Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nọvemba 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ CHINEKE SI ELE ỊLỤ AGHA ANYA?

Otú Chineke Si Lee Ịlụ Agha Anya n’Oge Ochie

Otú Chineke Si Lee Ịlụ Agha Anya n’Oge Ochie

N’oge ochie, e nwere mgbe ndị Ijipt nọ na-echi ndị Izrel, bụ́ ndị Chineke, ọnụ n’ala. Ndị Izrel arịọ Chineke ọtụtụ ugboro ka o nyere ha aka, ma o nweghị ihe o mere ozugbo ahụ. (Ọpụpụ 1:13, 14) Ndị Izrel cheere ruo ọtụtụ afọ ka Chineke napụta ha n’aka ndị Ijipt. Chineke mechakwara gbatara ha ọsọ enyemaka. (Ọpụpụ 3:7-10) Baịbụl kwuru na Chineke n’onwe ya busoro ndị Ijipt agha. O ji ọtụtụ ihe otiti taa ndị Ijipt ahụhụ ma mechaa bibie eze ha na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie. (Abụ Ọma 136:15) Jehova Chineke lụchiteere ndị ya agha, sí otú ahụ gosi na ọ bụ “dike n’agha.”—Ọpụpụ 15:3, 4.

Ebe Chineke ji aka ya buso ndị Ijipt agha, o gosiri na ọ bụghị agha niile ka ọ kpọrọ asị. O nwekwara oge ndị ọ gwara ndị Izrel ka ha gaa agha. Dị ka ihe atụ, o nyere ha iwu ka ha buso ndị Kenan agha n’ihi na ha na-akpa arụ. (Diuterọnọmi 9:5; 20:17, 18) Ọ gwara Devid, bụ́ Eze Izrel, ka o buso ndị Filistia na-emegbu ha agha. Chineke gwadịrị Devid otú ọ ga-esi lụọ agha ahụ merie ndị iro ha.—2 Samuel 5:17-25.

Ihe ndị a Baịbụl kwuru gosiri na mgbe ndị ọjọọ chọrọ imemila ndị Izrel, Chineke gwara ndị Izrel ka ha buso ha agha, ka a ghara ibibi ndị na-efe ya. Ma, e nwere ihe atọ ọ dị mkpa ka ị mata gbasara agha ndị ahụ Chineke kwadoro.

  1. CHINEKE JI AKA YA KPEBIE NDỊ GA-AGA AGHA NDỊ AHỤ. O nwere mgbe Chineke gwara ndị Izrel, sị: “Unu agaghị alụ ọgụ na nke ugbu a.” Gịnị mere o ji gwa ha ihe a? Ọ bụ n’ihi na Chineke n’onwe ya ga-alụrụ ha agha ahụ. (2 Ihe E Mere 20:17; 32:7, 8) Ọ lụụrụ ha agha ọtụtụ ugboro, dị ka nke anyị kọrọ ná mbido isiokwu a. E nwekwara mgbe Chineke gwara ha ka ha gaa lụọ agha n’onwe ha iji nweta Ala Nkwa ahụ ma chebe ya.—Diuterọnọmi 7:1, 2; Jọshụa 10:40.

  2. CHINEKE JI AKA YA KPEBIE MGBE A GA-ALỤ AGHA NDỊ AHỤ. Tupu ndị Chineke ebuso ndị na-emegbu ha agha, ha na-echere ruo mgbe Chineke gwara ha mee otú ahụ. Ha ekwesịghị  ịga agha Chineke na-agwaghị ha gaa. Ha sie ọnwụ gaa, Chineke anaghị echebe ha. Baịbụl kwudịrị na mgbe ndị Izrel gara agha Chineke na-agwaghị ha gaa, ndị iro ha meriri ha. *

  3. Ọ bụ eziokwu na Chineke busoro ndị Kenan agha, ọ hapụrụ ụfọdụ n’ime ha ndụ, dị ka, Rehab na ndị ezinụlọ ha

    ỌNWỤ NDỊ MMADỤ, MA NKE NDỊ AJỌ OMUME, ANAGHỊ ATỌ CHINEKE ỤTỌ. Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ bụkwa ya kere ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụ ya mere na ọ chọghị ka ndị mmadụ na-anwụ anwụ. Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị ajọ mmadụ na-akpa nkata imegbu ndị ọzọ nakwa igbu ha egbu. (Abụ Ọma 37:12, 14) Ihe Chineke mere mgbe ụfọdụ iji mee ka ihe ọjọọ ahụ kwụsị bụ inye ndị ya iwu ka ha buso ndị ọjọọ ahụ agha. Ma, n’oge niile ahụ Chineke gwara ndị Izrel ka ha buso ndị na-emegbu ha agha, Chineke gosikwara ndị mmegbu ahụ na ọ “na-eme ebere” nakwa na ọ naghị “ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Abụ Ọma 86:15) Dị ka ihe atụ, o nyere ndị Izrel iwu na tupu ha ebuso obodo ọ bụla agha, ha ‘ga-agwa ha ihe ha ga-eme ka ha na ha wee mee udo,’ iji nye ndị bi n’obodo ahụ ohere ịgbanwe, ha agharazie ibuso ha agha. (Diuterọnọmi 20:10-13) Ihe a Chineke gwara ha gosiri na ‘ọnwụ onye ajọ omume adịghị atọ ya ụtọ, kama, ihe na-atọ ya ụtọ bụ ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya ma dịrị ndụ.’—Ezikiel 33:11, 14-16. *

N’ihe ndị a anyị tụlerela, anyị ahụla na n’oge ochie, Chineke lere ịlụ agha anya ka otú kwesịrị ekwesị isi kwụsị mmegbu na ihe ọjọọ. Ma, ọ bụ Chineke ji aka ya kpebie ndị ga-alụ agha ndị ahụ na mgbe ha ga-alụ ya, ọ bụghị ndị mmadụ. Ọ̀ bụ maka na ịkwafu ọbara na-agụ Chineke agụụ mere o ji lụọ agha ndị ọ lụrụ? Mbanụ. Ọ kpọrọ ime ihe ike asị. (Abụ Ọma 11:5) Chineke ọ̀ gbanwere otú o si ele ịlụ agha anya mgbe Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bidoro izisa ozi ọma n’ụwa?

^ para. 7 Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Izrel siri ọnwụ gaa buso ndị Amalek na ndị Kenan agha mgbe Chineke sịrị ha agala, e meriri ha. (Ọnụ Ọgụgụ 14:41-45) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Eze Josaya gara agha mgbe Chineke na-agwaghị ya gaa, agha ahụ ataa isi ya.—2 Ihe E Mere 35:20-24.

^ para. 8 Gịnị mere ndị Izrel agwaghị ndị Kenan ihe ha ga-eme ka ha na ha mee udo tupu ha ebuso ha agha? Ọ bụ n’ihi na o meela narị afọ anọ kemgbe e nyere ndị Kenan ohere ka ha gbanwee àgwà ọjọọ ha. N’oge ahụ ndị Izrel busoro ha agha, ndị Kenan akpọọla ekwo nkụ n’ihe ọjọọ ha na-eme. (Jenesis 15:13-16) Ọ bụ ya mere e ji kwesị ibibi ha kpamkpam. Ma, e nwere ụfọdụ ndị Kenan a hapụrụ ndụ n’ihi na ha chegharịrị.—Jọshụa 6:25; 9:3-27.