Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nke 1 n'Afọ 2017

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA ỊGỤ BAỊBỤL NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?

Olee Otú Baịbụl Nwere Ike Isi Nyere M Aka ná Ndụ?

Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. Ihe e dere na ya bụ ihe Onye kere anyị kwuru ga-abara anyị uru. (2 Timoti 3:16) Ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị ezigbo aka. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) E nwere ụzọ abụọ dị mkpa Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ná ndụ. Otu bụ na ọ ga-eme ka ndụ anyị ka mma ugbu a. Nke abụọ abụrụ na ọ ga-enyere anyị aka ịmata Chineke na ihe ndị o kwuru ọ ga-emere anyị.—1 Timoti 4:8; Jems 4:8.

Otú ọ ga-esi eme ka ndụ gị ka mma ugbu a. Baịbụl ga-abara gị ezigbo uru. O kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka n’ihe ndị a na-esonụ:

E nwere otu di na nwunye bi n’Eshia ihe ha gụtara na Baịbụl baara ezigbo uru. Aha ha bụ Vicent na Annalou. Mgbe ha lụrụ ọhụrụ, o siiri ha ike ịghọta ibe ha, nakwa ịna-agwa ibe ha obi ha, otú ahụ ọ na-adị ọtụtụ ndị lụrụ ọhụrụ. Ma, ha bidoro mewe ihe ha na-agụta na Baịbụl. Olee uru ọ baara ha? Vicent kwuru, sị: “Ihe ndị m gụrụ na Baịbụl enyerela m aka iji obiọma na-edozi nsogbu mụ na nwunye m na-enwe. O nyekwarala anyị aka ịna-ebi n’udo.” Annalou, nwunye ya kwetara ihe a di ya kwuru. Ọ sịrị: “Ịgụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl fere Chineke nyeere anyị aka. Obi na-atọ m ụtọ ugbu a maka otú mụ na di m si biri n’udo, nakwa maka ihe anyị ji ndụ anyị na-eme.”

Ịmata Chineke. Vicent kwukwara uru ọzọ ịgụ Baịbụl baara ya. Ọ sịrị: “Ịgụ Baịbụl emeela ka mụ na Jehova dịrị ná mma ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.” Ihe a Vicent kwuru na-egosi na Baịbụl na-enyere anyị aka ịmata Chineke nke ọma. Ọ bụrụ na ị mata Chineke nke ọma, ime ihe o kwuru ga na-abara gị uru, gị na ya ga-abụkwa enyi. Ị ga-achọputa na ọ gwara anyị na ọ ga-emere anyị ọtụtụ ihe ọma  n’ọdịnihu. N’oge ahụ, anyị ga-adị ‘ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Timoti 6:19) E nweghị akwụkwọ ọzọ nwere ike ịkọrọ anyị ihe ndị a ma e wezụga Baịbụl.

Ọ bụrụ na i bido gụwa Baịbụl ma nọgide na-agụ ya, ọ ga-eme ka ndụ gị ka mma ugbu a, gị amatakwa Chineke. Ma ka ị na-agụ Baịbụl, i nwere ike inwe ọtụtụ ihe ga-agbagwoju gị anya ị ga-achọ ịjụ ajụjụ gbasara ya. Ọ bụrụ na i nwee ajụjụ, ihe otu nwoke onye Itiopia dịrị ndụ ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga mere nwere ike inyere gị aka. O nwere ọtụtụ ajụjụ gbasara ihe ọ gụtara na Baịbụl. Mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Filip, jụrụ ya ma ọ̀ ma ihe ihe ọ na-agụ pụtara, ọ sịrị: “Olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?” * O kwetaziri ka Filip, bụ́ onye ma Baịbụl nke ọma nyere ya aka ịghọta ihe ọ na-agụ. (Ọrụ Ndịozi 8:30, 31, 34) Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịmụtakwu Baịbụl, gaa na jw.org/ig pịa ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl,” dejuo fọm dị ebe ahụ. I nwekwara ike iji adres anyị dị n’Ụlọ Nche a detara anyị akwụkwọ ozi. Jiri nke kacha dị nso n’ebe i bi deta ya. I nwekwara ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ na ị ga-achọ ka a bịa mụwara gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị agaa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị dị gị nso. Gbalịa bido taa gụwa Baịbụl ka o nyere gị aka ime ka ndụ gị ka mma.

Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu, biko lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Ị ga-ahụ vidio a ma ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO, pịzie BAỊBỤL.

^ para. 8 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka, gaa na jw.org/ig. Pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.

^ para. 11 Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mmadụ Ịghọtahie Ihe Baịbụl Kwuru, Ọ̀ Bụ Obere Ihe?” Ọ dị n’Ụlọ Nche a.