Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Disemba 2015

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Olee Ihe Dị́ Njọ n’Ịgba Krismas?

Olee Ihe Dị́ Njọ n’Ịgba Krismas?

Ọ dịla anya ndị mmadụ kwuwere na Krismas bụ ememme Ndị Kraịst ji echeta ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ma, ọtụtụ ihe a na-eme ma a gbawa Krismas na-eme ka anyị chewe otú Krismas si gbasa ụbọchị a mụrụ Jizọs.

E nwere ihe a kọrọ gbasara otú e si malite inwe onye a na-akpọ Fada Krismas n’oge a na-agba Krismas. N’afọ 1931, otu ụlọ ọrụ dị́ n’Ebe Ugwu Amerịka, nke na-emepụta ihe ọṅụṅụ, ji Fada Krismas kpọsaa ngwá ahịa ha n’oge a na-agba Krismas. Onye ha ji mee Fada Krismas ahụ yi uwe na-acha ọbara ọbara, nwee nnukwu afụ ọnụ na-acha ọcha, ntì ya na-achakwa ọbara ọbara. N’agbata afọ 1951 na afọ 1959, ụfọdụ ndị Brazil gbara mbọ ka ndị mmadụ na-enwe onye ga na-emere ha Grandpa Indian, bụ́ nke ndị ebe ha na-eme n’oge Krismas, kama, inwe Fada Krismas. Mbọ a ha gbara ò nwere isi? Otu prọfesọ aha ya bụ Carlos E. Fantinati kwuru na Fada Krismas bịara wuwe ewuwe karịa Grandpa Indian, “karịakwa nwa ọhụrụ a na-akpọ Jizọs, sízie otú ahụ ghọọ ihe e ji mara Disemba 25.” Ma, ihe ndị a a na-akọ gbasara otú Fada Krismas si malite ọ̀ gwụla ihe mere o ji dị njọ ịgba Krismas? Iji mata azịza ya, ka anyị tụlee ihe mere n’oge ndị mbụ soro ụzọ Kraịst.

Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopedia Britannica kwuru na malite n’oge ndịozi Jizọs ruokwa n’ihe dị ka narị afọ abụọ Jizọs nwụchara, Ndị Kraịst ekweghị ka a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha ma ọ bụkwanụ ka a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ Jizọs. Gịnị mere Ndị Kraịst n’oge ahụ ji jụ? Ọ bụ maka na ha weere na ememme ụbọchị ọmụmụ bụ ememme ndị na-ekpere arụsị, nke ha na-ekwesịtụdịghị ime. O nweghịdị ebe Baịbụl kpọrọ aha ụbọchị a mụrụ Jizọs.

N’agbata afọ 301 na afọ 400, ndị Katọlik bidoro ịgba Krismas n’agbanyeghị na ndị mbụ soro ụzọ Kraịst emeghị ememme ụbọchị ọmụmụ. Ha bidoro ịgba Krismas n’ihi na ha chọrọ ka ndị na-abịa chọọchị ha hikwuo nne. Ha chọkwara ka ọtụtụ ndị Rom na-ekpere arụsị hapụ ememme dị iche iche ha na-eme n’oge oyi. Otu akwụkwọ a na-akpọ Christmas in America, nke Penne L. Restad dere, kwuru na n’afọ ọ bụla, malite n’abalị iri na asaa n’ọnwa Disemba ruo n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị, “ọtụtụ ndị Rom na-eme oriri na nkwari, na-egwu egwuregwu, na-agbagharị n’okporo ụzọ agụ egwu, na-emekwa ememme ndị ọzọ ha ji akwanyere chi ha dị iche iche ùgwù.” N’abalị iri abụọ n’ise n’ọnwa Disemba, ndị Rom na-eme ememme ncheta ọmụmụ chi ha a na-akpọ chi anyanwụ a na-apụghị imeri emeri. Ndị chọọchị Katọlik wepụtakwara otu ụbọchị ahụ maka ịna-agba Krismas. Ọ bụ ya mere ha ji nweta ọtụtụ ndị Rom malitere iso ha na-eme ememme ncheta ọmụmụ Jizọs kama ịna-eme nke anyanwụ. N’otu akwụkwọ a kpọrọ Santa Claus, a Biography, nke Gerry Bowler dere, e kwuru na ndị Rom “ka na-emekwa ememme ndị ahụ ha na-eme n’oge oyi.” Ihe ọ pụtara bụ na “a gbanwere aha ememme ndị ahụ na-ekpere arụsị, ọ bụghị na ha kwụsịrị ime ha.”

O doziri anya ugbu a na ihe kacha dịrị njọ n’ịgba Krismas bụ na ihe ndị a na-eme n’oge a na-agba ya si n’aka ndị na-ekpere arụsị. N’otu akwụkwọ a na-akpọ The Battle for Christmas, nke Stephen Nissenbaum dere, e kwuru na Krismas bụ “ememme ndị ọgọ mmụọ e mere ka o yie ka ọ̀ bụ ememme Ndị Kraịst.” N’eziokwu, ndị na-agba Krismas na-akparị Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ihe a abụghị obere okwu n’ihi na Baịbụl jụrụ, sị: “Olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?” (2 Ndị Kọrịnt 6:14) Krismas dị ka osisi gbagọrọ agbagọ nke ‘a na-apụghị ime ka ọ kwụrụ ọtọ.’—Ekliziastis 1:15.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Krismas?

Otú ihe isii a na-eme n’oge Krismas si bido nwere ike iju gị anya.

AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Krismas?

Ọtụtụ ndị na-agba Krismas n’agbanyeghị na ha ma otú o si malite. Gụọ ihe a ka ị mata ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Krismas.