Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ CHINEKE SI ELE ỊLỤ AGHA ANYA?

Otú Chineke Si Lee Ịlụ Agha Anya n’Oge Ndịozi Jizọs

Otú Chineke Si Lee Ịlụ Agha Anya n’Oge Ndịozi Jizọs

N’oge ndịozi Jizọs, Alaeze Ukwu Rom nọ na-echi ndị Juu ọnụ n’ala. Ọ ga-abụ na ndị Juu ahụ kpere ekpere ọtụtụ ugboro otú ndị nna ha ochie kpere ka Chineke napụta ha n’aka ndị a na-emegbu ha. Ka oge na-aga, ha nụrụ banyere Jizọs. Ha nwere ike ịna-eche ma ọ̀ ga-abụnụ ya bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ha “nọ na-enwe olileanya na nwoke a bụ onye a kara aka ịnapụta Izrel” n’aka ndị Rom na-emegbu ha. (Luk 24:21) Ma, o nweghị onye napụtara ha. Kama nke ahụ, n’afọ 70, ndị agha Rom bịara bibie Jeruselem na ụlọ nsọ ya.

Gịnị kpatara ya? Olee ihe mere Chineke alụghịrị ndị Juu agha otú ahụ ọ lụụrụ ha n’oge ochie, ma ọ bụkwanụ gwa ha ka ha buso ndị iro ha agha ma nwere onwe ha? Chineke ọ̀ gbanweela otú o si ele ịlụ agha anya? Mba. Ma, o nwere ihe jọgburu onwe ya ndị Juu mere. Ha ekwetaghị na Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, bụ Mesaya. (Ọrụ Ndịozi 2:36) Ọ bụ ya mere Chineke ji jụ ha.—Matiu 23:37, 38.

Chineke kwụsịrị ichebe ndị Juu na Ala Nkwa ha. Ọ naghịzi akwado ha n’agha ndị ha na-aga. Jizọs kwuru na a ga-anapụ ha ngọzi ndị ha na-enwetabu mgbe ha na Chineke dị ná mma ma nye ya mba ọhụrụ Baịbụl mechara kpọọ “Izrel nke Chineke.” Ihe a Jizọs kwuru mezuru. (Ndị Galeshia 6:16; Matiu 21:43) Ọ bụ ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ ghọrọ Izrel nke Chineke. N’oge ndịozi Jizọs, a gwara ha, sị: “Ugbu a, unu bụ ndị Chineke.”—1 Pita 2:9, 10.

Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst nọ́ n’oge ahụ ghọrọ “ndị Chineke,” Chineke ọ̀ lụchiteere ha agha iji napụta ha n’aka ndị Rom na-emegbu ha, ma ọ bụkwanụ gwa ha ka ha buso ndị na-emegide ha agha? Mba. Maka gịnị? Maka na ọ bụ naanị Chineke na-ekpebi mgbe a ga-alụ agha ọ bụla ọ kwadoro dị ka anyị hụrụ n’isiokwu nke a na-esote. Chineke alụchiteghịrị Ndị Kraịst nọ n’oge ahụ agha, ọ gwaghịkwa ha gaa lụọ agha. O doro anya na oge ahụ abụghị oge Chineke chọrọ iji kwụsị ihe ọjọọ na mmegbu.

N’ihi ya, otú ahụ ndị ohu Chineke n’oge ochie cheere ka Chineke kwụsị ihe ọjọọ na mmegbu a na-emegbu ha, ka ndị mbụ soro ụzọ Kraịst ga-esikwa chere oge Chineke. Ka ọ dịgodị, Chineke agwaghị ha lụso ndị iro ha agha. Jizọs Kraịst mere ka nke a doo anya mgbe ọ na-akụzi ihe. Dị ka ihe atụ, ọ gwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-alụ agha, kama, ọ gwara ha, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) Mgbe Jizọs na-ekwu na oge na-abịa mgbe ndị agha Rom ga-ebibi Jeruselem, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha sí na Jeruselem gbapụ, ọ bụghị ka ha nọrọ lụwa agha. Ha mekwara ihe ọ gwara ha.—Luk 21:20, 21.

Pọl onyeozi sikwa n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” (Ndị Rom 12:19) Ihe a Pọl kwuru bụ ihe Chineke kwuru ọtụtụ nari afọ gara aga n’akwụkwọ Levitikọs 19:18 nakwa na Diuterọnọmi 32:35. N’isiokwu nke a na-esote, anyị hụrụ na otu ụzọ Chineke si bọọrọ ndị ya ọbọ bụ inyere ha aka buso ndị iro ha agha. N’ihi ya, ihe ahụ Pọl  kwuru gosiri na otú Chineke si ele ịlụ agha anya agbanwebeghị. N’oge ndịozi Jizọs, Chineke ka weere ịlụ agha ka otú kwesịrị ekwesị isi bọọrọ ndị na-efe ya ọbọ ma mee ka mmegbu na ihe ọjọọ niile kwụsị. Ma, ọ ka bụkwa naanị yanwa na-ekpebi mgbe a ga-alụ agha ọ bụla ọ kwadoro nakwa ndị ga-alụ ya otú o mere n’oge ochie.

O doro anya na Chineke agwaghị ndị mbụ soro ụzọ Kraịst ka ha lụọ agha. Oleekwanụ maka n’oge anyị a? È nweela ndị Chineke kwadoro ka ha na-aga agha? Ka ugbu a ọ̀ bụ oge Chineke ga-eji aka ya lụọrọ ndị na-efe ya agha? Oleedị otú Chineke si ele ịlụ agha anya n’oge anyị a? Isiokwu na-eso nke a ga-aza ajụjụ ndị a.