Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2015

È Nwere Mgbe A Na-agaghịzi Enwe Ndị Ihu Abụọ?

È Nwere Mgbe A Na-agaghịzi Enwe Ndị Ihu Abụọ?

E NWERE otu nwaanyị aha ya bụ Panayiota. O toro n’agwaetiti dị́ na Mediterenian. O bidoro inwe mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ ka na-eto eto. O mechara ghọọ odeakwụkwọ nke otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị́ n’ime obodo ebe o bi. Ọ na-agadị n’ụlọ n’ụlọ na-achọ ndị ga-eji ego akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ. Ma, ihe a niile mechara gwụ ya ike. Ọ chọpụtara na n’agbanyeghị na onye ọ bụla nọ́ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ na-akpọ ibe ya enyi ọma m, ha na-emelara ndị ikwu ha ihe, na-achọ ịnọ n’isi mgbe niile, na-enwere ibe ha anyaụfụ, e nweekwa ndị kwe na ndị ekweghị.

Otu nwoke onye Ayaland aha ya bụ Daniel toro n’ezinụlọ jí okpukpe kpọrọ ihe. Ma, ọ na-ewute ya ma o cheta otú ndị ụkọchukwu ha si eme ihu abụọ. Ha na-aṅụbiga mmanya okè, na-agba chaa chaa, na-ezuru ego ndị mmadụ nyere n’onyinye, ma, ha na-akụziri ya na ndị mere ihe ọjọọ ga-aga ọkụ mmụọ.

Otu nwoke aha ya bụ Jeffery rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ n’ụlọ ọrụ ndị na-eji ụgbọ mmiri ebuga ngwá ahịa n’ebe dị iche iche. Ụlọ ọrụ ndị a dị na Briten na Amerịka. Nwoke a na-echeta otú ndị ahịa na ndị na-agba ọsọ ahịa si egwu ndị gọọmenti wayo. O nweghị ụdị ụgha ha na-anaghị agha iji hụ na e nyere ụlọ ọrụ ha ọrụ.

Ọ dị mwute na ndị ihu abụọ juru ebe niile taa, ma n’ọchịchị ma n’okpukpe ma n’azụmahịa. Ná mmalite, onye ndị Grik na-akpọ “onye ihu abụọ” bụ onye na-ejikarị ejiji ka mmọnwụ na-eme ihe nkiri ma ọ bụ na-agwa ọhaneze okwu. Ma ka oge na-aga, ndị mmadụ malitere ịkpọ onye na-eduhie ndị ọzọ ma ọ bụ onye na-erigbu ha onye ihu abụọ.

Onye ihu abụọ na-akpasu ndị ọzọ iwe, na-emekwa ka ha na-eburu ya iwe n’obi. Ndị o megburu nwere ike ịjụwa, sị: “Ò nwedịrị mgbe a na-agaghịzi enwe ndị ihu abụọ?” Obi dị anyị ụtọ na Okwu Chineke kwuru ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na e nwere mgbe ndị ihu abụọ na-agaghịzi adị.

OTÚ CHINEKE NA ỌKPARA YA SI ELE IME IHU ABỤỌ ANYA

Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụghị ụmụ mmadụ bidoro ime ihu abụọ, kama, ọ bụ otu mmụọ a na-akpọ Ekwensu na Setan. Mgbe e kere mmadụ, Ekwensu ji agwọ bịakwute Iv bụ́ nwaanyị mbụ. O mere ka ò bu ọdịmma ya n’obi ka o nwee ike iduhie ya. (Jenesis 3:1-5) Si mgbe ahụ gawa, ọtụtụ ndị mmadụ na-emekwa ka hà bụ ihe ha na-abụghị iji duhie ndị ọzọ ma ọ bụ rigbuo ha.

 Mgbe ndị Izrel oge ochie malitere na-ekpere arụsị, na-emekwa ka hà na-efe Chineke, Chineke dọrọ ha aka ná ntị ugboro ugboro banyere ihe ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha agbanweghị. Jehova Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto, ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ.” (Aịzaya 29:13) Mgbe ndị Izrel jụrụ ịgbanwe, Chineke kwere ka mba ndị ọzọ bịa bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya. Ndị Babịlọn bịara bibie ya nke mbụ n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. E mechaa, ndị Rom abịa bibie ya kpamkpam n’afọ 70. O doro anya na Chineke anaghị agba ndị ihu abụọ nkịtị ruo ebighị ebi.

Ma, Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ji ndị na-akwụwa aka ha ọtọ na ndị na-ekwu eziokwu kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs malitere ije ozi n’ụwa, otu nwoke aha ya bụ Nataniel bịakwutere ya. Mgbe Jizọs hụrụ ka ọ na-abịa, o kwuru, sị: “Lee onye Izrel n’ezie, onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.” (Jọn 1:47) Nataniel, onye a na-akpọkwa Batọlọmiu mechara bụrụ otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs.—Luk 6:13-16.

Jizọs so ndị na-eso ụzọ ya nọrịa ọtụtụ oge, ọ kụzikwaara ha otú Chineke si ele ihe anya. Ọ gwara ha na ha ekwesịghị ịbụ ndị ihu abụọ. Ọ katọrọ ndị isi okpukpe na-eme ihu abụọ n’oge ahụ. Ka anyị lee ụfọdụ ihe ndị o kwuru gbasara ha.

Ha na-eme “ezi omume” ka ndị mmadụ hụ ha. Jizọs gwara ndị ọ na-akụziri ihe n’otu oge, sị: “Lezienụ anya nke ọma ka unu ghara ịdị na-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu . . . dị nnọọ ka ndị ihu abụọ na-eme.” Ọ gwakwara ha ka ha na-enye onyinye ebere “na nzuzo” ma ọ bụ otú na-agaghị eme ka ndị mmadụ na-eto ha. Ha kwesịrị ikpe ekpere na nzuzo, ọ bụghị ikpe ya ka ndị mmadụ hụ na ha na-ekpe ekpere. Ha na-eme ihe ndị a, ọ ga-egosi na ofufe ha na-efe Chineke si ha n’obi, Chineke ga-agọzikwa ha.—Matiu 6:1-6.

Ọ naghị ara ahụ́ ha akatọwa mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ntụhie dị n’anya nke gị, mgbe ahụ ka ị ga-ahụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.” (Matiu 7:5) Ọ bụrụ na mmadụ na-ahụtakarị ebe ndị ọzọ mejọrọ ihe mgbe onye ahụ n’onwe ya na-emejọ ihe karịa ndị ahụ, ọ na-eme onwe ya ka o yie ihe ọ na-abụghị. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na “mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.”—Ndị Rom 3:23.

Ha na-ebu ihe ọjọọ n’obi. O nwere mgbe ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na ndị òtù Herọd bịakwutere Jizọs ka ha jụọ ya ajụjụ gbasara ịtụ ụtụ isi. Ha ji ire ụtọ gwa Jizọs, sị: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu eziokwu, ị na-ezikwa ụzọ Chineke n’eziokwu.” Ha jụziri ya ajụjụ iji mata ya n’ọnyà. Ha jụrụ ya, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?” Jizọs sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-ele m ule, ndị ihu abụọ?” Ndị ihu abụọ a Jizọs kpọrọ ha kwesịịrị ha n’ihi na ihe bụ mkpa ha abụghị ka Jizọs gwa ha ihe ha ga-eme, kama, ha na-achọ otú ha ga-esi “jide ya site n’okwu ọnụ ya.”—Matiu 22:15-22.

Ezigbo Ndị Kraịst nwere “ịhụnanya nke si n’obi dị ọcha, n’ezi akọ na uche nakwa n’okwukwe nke na-abụghị nke ihu abụọ.”—1 TIMOTI 1:5

Ma, ọgbakọ Ndị Kraịst a malitere na Pentikọst afọ 33 dị iche. Ndị nọ́ n’ọgbakọ a na-ekwu eziokwu, na-akwụwakwa aka ha ọtọ. Ndị Kraịst ahụ gbara ezigbo mbọ ka ha ghara ịna-eme ihu abụọ. Dị ka ihe atụ, otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs, aha ya bụ Pita, gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘na-erube isi n’eziokwu ahụ nke mere ka ha nwee ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ.’ (1 Pita 1:22) Pọl onyeozi gbakwara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha nwee “ịhụnanya nke si n’obi dị ọcha, n’ezi akọ na uche nakwa n’okwukwe nke na-abụghị nke ihu abụọ.”—1 Timoti 1:5.

IKE OKWU CHINEKE NA-AKPA

Ihe Jizọs na ndịozi ya kụziiri ndị mmadụ, nke e dekwara na Baịbụl, na-akpa ike taa otú ahụ ọ kpara n’oge ahụ. Pọl onyeozi kwuru gbasara ya, sị: “N’ihi na okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla,  ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ọtụtụ ndị akwụsịla ịna-eme ihu abụọ, na-akwụwazi aka ọtọ ma na-ekwu eziokwu, n’ihi na ha amụọla Baịbụl, na-agbalịkwa eme ihe ndị ha mụtara. Ka anyị lebakwuo anya n’akụkọ mmadụ atọ ahụ anyị kwuru okwu gbasara ha ná mmalite isiokwu a.

Panayiota kwuru, sị: “M hụrụ otú ha si egosi ibe ha ezigbo ịhụnanya na otú ha si eche gbasara ibe ha”

Mgbe Ndịàmà Jehova gwara Panayiota ka ọ bịa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ya agaakwa, ọ hụrụ na ha dị iche. Ọ chọpụtara na ha anaghị eme ezi omume ka ndị mmadụ hụ ha. O kwuru, sị: “M hụrụ otú ha si egosi ibe ha ezigbo ịhụnanya na otú ha si eche gbasara ibe ha. Ọ dịghị ka ihe m nọ na-ahụ kemgbe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.”

Panayiota bidoro iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. O mekwara baptizim afọ iri atọ gara aga. O kwuru, sị: “Ndụ m nwere isi ugbu a m na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ bụghị mgbe ahụ m na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-achọ ndị ga-akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị m nọ na ya. Alaeze Chineke bụ naanị ọchịchị ga-emeli ka a gharazie inwe ndị ihu abụọ n’ụwa a.”

Daniel kwuru, sị: “Achọghị m ime ka Ndị Kraịst ibe m na-eche na m bụ ihe m na-abụghị”

Daniel mechakwara ghọọ Onyeàmà Jehova, e nyekwa ya ọrụ dị iche iche ọ na-arụrụ ọgbakọ. Ma, mgbe afọ ole na ole gara, o mere ihe na-adịghị mma, akọnuche ya enyewa ya nsogbu. O kwuru, sị: “Mgbe m chetara otú o si na-ewute m na ndị nọ́ na chọọchị m na-agabu na-eme ihu abụọ, m kpebiri ịkwụsị ịrụ ọrụ niile ahụ m na-arụrụ ọgbakọ n’ihi na m ma na erughịzi m eru ịrụ ha. Achọghị m ime ka Ndị Kraịst ibe m na-eche na m bụ ihe m na-abụghị.”

Daniel mechara gbanwee, mewe ihe dị́ mma, jirikwa obi ụtọ bidoghachi ịrụrụ ọgbakọ ọrụ n’ihi na akọnuche ya anaghịzi ama ya ikpe. Otú a ka ndị na-efe Chineke si akwụwa aka ha ọtọ. Ha anaghị eme ihu abụọ. Ha na-ebu ụzọ “wepụ ntụhie” dị́ n’anya ha, tupu ha achọwa otú ha ga-esi “wepụ irighiri ahịhịa” dị́ n’anya nwanna ha.

Jeffery kwuru, sị: “M chọpụtara na ekwesịghịzi m ịna-agha ụgha iji hụ na e nyere ụlọ ọrụ anyị ọrụ. Ihe m gụtara na Baịbụl, . . . metụrụ m n’ahụ́”

Jeffery, onye jibu oge ya niile chụọ ego, kwuru, sị: “Mgbe m bịara na-amụ Baịbụl, m chọpụtara na ekwesịghịzi m ịna-agha ụgha iji hụ na e nyere ụlọ ọrụ anyị ọrụ. Ihe m gụtara na Baịbụl, dị ka n’akwụkwọ Ilu 11:1, metụrụ m n’ahụ́. Ebe ahụ kwuru na ‘ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke gbara mkpị e ji aghọgbu mmadụ bụ ihe arụ n’anya Jehova.’” Jeffery adịghị ka ndị ahụ jụrụ Jizọs ajụjụ gbasara ịtụ ụtụ isi. Ọ ghọtara na ya ekwesịghị ịghọgbu ma Ndị Kraịst ibe ya ma ndị ọzọ.

Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-agba mbọ eme ihe ha mụtara na Baịbụl. Ha na-agbasi mbọ ike “iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:24) Gbalịa ka ị mata ndị Ndịàmà Jehova bụ, ihe ndị ha kweere nakwa otú ha ga-esi nyere gị aka ịmata gbasara ụwa ọhụrụ Chineke kwere nkwa ya. Ndị ‘ezi omume ga-ebi n’ime’ ụwa ọhụrụ ahụ, a gaghịkwa enwe ndị ihu abụọ.—2 Pita 3:13.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?

Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Gịnị na gịnị ka ị ma banyere anyị?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.