Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2015

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ndị Juu hà “si ná mba niile dị n’okpuru eluigwe” bịa Jeruselem na Pentikọst afọ 33?

Okporo ámá ndị mmadụ juru na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst Afọ 33

E wezụga ihe Baịbụl kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:5-11 gbasara ìgwè mmadụ bịara Jeruselem na Pentikọst afọ 33, Faịlo, bụ́ otu nwoke onye Juu na-ede akwụkwọ n’oge ndịozi Jizọs, dekwara otú o si mee.

Faịlo dere, sị: “Mgbe ọ bụla ndị Juu na-eme ememme ha na Jeruselem, imirikitiimi ndị mmadụ na-esi n’ọtụtụ obodo abịa, ma n’ebe ọwụwa anyanwụ ma n’ebe ọdịda anyanwụ, ma n’ebe ugwu ma n’ebe ndịda. Ụfọdụ na-esi n’okporo ụzọ abịa, ndị ọzọ na-eji ụgbọ mmiri abịa.” O kwukwara ihe e dere n’akwụkwọ ozi Agrịpa nke Mbụ, bụ́ nwa nwa Herọd Onye Ukwu, degaara Kaligula, bụ́ eze ukwu Rom. N’akwụkwọ ozi ahụ, Agrịpa dere, sị: “Obodo Nsọ [ya bụ, Jeruselem] . . . abụghị naanị isi obodo Juda, kama, ọ bụkwa nke ọtụtụ mba ndị ọzọ, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị Juu kwagara ná mba ndị dị́ nso na Juda.”

Agrịpa dere aha obodo ndị ọzọ ndị Juu gara biri na ya. Ụfọdụ n’ime ha dị ezigbo anya ma e si Jeruselem gawa ya, dị ka Mesopotemia, ebe ugwu Afrịka, Eshia Maịnọ, Gris na agwaetiti ndị dị na Mediterenian. Otu ọkà mmụta aha ya bụ Joachim Jeremias kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na e deghị na ndị Juu bí n’obodo ndị ahụ na-aga Jeruselem, ọ ga-abụrịrị na ha na-aga, n’ihi na iwu ji nwa afọ Juu ọ bụla torurula ihe e ji mmadụ eme ịga ememme ndị Juu na-eme na Jeruselem.”—Diuterọnọmi 16:16.

Olee otú ọtụtụ puku ndị na-abịa Jeruselem maka ememme ndị Juu si enweta ụlọ ha na-ehi?

Otu n’ime ebe ndị a na-anọbu asa ahụ́ na Jeruselem

A na-emekarị ememme atọ kwa afọ na Jeruselem. Ememme ndị ahụ bụ, Ememme Ngabiga, Ememme Pentikọst na Ememme Ụlọ Ndò. N’oge ndịozi Jizọs, ọtụtụ puku mmadụ na-esi n’ebe dị iche iche n’Izrel nakwa n’obodo ndị ọzọ ndị Juu bi abịa Jeruselem maka ememme ndị a. (Luk 2:41, 42; Ọrụ Ndịozi 2:1, 5-11) Ndị a niile na-esi esi abịa Jeruselem na-achọta ụlọ ha ga-ehi.

Ụfọdụ ndị na-aga na nke ndị enyi ha hie, ndị ọzọ na-ehi n’ụlọ a rụrụ maka ndị njem. Ọtụtụ ndị na-ama ụlọikwuu na Jeruselem ma ọ bụ n’akụkụ mgbidi ya. Na nke ikpeazụ Jizọs gara Jeruselem, ọ gara hie na Betani, bụ́ obodo dị́ nso na Jeruselem.Matiu 21:17.

E nwere ụfọdụ ụlọ nwechara ebe ndị a na-anọ asa ahụ́ a hụrụ n’akụkụ ụlọ nsọ ahụ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe mere e ji rụọ ụlọ ndị ahụ bụ ka ndị si esi bịa Jeruselem nwee ebe ha ga-asa ahụ́, dị́ ọcha, tupu ha abanye n’ụlọ nsọ. Otu ihe e dere n’ahụ́ otu n’ime ụlọ ndị ahụ gosiri na ọ bụ Tiodotọs, bụ́ onye nchụàjà na onye ndú nke ụlọ nzukọ e nwere ebe ahụ, “rụrụ ụlọ nzukọ ahụ ka a na-anọ na ya agụ Tora . . . rụọkwa ụlọ ndị njem, nke nwere ọnụ ụlọ dị́ iche iche, gbapuokwa mmiri maka ndị njem ga-ehi n’ụlọ ndị ahụ.”