Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Disemba 2015

Pita Ọ̀ Bụ Poopu Mbụ?

Pita Ọ̀ Bụ Poopu Mbụ?

“A họpụtala Cardinal Jorge Mario Bergoglio, S.J. ka ọ bụrụ Poopu nke 265 na-anọchite anya Pita.”—VATICAN INFORMATION SERVICE, VATICAN CITY, MARCH 13, 2013.

“Ihe Bishọp nke Rome jiri bụrụ Onyisi nke Nzukọ Katọlik bụ maka na: Ọ nọchiri anya Pita dị asọ, Onye Kristi mere onyisi mbụ nke Nzukọ.”—KATIKIZIM NKE OKWUKWE NZUKỌ KATỌLIK N’ASỤSỤ IGBO, EASTER EDITION 1996.

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo . . . na Poopu anọchighị anya Pita dị́ nsọ n’okwu gbasara ịbụ onyeisi nke nzukọ, a ga-ewere onye ahụ ka onye na-ekweghị ekwe.”—KANSỤL VATIKAN NKE MBỤ, JULAỊ 18, 1870.

N’ỤWA niile, ọtụtụ nde ndị Katọlik weere ihe a Kansụl Vatikan nke Mbụ kpebiri ka ozizi chọọchị onye òtù ha ọ bụla ga-anabatarịrị. Ma ajụjụ bụ, ihe a ha kpebiri ọ̀ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru? Ajụjụ ọzọkwa bụ, Poopu Francis ọ̀ nọchiri anya Pita onyeozi n’eziokwu? Pita ọ̀ bụdị poopu mbụ?

“N’ELU OKWUTE A KA M GA-ARỤKWASỊ NZUKỌ M”

Kansụl Vatikan nke Mbụ e nwere n’afọ 1870 gbakwasịrị ụkwụ n’otú ha si ghọta Matiu 16:16-19 na Jọn 21:15-17 kpebie ihe ahụ ha kpebiri. Ihe Jizọs na Pita kparịtara n’amaokwu Baịbụl ndị a nakwa n’amaokwu ndị ọzọ gosiri na e nwere ọrụ pụrụ iche Pita rụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Mgbe mbụ Jizọs na Pita hụrụ, Jizọs gwara ya na ọ ga-emecha nwee àgwà ndị ga-egosi na o siri ike ka nkume. (Jọn 1:42) Ma, Kraịst ò kwuru na Pita ga-abụ onyeisi n’ọgbakọ ya?

Na Matiu 16:17, 18, Jizọs gwara Pita, sị: “Agwa m gị, ngị bụ Pita, [onye aha ya pụtara “Iberibe Nkume,”] n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m.” * Ihe Jizọs na-ekwu ebe a ọ̀ bụ na a ga-arụkwasị “nzukọ” ya, ma ọ bụ ọgbakọ ya, n’elu otu nwoke a na-akpọ Pita? Ọ̀ pụtara na Pita ga-abụ onyeisi ndị ọzọ niile na-eso ụzọ Jizọs? Olee otú ndịozi ndị ọzọ nọ́ mgbe Jizọs kwuru ihe a si ghọta ihe o kwuru? Mgbe Jizọs kwuchara ihe ahụ, Oziọma Matiu, Mak, na Luk, kọọrọ anyị banyere oge dị iche iche ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrịtara ụka gbasara onye kacha n’etiti ha. (Matiu 20:20-27; Mak 9:33-35; Luk 22:24-26) Ọ bụrụ na ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara na Pita bụ onyeisi ndịozi ya, ma ọ bụ na ọ bụ ya kacha ha dum, hà ka ga na-arụrịta ụka gbasara onye kacha n’etiti ha?

Olee otú Pita n’onwe ya si ghọta ihe ahụ Jizọs kwuru? Ebe Pita bụ onye Izrel, ọ ga-abụ na ọ ma amụma dị iche iche kwuru gbasara “okwute” ma ọ bụ “okwute nnukwu isi ụlọ.” (Aịzaya 8:13, 14; 28:16; Zekaraya 3:9) Mgbe Pita na-edegara ndị kwere  ekwe ibe ya akwụkwọ ozi ma kwuo ihe otu n’ime amụma ndị ahụ kwuru, ọ kọwara na onye e buru n’amụma na ọ ga-abụ “nkume ntọala” bụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Mesaya. Ọ bụ naanị Kraịst ka Pita kpọrọ n’asụsụ Grik, pe’tra (nke bụ́ otu mkpụrụ okwu ahụ Jizọs kwuru mgbe o kwuru ihe ahụ dị́ na Matiu 16:18).—1 Pita 2:4-8.

Pọl onyeozi bụ onye ọzọ ji obi ya niile soo ụzọ Jizọs. Pọl ò kweere na Jizọs kwuru na Pita bụ onyeisi ọgbakọ ya? Pọl ma na Pita abụghị obere mmadụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. O dere na Pita so ná ndị “a na-asọpụrụ dịka ógìdì.” Pọl ma na e nwere ihe karịrị otu “ógìdì.” (Ndị Galeshia 2:9) Ihe ọzọkwa bụ na a sị na Jizọs họpụtara Pita ka ọ bụrụ onyeisi ọgbakọ ya, olee ihe mere na ọ bụghị naanị ya ka ndị kwere ekwe ibe ya na-asọpụrụ dị ka ogidi, kama, ha ana-asọpụrụ ya na ndị ọzọ dị ka ogidi?

O nwere otu oge Pita mesoro ndị mmadụ ihe otú na-ekwesịghị ekwesị. Pọl dere otú o si medaa obi gwa Pita okwu hoo haa. Ọ sịrị: “Agwara m ya okwu n’ihu n’ihina ihe o mere adịghị mma.” (Ndị Galeshia 2:11-14) Pọl echeghị na Kraịst wukwasịrị nzukọ ya, ma ọ bụ ọgbakọ ya, n’elu Pita ma ọ bụkwanụ mmadụ ọ bụla ọzọ n’ezughị okè. Kama, o kweere na ọ bụ n’elu Jizọs Kraịst, bụ́ ntọala, ka e wukwasịrị ọgbakọ Kraịst. Pọl kwuru na “okwute ahụ bụ Kristi.”—1 Ndị Kọrịnt 3:9-11; 10:4.

“NGỊ BỤ PITA . . .”

Jizọs gwara Pita, sị: “Ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m.” Olee ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara? Tupu anyị aghọta ihe ọ pụtara, anyị kwesịrị ịmata ihe ha na-ekwu tupu ya ekwuo ya. Gịnị ka Jizọs na Pita nọ na-ekwu? Jizọs ka jụchara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye ka ụnụ na-ekwu na m bụ?” Pita egbughị oge zaa ya, sị: “Ị bụ Kristi, nwa nke Chukwu dị ndụ.” Jizọs jara Pita mma maka ihe a ọ zara. Ọ gwaziri Pita na ya ga-ewukwasị “nzukọ” ya, ma ọ bụ ọgbakọ ya, n’elu “okwute” nke kadị sie ike, ya bụ, Jizọs n’onwe ya, onye Pita kwuru ihe gosiri na o nwere okwukwe na ya.—Matiu 16:15-18.

Jizọs gwara Pita, sị: “Ngị bụ Pita, n’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m.” Olee ihe ihe a Jizọs kwuru pụtara?

 Ọtụtụ ndị a na-akpọ “Ndị Nna Chọọchị” n’oge ochie dekwara na ọ bụ Kraịst bụ okwute ahụ e kwuru gbasara ya na Matiu 16:18. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka n’afọ 450, Augustine dere, sị: “Onyenwe anyị sịrị: ‘N’elu okwute a ka m ga-arụkwasị nzukọ m,’ n’ihi na Pita gwara ya, sị: ‘Ị bụ Kristi, nwa nke Chukwu dị ndụ.’ Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ n’elu okwute a Pita kwuru na o kweere na ya, ka Kristi ga-arụkwasị nzukọ ya.” Augustine kwuru ugboro ugboro na “Kristi bụ okwute ahụ (ma ọ bụ Petra).”

Ọ bụrụ ugbu a ka Augustine na ndị ọzọ kwuru ihe a, ndị Katọlik ga-ewere ha ka ndị na-ekweghị ekwe. Onye Swizaland aha ya bụ Ulrich Luz, bụ́ ọkà mmụta n’ihe banyere okpukpe, kwudịrị na a sị na ọ bụ n’oge Kansụl Vatikan e nwere n’afọ 1870 ka ndị ọkà mmụta Baịbụl taa kwuru na Pita abụghị okwute ahụ Jizọs kwuru okwu ya, ndị kansụl ahụ ga-ewere ha ka ndị na-ekweghị ekwe.

POOPU Ọ̀ NỌCHIRI ANYA PITA?

O nweghị onye a na-akpọ “poopu” n’oge Pita onyeozi. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị bishọp na-abụghị ndị Rom kpọgidere onwe ha poopu ruo n’agbata afọ 801 na afọ 900. Ọ na-esikwa ike ịhụ onye ọ bụ naanị ya ka a na-akpọ poopu n’ihi ọkwa o nwere na chọọchị ruo ihe dị ka n’afọ 1060. Ihe ọzọkwa bụ na o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị mbụ soro ụzọ Kraịst chere na Pita bụ onyeisi nzukọ Kraịst otú ahụ ụfọdụ na-ekwu, ma ya fọzie iche na o nwere onye nọchiri ya. Ọ bụ ya mere onye Jamanị aha ya bụ Martin Hengel, bụ́ ọkà mmụta, ji kwuo na “ma n’akụkọ ihe mere eme ma n’akwụkwọ ọ bụla kwuru gbasara ndị na-efe Chineke, o nwebeghị ihe gosiri n’eziokwu na poopu e mechara na-ahọpụta ka ọ bụrụ ‘onyeisi nzukọ’ Katọlik dabara adaba.”

Ugbu a anyị lebacharala anya n’isiokwu a, Pita ọ̀ bụ poopu mbụ? Ò nwere ndị na-anọchi ya? Akwụkwọ Nsọ ọ̀ kwadoro nhọpụta ndị Katọlik na-ahọpụta poopu, sị na ọ bụ onyeisi ha? Azịza ajụjụ ndị a niile bụ mba. Ma, o doro anya na Jizọs rụkwasịrị nzukọ ya, ya bụ, ezigbo ọgbakọ ya, n’elu onwe ya. (Ndị Efesọs 2:20) Ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịziri ịjụ onwe ya ugbu a bụ, Ànọ m n’ezigbo ọgbakọ ahụ?

^ para. 8 Amaokwu Baịbụl niile e dere ihe ha kwuru n’isiokwu a si na Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik, ebe ọ bụ Baịbụl ndị Katọlik na-agụ n’ebe anyị.