Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 1 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ

Ihe Ga-eme Ka Ịgụ Baịbụl Na-atọkwu Gị Ụtọ

Ịgụ Baịbụl ọ̀ na-atọ gị ụtọ, ka ọ̀ na-agwụ gị ike? Nke ọ bụla ọ bụ nwere ike ịbụ n’ihi otú i si na-agụ ya. Ka anyị leba anya n’ihe ndị ga na-eme ka ịgụ Baịbụl na-agụ gị agụụ, ma na-atọkwu gị ụtọ.

Jiri Baịbụl a sụgharịrị nke ọma na nke e ji asụsụ a na-ede n’oge a na-agụ ya. Ọ bụrụ na ị na-agụ akwụkwọ, gụta ọtụtụ okwu na-esiri gị ike ịghọta, ma ọ bụkwanụ okwu ndị mgbe ochie ị na-amaghị ihe ha pụtara, akwụkwọ ahụ nwere ike ịgbụ gị. Ọ bụ ya mere o ji dị mma ka ị chọta Baịbụl e ji asụsụ dị mfe ga-eru gị n’obi sụgharịa. O kwesịkwara ịbụ nke a sụgharịrị nke ọma. *

Danloduo ya n’ekwentị na ihe ndị yiri ya, ma ọ bụ gị ana-agụ ya n’Ịntanet. N’oge anyị a, e nwere Baịbụl ndị e biri ebi, nweekwa ndị nke dị n’Ịntanet, kọmputa, ekwentị na ihe ndị yiri ya. E nwekwara ihe ndị dị na kọmputa ma ọ bụ n’ekwentị ụfọdụ nwere ike inyere gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ihe ị na-agụ. Ha nwekwara ike inyere gị aka ịhụ otú e si sụgharịa amaokwu ị na-agụ ná nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ. E nwekwara Baịbụl ndị a gụrụ agụ i nwere ike igere egere. Ụfọdụ na-egere ya ma ha nọrọ n’ụgbọala na-eme njem, ma ha na-asa ákwà, ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ndị ọzọ. Leenụ ma ò nwere nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a ga-akara gị mma isi gụọ Baịbụl.

Jiri ihe ndị e ji amụ Baịbụl na-agụ Baịbụl. E nwere ihe ndị e ji amụ Baịbụl nwere ike inyere gị  aka ịghọtakwu Baịbụl ị na-agụ. Otu n’ime ha bụ map ndị na-egosi obodo ndị e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ha nwere ike inyere gị aka ịmata ebe ihe ndị ị na-agụ mere, meekwa ka ị ghọtakwuo ihe ị na-agụ. Isiokwu ndị gbara n’akwụkwọ anyị ụfọdụ dị ka ndị dị n’Ụlọ Nche a nwere ike inyere gị aka ịghota ọtụtụ ihe e kwuru na Baịbụl. E nwekwara ndị dị na jw.org/ig, n’ebe e dere “Ihe Baịbụl Na-akụzi.”

Gbanwee otú i si na-agụ ya. Ọ bụrụ na isi n’isi gụrụ Baịbụl ruo ná ngwụcha na-esiri gị ike, i nwere ike ịmalite n’akwụkwọ Baịbụl ndị kacha atọ gị ụtọ. Ị chọọ ịmatakwu ụfọdụ ndị a na-anụkarị aha ha na Baịbụl, i nwere ike malite ịgụ gbasara ha. E nwere igbe dị n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka ma ị chọọ ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Isiokwu ya bụ “ Gụọ Gbasara Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Ka Ị Ghọtakwuo Baịbụl.” I nwekwara ike ịgụ Baịbụl n’isiokwu n’isiokwu ma ọ bụ otú ihe ndị a kọrọ na ya si mee. Gbalịa mee otu n’ime ihe ndị a ka ịgụ Baịbụl na-atọkwu gị ụtọ.

^ para. 4 Ọtụtụ ndị achọpụtala na a sụgharịrị Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke ọma, nakwa na ọ dị mfe ọgụgụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa n’ihe karịrị asụsụ otu narị na iri atọ. I nwere ike ịdanlodu ya na jw.org/ig ma ọ bụkwanụ na JW Library app. Ị chọọkwa nke e biri ebi, Ndịàmà Jehova nwere ike iwetara gị ya n’ụlọ gị.