Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 1 n'Afọ 2017

 ṄOMIE OKWUKWE HA | INỌK

“O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”

“O Mere Ihe Dị Chineke Ezi Mma”

INỌK biri ogologo ndụ. Ọ gbara narị afọ atọ na iri isii na ise. Ihe a nwere ike isiri anyị ike ikweta. E jiri afọ ole a Inọk gbara tụnyere afọ ole mmadụ na-agba taa, ọ karịrị afọ ndụ mmadụ anọ kara nká gbara tupu ha anwụọ. Ma e nwere ike ikwu na Inọk nwụchuru ọnwụ ma e were afọ ole ọ gbara tụnyere afọ ole ndị oge ahụ na-agba. N’oge ahụ, ya bụ, ihe karịrị puku afọ ise gara aga, ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa otú a na-adị taa. Dị ka ihe atụ, Adam ebiela ndụ ihe karịrị narị afọ isii tupu a mụọ Inọk. Ọ dịkwara ndụ ihe karịrị narị afọ atọ mgbe a mụchara Inọk. Ụfọdụ ụmụ ụmụ Adam bidịrị ogologo ndụ karịa ya. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na mgbe ahụ Inọk gbara narị afọ atọ na iri isii na ise, na ume ndụ ka dị ya n’ahụ́, nakwa na ọ ka nwere ọtụtụ afọ ọ ka ga-adị ndụ. Ma, ọ nwụchuru ọnwụ.

Were ya na ị na-ahụ Inọk ka ọ na-agba ọsọ ụkwụ eru ala. Ọ nọ n’ezigbo nsogbu. Ka ọ nọ na-agba ọsọ, o chefughị otú ndị ọ ka gwara ihe Chineke kwuru si meso ya ihe. I lee ndị ahụ anya n’ihu, ị ga-amata na ezigbo iwe ji ha. Ha kpọrọ Inọk asị. Ha achọghị iji ntị anụ ihe ọ na-agwa ha, o nweghị ihe ha ji Chineke dunyere ya ozi ahụ kpọrọ. O nweghịkwanụ otú aka ha ga-esi kpara Jehova bụ́ Chineke Inọk, ma aka ha nwere ike ịkpara Inọk. O nwere ike ịbụ na Inọk na-eche ma ya ga-ahụkwa ndị ezinụlọ ya anya ọzọ. Ọ̀ ga-abụ na o chetara nwunye ya na ụmụ ya ndị nwaanyị na nwa ya nwoke bụ́ Metusela, ma ọ bụkwanụ nwa nwa ya bụ́ Lemek? (Jenesis 5:21-23, 25) Ma, nke ya ọ̀ gwụla?

E kwughị ọtụtụ ihe banyere Inọk na Baịbụl. Naanị n’ebe atọ ka a kọrọ obere ihe gbasara ya. (Jenesis 5:21-24; Ndị Hibru 11:5; Jud 14, 15) Ma, ihe ndị a kọrọ gbasara ya n’ebe ndị ahụ gosiri na Inọk bụ nwoke nwere ezigbo okwukwe. Ị̀ na-egboro ndị ezinụlọ gị mkpa ha? È nwetụla mgbe ị bara ná nsogbu n’ihi na ị na-eme ihe ị ma na o ziri ezi? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike ịmụta n’okwukwe Inọk.

“INỌK WEE SORO EZI CHINEKE NA-EJE IJE”

Ihe ọjọọ nọ na-arị ibe ya elu n’ụwa mgbe a mụrụ Inọk. A mụrụ Inọk n’ọgbọ nke asaa malite n’Adam. Ezughị okè akpawabeghị ụmụ mmadụ aka ọjọọ n’oge ahụ otú o si akpa anyị n’oge a, n’ihi na ọ dịchabeghị anya Adam na Iv mehiere. Ọ bụ ya mere ndị oge ahụ ji bie ogologo ndụ. Ma, àgwà ha retọrọ eretọ, ha na Jehova adịghịkwa ná mma. Tigbuo zọgbuo juru ebe niile. Ọ malitere n’ọgbọ nke abụọ, bụ́ mgbe Ken gburu Ebel. O yiri ka obi ọ̀ na-atọ otu n’ime ụmụ ụmụ Ken ụtọ na ya na-akpa ike, na-emesikwa mmadụ ike karịa Ken. E nwere ihe ọjọọ ọzọ ndị mmadụ malitere ime n’ọgbọ nke atọ. Ha malitere ịkpọ aha Jehova, ma ọ bụghị iji kwanyere ya ùgwù ma ọ bụ fee ya. Ha nọ na-eme ihe ndị na-eme ka a kọchaa aha Chineke.—Jenesis 4:8, 23-26.

O yiri ka ihe a ha na-eme ọ̀ bịara ka njọ n’oge Inọk. Ma, olee ihe Inọk ga-eme? Ọ̀ ga-eso ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ a ha na-eme, ka ọ̀ ga-achọ ịma ihe Jehova Chineke, onye kere eluigwe na ụwa,  chọrọ ka e mee ma na-erubere ya isi? Ọ ga-abụ na ihe a kọọrọ ya gbasara Ebel metụrụ ya n’ahụ́. E gburu Ebel n’ihi na ọ na-efe Jehova otú Jehova chọrọ. Inọk kpebiri na ya ga-efe Jehova ka Ebel. Jenesis 5:22 sịrị na Inọk “soro ezi Chineke na-eje ije.” Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Inọk fere Chineke otú ọ chọrọ n’oge ahụ ọtụtụ ndị na-eme ihe ọjọọ. Ọ bụ ya bụ onye mbụ Baịbụl kwuru soro Chineke jee ije.

Amaokwu Baịbụl ahụ kwukwara na Inọk na Jehova nọgidere na-eje ije ma mgbe ọ mụchara Metusela. Ihe e kwuru ebe ahụ gosikwara na mgbe Inọk dị afọ iri isii na ise, o nweela ezinụlọ nke ya. O nwere nwunye, nweekwa “ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” Ma, Baịbụl akpọghị aha nwunye ya, o kwughịkwa ole ụmụ ya dị. Onye ọ bụla bụ́ nna nke chọrọ iso Chineke na-eje ije ma na-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha kwesịrị ime ya otú Chineke chọrọ. Inọk ghọtara na Jehova achọghị ka ọ na-agba n’èzí. (Jenesis 2:24) Ọ gbakwara mbọ kụziere ụmụ ya gbasara Jehova Chineke. Olee uru ọ̀ baara ya?

E nweghị ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ụmụ Inọk. O kwughịkwanụ ma Metusela ò fere Chineke ma ọ bụ na o feghị ya. Baịbụl kwuru na Metusela kacha bie ogologo ndụ. Ọ nwụrụ n’afọ ahụ Chineke ji mmiri bibie ụwa n’oge Noa. Ma, Metusela mụrụ nwa aha ya bụ Lemek. Lemek hụrụ nna nna ya Inọk. Ọ dịrị ndụ ihe karịrị otu narị afọ tupu nna nna ya anwụọ. Lemek nwere ezigbo okwukwe na Chineke. Jehova nyere ya mmụọ nsọ ya ebuo amụma banyere Noa nwa ya nwoke. Amụma a mezuru mgbe ahụ e bibichara ụwa n’oge Noa. Noa so Chineke jee ije ka nna nna ya Inọk. Inọk nwụrụ tupu a mụọ Noa. O fere Chineke nke ọma. Ọ ga-abụ Lemek, nna Noa kọọrọ Noa otú Inọk si fee Chineke ma ọ  bụkwanụ nna nna ya bụ́ Metusela. O nwekwara ike ịbụ Jered, bụ́ nna Inọk, kọọrọ ya Noa n’ihi na Jered nwụrụ mgbe Noa dị narị afọ atọ na iri isii na isii.—Jenesis 5:25-29; 6:9; 9:1.

Inọk emetụdịghị ka Adam. Adam zuru okè, ma o nupụụrụ Jehova isi, ya emee ka ụmụ ya na-enupụrụ Chineke isi ma na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Ma, n’agbanyeghị na Inọk ezughị okè, o nwere okwukwe na Chineke ma rubere ya isi, ụmụ ya mụtakwara ime ka ya. Adam nwụrụ mgbe Inọk dị narị afọ atọ na asatọ. Ndị ezinụlọ Adam hà ruuru ya uju mgbe ọ nwụrụ? Anyị amaghị. Ma ihe doro anya bụ na Inọk nọgidere “soro ezi Chineke na-eje ije.”—Jenesis 5:24.

Ọ bụrụ na ị na-akpa afọ ezinụlọ gị, e nwere ihe i nwere ike ịmụta n’okwukwe Inọk. Ọ bụ eziokwu na ọ dị mkpa ịkpa afọ ha, ma e nweghị ihe dị mkpa karịa ịna-akụziri ha Okwu Chineke. (1 Timoti 5:8) Ọ bụghị naanị na ị ga na-akụziri ha Okwu Chineke, i kwesịkwara ịna-eme ya eme. Ọ bụrụ na i soro Chineke na-eje ije ka Inọk, na-eme ihe Baịbụl kwuru, ụmụ gị ga-amụtakwa ime ka gị.

INỌK ‘BURU AMỤMA BANYERE HA’

O nwere ike ịbụ na Inọk chere na o nweghị onye na-ahụ mbọ ọ na-agba ife Chineke ebe ọ bụ na ndị oge ahụ anaghị efe Chineke. Ma, Jehova Chineke ya, ọ̀ na-ahụ mbọ ọ na-agba ime ihe ziri ezi? Eenụ. Otu ụbọchị, Jehova gwara Inọk okwu. O ziri ya  ozi ọ ga-ezi ndị oge ya ahụ. Ọ bụ otú a ka Inọk si bụrụ onye amụma mbụ e dere ihe o buru n’amụma na Baịbụl. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ ihe Jud, onye nne ji ya na Jizọs dere mgbe ọtụtụ narị afọ gachara mere ka anyị mara. Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka Jud dee amụma ahụ na Baịbụl. *

Gịnị ka Inọk buru n’amụma? O kwuru, sị: “Lee! Jehova bịara, ya na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya, ime ha niile ihe e kpere n’ikpe, na ịma ndị niile na-adịghị asọpụrụ Chineke ikpe banyere omume ha niile nke asọpụrụghị Chineke, bụ́ ndị ha mere n’ụzọ asọpụrụghị Chineke, nakwa banyere ihe niile na-awụ akpata oyi nke ndị mmehie na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.” (Jud 14, 15) Ị̀ chọpụtara na Inọk kwuru okwu ka à ga-asị na Chineke emezuola amụma ahụ o buru? Ọ bụ otú ahụ ka ọtụtụ ndị amụma sikwa buo amụma mgbe Inọk nwụchara. Ihe mere Inọk ji buo amụma ahụ otú ahụ bụ na o ji n’aka na ọ ga-emezurịrị, ya ekwuzie ya ka à ga-asị na o mezuola.—Aịzaya 46:10.

Inọk ji obi ike zie ndị oge ya na-anaghị asọpụrụ Chineke ozi Chineke ziri ya zie ha

Olee otú Inọk si zie ndị mmadụ ozi ahụ? Ọ gwara ha okwu n’ezoghị ọnụ. O kwuru ugboro abụọ na ha bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke, kwuokwa ugboro abụọ na ha na-eme omume asọpụrụghị Chineke. O ji ihe a o kwuru katọọ ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ, ihe ha na-eme, na otú ha si na-eme ya. Ihe a o kwuru gosikwara na Chineke ga-ebibi ha n’ihi na ndị mmadụ akpaala arụ n’ụwa kemgbe ahụ a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden. Jehova ga-eji “ndị nsọ” ya, ya bụ, ìgwè ndị mmụọ ozi ya bibie ha. Inọk gwara ha ihe a Chineke ga-eme na-atụghị egwu. E nweghị onye ya na ya na-eso aga agwa ha ya. Ọ ga-abụ na o juru Lemek anya ka ọ nọ na-ele otú nna nna ya si kata obi na-ezi ndị mmadụ ozi a. Ọ bụrụ otú ahụ, anyị ghọtara ihe kpatara ya.

Okwukwe Inọk nwere mere ka o lee ụwa anya otú Chineke si ele ya anya. Ụdị okwukwe a o nwere ò kwesịghị ime ka anyị na-elekwa ụwa a anya otú Chineke si ele ya? Ozi ahụ Inọk ji obi ike zie ndị oge ya gbasakwara anyị taa. Jehova bibiri ndị ahụ na-anaghị asọpụrụ ya otú ahụ Inọk buru n’amụma. O ji mmiri bibie ha n’oge Noa. Chineke ga-ebibi ndị na-anaghị asọpụrụ ya n’oge anyị a otú ahụ o bibiri ndị nke oge Noa. (Matiu 24:38, 39; 2 Pita 2:4-6) Ya na ìgwè ndị mmụọ ozi ya ejikerela ibibi ha. Anyị kwesịrị iji ozi ahụ Inọk ziri kpọrọ ihe ma na-akọrọ ya ndị ọzọ. Ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị nwere ike ha agaghị ege ntị n’ozi ahụ. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na o nweghị onye na-ahụ mbọ anyị na-agba ife Chineke. Ma, Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba. Ọ gaghị ahapụ anyị otú ahụ ọ na-ahapụghị Inọk.

‘E WEGARA YA EBE ỌZỌ KA Ọ GHARA ỊHỤ ỌNWỤ’

Olee otú Inọk si nwụọ? Baịbụl kwuru ihe ole na ole banyere otú o si bie ndụ, ma otú o si nwụọ edoghị ndị mmadụ anya. Naanị ihe Jenesis 5:24 kwuru bụ: “Inọk wee soro ezi Chineke na-eje ije. Ma ọ nọkwaghị, n’ihi na Chineke kpọpụrụ ya.” Olee otú Chineke si kpọpụ Inọk? Pọl onyeozi mechara kwuo, sị: “Ọ bụ okwukwe Inọk mere e ji wega ya ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ, ọ dịghịkwa ebe a hụrụ ya n’ihi na Chineke wegara ya ebe ọzọ; n’ihi na tupu e wega ya ebe ọzọ, a gbara àmà banyere ya na o mere ihe dị Chineke ezi mma.” (Ndị Hibru 11:5) Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o kwuru na ‘e wegara ya ebe ọzọ ka ọ ghara ịhụ ọnwụ’? Baịbụl ụfọdụ kwuru na Chineke kpọọrọ ya gaa eluigwe. Ma, ọ bụghị eziokwu n’ihi na Baịbụl kwuru na Jizọs Kraịst bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’eluigwe.—Jọn 3:13.

 Oleezi otú e si ‘kpọpụ’ Inọk ka “ọ ghara ịhụ ọnwụ”? Jehova mere ka o jiri nwayọọ nwụọ ka ọ ghara ịnụ ụfụ ọnwụ. Ma tupu Inọk anwụọ, “a gbara àmà banyere ya na o mere ihe dị Chineke ezi mma.” Olee otú e si gbaara ya àmà a? O nwere ike ịbụ na obere oge tupu ya anwụọ, Chineke gosiri ya ọhụụ otú ụwa ga-adị ma ọ ghọọ paradaịs. Mgbe Jehova gosichara Inọk otú paradaịs ga-adị iji mee ka ọ mata na ihe ya dị ya mma, Inọk nwụrụ. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara Inọk na ndị ọzọ fere Chineke n’oge ochie, ọ sịrị: “Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe.” (Ndị Hibru 11:13) Ọ ga-abụ na mgbe ọ nwụchara, ndị iro ya chọrọ ya elu chọọ ya ala, ma, ‘ọ dịghị ebe ha hụrụ ya.’ O nwere ike ịbụ n’ihi na Jehova ji aka ya lie ya ka ha ghara iji ozu ya mere ihe ọchị ma ọ bụkwanụ were ya mere chi. *

Ugbu a ka anyị chebagodịrị otú o nwere ike ịbụ na Inọk si nwụọ echiche. Were ya na ị na-ahụ ka ọ na-agba ọsọ, ike agwụchaa ya. Ndị chọrọ igbu ya nọ na-achụ ya, ezigbo iwe ji ha n’ihi na ọ gwara ha na Chineke ga-ebibi ha. Inọk agbaba n’otu ebe, zoo, nọrọ ebe ahụ na-ezurutụ ike. Ma, ọ ma na ha ga-emecha kpara ya aka ma gbuo ya. Ka ọ nọ na-ezu ike, o kpere ekpere. Mgbe o kpechara ekpere, obi bịara ruo ya ala. Ọ hụrụ ọhụụ, ya adị ya ka ọ̀ nọ ebe ahụ e gosiri ya n’ọhụụ.

Ọ ga-abụ na a na-achọ igbu Inọk mgbe Jehova kpọpụrụ ya

Werekwa ya na ọ nọ na-ahụ ụwa dị iche na nke ahụ o bi na ya. Ụwa a mara ya ezigbo mma ka ogige Iden, ma e nweghị ndị cherọb na-eche ya nche ka ndị mmadụ ghara ịbanye na ya. Ọtụtụ ndị juru na ya. Ahụ́ siri ha niile ike, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha niile nwere ike okorobịa. Udo dị ebe niile. E nweghị onye kpọrọ ibe ya asị ma ọ bụ na-emegide ibe ya maka na ọ na-efe Chineke. Ihe a Inọk na-ahụ mere ka obi sie ya ike na Jehova kwụ ya n’azụ ma hụ ya n’anya. O doro ya anya na Jehova ga-emecha mee ka o biri ebe ahụ. Obi bịara jiri nwayọọ nwayọọ ruo ya ala, ya emechie anya ya hiwe ezigbo ụra, sizie na ya nwụọ.

Ọ bụ otú ahụ ka o nwere ike ịbụ na o si nwụọ ruo taa. Ma, Jehova Chineke ka na-echeta ya. Jizọs mechara kwuo na otu ụbọchị, ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya, pụta. Ha ga-emeghe anya ha hụzie onwe ha n’ụwa ọhụrụ mara mma, udo juru na ya.—Jọn 5:28, 29.

Ị̀ ga-achọ ibi n’ụwa mgbe ahụ? Obi ọ̀ gaghị atọ gị ụtọ ma ị hụ Inọk? Chegodị banyere ihe ndị i nwere ike ịmụta n’aka ya. O nwere ike ịgwa anyị ma otú a anyị kwuru na o nwere ike ịbụ na o si nwụọ ma ọ̀ bụ otú o si nwụọ n’eziokwu. Ma, o nwedịrị ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta n’aka ya ugbu a. Olee ihe ọ bụ? Pọl kwuru ya mgbe o kwuchara gbasara Inọk. Ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” (Ndị Hibru 11:6) Ihe a kwesịrị ime ka anyị niile gbaa mbọ ṅomie okwukwe Inọk.

^ para. 14 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl na-ekwu na ihe Jud dere si n’akwụkwọ a na-akpọ Akwụkwọ Inọk. Amaghị onye dere akwụkwọ ahụ, ma, a na-asị na ọ bụ Inọk dere ya. E nwere ebe e dere amụma ahụ Inọk buru n’ime ya. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-abụ na onye dere ya si n’akwụkwọ ọzọ e dere n’oge ahụ anyị na-amaghịzi ebe ọ dị nweta ihe o dere. O nwekwara ike ịbụ na ndị ma gbasara amụma ahụ kọọrọ ya gbasara ya. Ọ ga-abụkwa otú ahụ ka Jud si nweta ihe o dere ma ọ bụkwanụ ya abụrụ Jizọs kọọrọ ya gbasara ya n’ihi na Jizọs nọ n’eluigwe mgbe ahụ na-ahụ Inọk.

^ para. 20 Ọ bụkwa otu ihe ahụ mere Chineke ji ghara ikwe ka ndị mmadụ jiri ozu Mozis na Jizọs mere ihe ndị oge Inọk gaara achọ iji ozu ya eme.—Diuterọnọmi 34:5, 6; Luk 24:3-6; Jud 9.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Ànyị Ga-emeli Ihe Dị Chineke Mma?

Ị gụọ akụkọ Job, Lọt, na Devid, bụ́ ndị nwere oge ha mere ihe dị oké njọ, ị ga-amata azịza ya.