Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE ỌKTOBA 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ̀ BADỊRỊ URU IKPE EKPERE?

Uru Ekpere Ga-abara Gị

Uru Ekpere Ga-abara Gị

Tupu gị emee ihe ọ bụla, i nwere ike ibu ụzọ jụọ onwe gị, sị: ‘Olee uru ihe a ga-abara m?’ Ma, ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ma ekpere ọ̀ ga-abara ya uru, ọ̀ pụtara na ọ na-achọ naanị ọdịmma onwe ya? Mba. Anyị na-achọkarị ịma ma à ga-aza ekpere anyị. E nwedịrị mgbe onye ezi omume bụ́ Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mụ akpọọ ya, ọ̀ ga-aza m?”—Job 9:16.

N’isiokwu ndị bú nke a ụzọ, anyị kwuru ihe gosiri na ekpere abụghị naanị ihe mmadụ ji enwetatụ onwe ya ma ọ bụkwanụ ihe e ji ama ndị na-aga chọọchị. Ezi Chineke anyị na-ege ntị n’ekpere anyị. Ọ bụrụ na anyị esi otú kwesịrị ekwesị na-ekpe ekpere ma na-arịọ ihe kwesịrị ekwesị, ọ ga-ege anyị ntị. Ọ gbadịrị anyị ume ka anyị bịaruo ya nso. (Jems 4:8) Ma, olee uru ekpere ga-abara anyị ma anyị na-ekpe ya mgbe niile? Ka anyị lee ụfọdụ n’ime ha.

Obi ga-eru gị ala.

Ị̀ na-echegbukarị onwe gị ma nsogbu bịara gị? Ọ bụ n’ụdị oge a ka Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị,’ nakwa ka anyị ‘mee ka Chineke mara ihe anyị na-arịọ.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:17; Ndị Filipaị 4:6) Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ekpegara Chineke ekpere, na “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi [anyị] na ike iche echiche [anyị] nche.” (Ndị Filipaị 4:7) Obi ga-eru anyị ala ma anyị gwa Nna anyị nke eluigwe ihe na-enye anyị nsogbu n’obi. Chineke gwadịrị anyị ka anyị mee otú ahụ. N’Abụ Ọma 55:22, ọ gwara anyị, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.”

“Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.”—Abụ Ọma 55:22

Ọtụtụ ndị bí n’ebe dị iche iche n’ụwa achọpụtala na ikpe ekpere na-eme ka obi ruo ha ala. Otu nwaanyị Saụt Koria aha ya bụ Hee Ran, kwuru, sị: “Ọ na-abụ  m nwee ezigbo nsogbu, kpee ekpere gbasara ya, ya adị m ka è bupụrụla m nsogbu ahụ. M na-enwezi ike idi ya.” Nwaanyị Filipinz aha ya bụ Cecilia, kwuru, sị: “M na-echegbukarị onwe m gbasara otú m ga-esi elekọta ụmụ m na mama m nká na ọrịa na-anaghịzi ekwe mata onye m bụ. Ma, ekpere na-enyere m aka ịna-eme ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị ma ghara ịna-echegbukarịzi onwe m. Ama m na Jehova ga-enyere m aka ilekọta ha.”

A ga-akasi gị obi, nyekwa gị ike ị ga-eji die nsogbu bịaara gị.

Ọ bụrụ na e nwere nsogbu tara akpụ gị na ya na-alụ ma ọ bụkwanụ nke nwere ike ịta isi gị, ikpegara Chineke “nke nkasi obi niile” ekpere nwere ike ime ka i nweta onwe gị. Baịbụl kwuru na ọ “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4) Dị ka  ihe atụ, e nwere mgbe otu ihe na-enye Jizọs nsogbu n’obi, ya ‘egbuo ikpere n’ala malite ikpe ekpere.’ Gịnị meziri? “Otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara ìhè n’ihu ya wee mee ka ọ dị ike.” (Luk 22:41, 43) N’otu oge ndị ọjọọ nwara imenye Nehemaya, bụ́ ohu Chineke, egwu ka ọ kwụsị ịrụ ọrụ Chineke nyere ya, o kpere ekpere, sị: “Ma ugbu a, mee ka aka m dị ike.” Ihe ndị mechaziri mee gosiri na Chineke nyeere ya aka ka ọ ghara ịtụ onye ọ bụla egwu, ya arụchaakwa ihe ọ chọrọ ịrụ. (Nehemaya 6:9-16) Otu nwoke onye Gana aha ya bụ Reginald kwuru otú ekpere si enyere ya aka. Ọ sịrị: “M kpee ekpere, karịchaa, mgbe m nwere ezigbo nsogbu, ọ na-adị m ka m̀ hụrụ onye ga-enyeliri m aka, kọọrọ ya nsogbu m, ya asị mụ enyela onwe m nsogbu.” N’eziokwu, Chineke nwere ike ịkasi anyị obi ma anyị kpegara ya ekpere.

A ga-enye gị amamihe sí n’aka Chineke.

Mkpebi ụfọdụ anyị na-eme nwere ike imetụta anyị na ndị ikwu na ibe anyị ruo ọtụtụ afọ. Olee otú anyị ga-esi mee mkpebi ndị ga-abara anyị uru? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ [karịchaa iji die nsogbu ndị bịaara ya], ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha; ọ ga-enye onye ahụ amamihe.” (Jems 1:5) Ọ bụrụ na anyị arịọ Chineke ka o nye anyị amamihe, o nwere ike iji mmụọ nsọ ya nyere anyị aka ime mkpebi bara uru. Anyị nwedịrị ike ịrịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ n’ihi na Jizọs kwuru na ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’—Luk 11:13.

Kwabena bụ́ onye Gana kwuru, sị: “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Jehova nyere m aka ka m mee mkpebi bara uru”

Jizọs madị na ya kwesịrị ịrịọ Nna ya ka o nyere ya aka mgbe ọ chọrọ ime mkpebi ndị dị ezigbo mkpa. Baịbụl gwara anyị na n’otu abalị, mgbe ọ chọrọ ịhọrọ ụmụ nwoke iri na abụọ ga-abụ ndịozi ya, ọ ‘nọgidere n’abalị ahụ dum na-ekpeku Chineke ekpere.’—Luk 6:12.

Chineke nyeere Jizọs aka ime mkpebi dị mma. E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ Chineke zara ekpere ha mgbe ha rịọrọ ya ka o nyere ha aka ime mkpebi dị mma. Otu nwaanyị Filipinz aha ya bụ Regina kọrọ ọtụtụ nsogbu ndị o diri mgbe di ya nwụrụ. Ọ sịrị na o siiri ya ike ilekọta onwe ya na ezinụlọ ya, nakwa na a chụrụ ya n’ọrụ, ya esiere ya ike ịzụ ụmụ ya abụọ. Gịnị nyeere ya aka ime mkpebi bara uru? Ọ sịrị: “Atụkwasịrị m Jehova obi ma rịọ ya ka o nyere m aka.” Otu nwoke onye Gana aha ya bụ Kwabena kwuru ihe mere o ji rịọ Chineke ka o nyere ya aka. Ọ sịrị: “A chụrụ m n’ọrụ n’ebe a na-akwụ m ezigbo ụgwọ.” Mgbe ọ na-eche gbasara ọrụ ọ ga na-arụzi, o kwuru, sị: “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Jehova nyere m aka ka m mee mkpebi bara uru.” O kwukwara, sị: “O doro m anya na ọ bụ Jehova nyeere m aka ịhọta ọrụ m ji na-akpa afọ m, nke na-enyekwa m ohere ime ihe ndị gbasara ofufe m na-efe Chineke.” Ọ bụrụ na ị na-ekpegara Chineke ekpere maka ihe ndị ga-emetụta adịm ná mma gị na ya, ọ ga-azakwa ekpere gị.

Anyị ekwuola uru ụfọdụ ekpere nwere ike ịbara gị. (Ị chọọ ịmatakwu uru ekpere bara, gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Uru Ekpere Bara.”) Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ekpere baara gị uru, i kwesịrị ibu ụzọ mata onye Chineke bụ, matakwa ihe bụ uche ya. Gbalịa gwa Ndịàmà Jehova ka ha na-abịa akụziri gị Baịbụl. * I nwere ike isi otú a bido ịbịaru “Onye na-anụ ekpere” nso.—Abụ Ọma 65:2.

^ para. 14 Ị chọọ ịmatakwu otú gị na Ndịàmà Jehova ga-esi malite ịmụ Baịbụl, jụọ Ndịàmà Jehova bí gị nso ma ọ bụkwanụ gị agaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.

Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?

Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Gịnị na gịnị ka ị ma banyere anyị?