye ọrụ n’ụbọchị n’oge ndịozi Jizọs. (Matiu 20:2) A na-ejikwa otu dinarịọs zụta ihe dị ka kwọt ọka bali atọ (ya bụ, ihe dị ka iko ọka bali iri na abụọ). Ma ọka wit ka ọka bali mma. Mmadụ ole n’ezinụlọ ga-eri ya rijuo afọ? A gwaziri ndị mmadụ ka ha ghara ịna-emefusi nri ndị a na-eri kwa ụbọchị n’oge ahụ, dị ka mmanụ oliv na mmanya.

Kemgbe afọ 1914, è nweela ihe ndị anyị hụrụla gosiri na onye na-agba ịnyịnya ojii ahụ na-agbasi ike? Ee. Agụụ gụgburu ihe dị ka nde mmadụ iri asaa n’agbata afọ 1901 na afọ 2000. Otu akwụkwọ kwuru na n’agbata afọ 2012 na afọ 2014, ihe dị ka “narị nde mmadụ asatọ na nde ise ejighị ahụ́ n’ihi na ha erighị nri na-edozi ahụ́.” Akwụkwọ ọzọ kwukwara, sị: “A gụkọta mmadụ ole ọrịa o biri n’ájá ọcha, ịba na ụkwara nta na-egbu kwa afọ, ndị agụụ na-agụgbu karịrị ha.” N’agbanyeghị mbọ niile ndị mmadụ na-agba ka a na-enwe nri ga-ezuru ndị mmadụ, onye ahụ na-agba ịnyịnya ojii ahụ ka na-agbasi ya ike.

ONYE NA-AGBA ỊNYỊNYA NKE AHỤ́ YA CHANWỤRỤ ACHANWỤ

“M wee hụ, ma, lee! ịnyịnya nke ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ; onye nọ n’elu ya nwekwara aha bụ́ Ọnwụ. Hedis sochikwara ya anya. E nyekwara ha ikike ịchị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ụwa, ka ha jiri ogologo mma agha na ụkọ nri na ajọ ọrịa na anụ ọhịa nke ụwa na-egbu ndị mmadụ.”—Mkpughe 6:8.

Onye na-agba ịnyịnya nke anọ a nọchiri anya ọnwụ. Ihe na-akpata ọnwụ a bụ ọrịa na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Obere oge afọ 1914 gachara, oké ahụ́ ọkụ Spen gburu ọtụtụ nde mmadụ. O nwere ike ịbụ na ọrịa a kpara ihe dị ka narị nde mmadụ ise, ya bụ, otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla bi n’ụwa n’oge ahụ, aka ọjọọ.

Ma ọ bụghị naanị oké ahụ́ ọkụ Spen kpara ndị mmadụ aka ọjọọ n’oge ahụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na kịtịkpa gburu ọtụtụ narị nde mmadụ n’agbata afọ 1901 na afọ 2000. Kemgbe ahụ, ọrịa o biri n’ájá ọcha, ụkwara nta, na ịba ka na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ nwụchuo ọnwụ n’agbanyeghị mbọ a na-agba ịchọpụta ọgwụ a ga-eji agwọ ọrịa ndị a.

Ma ọ̀ bụ agha ma ọ bụ ụkọ nri ma ọ bụkwanụ ọrịa gburu mmadụ, ọ bụ ọnwụ gburu ya. Ili na-elokwa ha n’ike n’ike.

 IHE GA-ADỊ MMA N’ỌDỊNIHU

Nsogbu niile na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Ì chetara na Baịbụl kwuru na Jizọs malitere ‘imeri’ Setan na ndị iro ya ndị ọzọ n’afọ 1914, chụdakwa Setan n’ụwa. Ma Jizọs enwezubeghị mmeri ya. (Mkpughe 6:2; 12:9, 12) Obere oge ugbu a, Jizọs ga-eji agha Amagedọn kwụsị nsogbu niile Setan kpatarala ụmụ mmadụ, ma bibie ndị niile na-akwado Setan. (Mkpughe 20:1-3) Ọ ga-akwụsị ndị na-agba ịnyịnya atọ ndị ọzọ ahụ ịna-agba. Ọ ga-emezi ihe niile ha mebiri. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere ya.

Kama ndị mmadụ ịna-alụ agha, udo ga-adị ebe niile. Jehova ‘ga-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube.’ (Abụ Ọma 46:9) Ndị na-eme udo ‘ga-enwe obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.’—Abụ Ọma 37:11.

Agaghị enwekwa ụkọ nri n’ihi na nri ga-eju ebe niile. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”—Abụ Ọma 72:16.

N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-emezi ihe niile ndị ahụ na-agba ịnyịnya atọ ndị ọzọ ahụ mebiri

Kama ndị mmadụ ịna-arịa ọrịa ma na-anwụ anwụ, ahụ́ ga-esi ha ike, ha adịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube iji gosi ihe ndị ọ ga-emere ụmụ mmadụ mgbe ọ ga na-achị ụwa. O mere ka obi ruo ndị mmadụ ala, nye ọtụtụ puku ndị agụụ ji nri, gwọọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Matiu 12:15; 14:19-21; 26:52; Jọn 11:43, 44.

Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ igosi gị na Baịbụl nke gị ihe ị ga-eme ka ị dịrị ndụ mgbe ndị ahụ na-agba ịnyịnya ndị ahụ ga-akwụsị ịgba ha. Ị̀ ga-achọ ka Ndịàmà Jehova bịa na nke gị?

^ para. 7 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

GỤKWUO GBASARA YA

TETA!

Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ọgwụgwụ Ụwa

Gịnị bụ “ụwa” ga-agabiga? Olee otú ọ ga-esi gabiga? Oleekwa mgbe ọ ga-agabiga?

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.