Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?

Nchegbu Gbasara Ego

Nchegbu Gbasara Ego

Otu nwoke aha ya bụ Paul, onye ji ụmụ abụọ, kọrọ ihe mere mgbe e nwere ụkọ nri n’obodo ha. O kwuru, sị: “E nwere mgbe ihe niile a na-ere n’obodo anyị na-ada oké ọnụ, nri adịrịkwa ụkọ. Anyị na-akwụ n’ahịrị ruo ọtụtụ awa n’ebe a na-ere nri. Ma, nri na-agwụkarị tupu e rute ebe anyị nọ. Agụụ nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ. Ọtụtụ bịara dị ka ogwu azụ̀, ụfọdụ ana-adachikwa ụzọ. Ego ole a na-ere ihe ndị dị mmadụ ezigbo mkpa bịara rịa elu ọjị. O nweghịzi uru ego obodo anyị bara. Ego niile m nwere n’ụlọ akụ̀ enweghịzi oké uru ha baara m.”

Paul

Paul ghọtara na ya ga-egosirịrị na ya nwere “ezi amamihe” ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka agụụ gụgbuo ndị ezinụlọ ya. (Ilu 3:21) O kwuru, sị: “Abụ m onye ọrụ ngo na-awaya ọkụ. Ma, m bidoro ịna-awayara onye ọ bụla chọrọnụ ọkụ ma onye ahụ ọ̀ kwụrụ m ihe e kwesịrị ịkwụ m ma ọ bụ na ọ kwụrughị ya. Ụfọdụ ndị m rụụrụ ọrụ ji ihe oriri ma ọ bụ ngwá ụlọ kwụọ m ụgwọ. E jiri aka ncha anọ kwụọ m ụgwọ, mụ eree abụọ, dowe abụọ. Ụfọdụ ndị jikwa ụmụ ọkụkọ kwụọ m ụgwọ. Emechara m nwee ụmụ ọkụkọ iri anọ m na-azụ. Mgbe ha toro, erere m ha ma zụta narị ọkụkọ atọ. Eji m ọkụkọ iri ise gbanweta akpa nri ọka abụọ. Akpa nke ọ bụla hà ka akpa simenti n’ịdị arọ. Mụ na ezinụlọ m na ezinụlọ ndị ọzọ anyị nyetụrụ nri ọka a rigidere ya ruo ogologo oge.”

Paul makwa na ihe ga-akacha enyere mmadụ aka ná ndụ bụ ịtụkwasị Chineke obi. Chineke ga-enyere anyị aka ma anyị mee ihe ọ gwara anyị mee. Jizọs gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ma anyị na-achọ inweta ihe e ji ebi ndụ. Ọ sịrị: “Kwụsịkwanụ ịnọ na-echegbu onwe unu; n’ihi na . . . Nna unu maara na ihe ndị a dị unu mkpa.”—Luk 12:29-31.

Ọ dị mwute na Setan, bụ́ ezigbote onye iro Chineke, emeela ka ọtụtụ ndị na-achụ ihe e ji ebi ndụ ka à na-anwụ anwụ. Ọtụtụ ndị na-echegbukarị onwe ha maka ihe ndị dị ha mkpa na ihe ndị ha chere na ọ ga-adị ha mkpa. Ha na-agbalịsi ike ka ha nweta ọtụtụ ihe na-adịghị ha mkpa. Ọtụtụ n’ime ha abanyekwala ná nnukwu ụgwọ. Ọ bụ mgbe ha banyechara n’ụgwọ ka ha na-aghọta na ‘onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’—Ilu 22:7.

 E nweekwala ụfọdụ ndị mere ihe kpatakwuuru ha nsogbu. Paul kwuru ihe ụfọdụ ndị agbata obi ya mere mgbe ahụ ihe siri ike n’obodo ha. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị agbata obi anyị hapụrụ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha gawa mba ọzọ iji lee ma ihe ọ̀ ga-akara ha mma. Ụfọdụ enwelighị ike ịchọta ọrụ n’ihi na ha ejighị akwụkwọ ikike banye n’obodo ndị ahụ. Ha na-ezokarị ezo ka aka ndị uwe ojii ghara ịkpara ha. Ha na-ehikwa n’okporo ụzọ. Ha enyeghị Chineke ohere ka o nyere ha aka. Ma, mụ na ndị ezinụlọ m kpebiri na anyị agaghị ahapụ ibe anyị. Kama, anyị ga-agbakọ mbọ ọnụ n’oge ihe siiri anyị ike ma tụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere anyị aka.”

IME IHE JIZỌS KWURU

Paul sịrị: “Jizọs kwuru, sị: ‘Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.’” Paul kwuziri, sị: “Ọ bụ ya mere ihe m na-arịọ Chineke n’ụbọchị ọ bụla bụ ka o ‘nye anyị nri taa maka ụbọchị taa’ ka anyị nwee ike ịdịrị ndụ na-aga. Chineke nyekwaara anyị aka otú ahụ Jizọs kwuru. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị nwetara ihe anyị chọrọ. E nwere otu ụbọchị m kwụ n’ahịrị na-achọ ịzụta ihe anyị ga-eri. Amaghịkwanụ m ihe a na-ere. Mgbe o mechara rutere m, m chọpụtara na ọ bụ yogọt. Anaghị m enwe mmasị ịracha yogọt. Ma ebe ọ bụ ihe oriri dịnụ, mụ na ezinụlọ m rara ya n’abalị ahụ. Ana m ekele Chineke na ọ gọziri mụ na ezinụlọ m n’oge ahụ niile. O nweghị mgbe anyị gba ọnụ lakpuo.” *

Chineke kwuru, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5

“Ihe dịtụụrụ anyị mfe ugbu a. Ma, n’oge ahụ ihe siiri anyị ike, anyị mụtara na ịtụkwasị Chineke obi na-akacha enyere mmadụ aka ka ọ ghara ichegbu onwe ya. Ọ bụrụhaala na anyị na-eme uche Jehova, * ọ ga na-enyere anyị aka mgbe niile. Anyị ahụla na ihe Abụ Ọma 34:8 kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: ‘Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma; obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.’ Ọ bụ ya mere na anyị anaghị echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ihe siere anyị ike ọzọ.

Chineke na-enyere ndị na-efe ya aka inweta nri kwa ụbọchị

“Anyị aghọtala na ihe dị mmadụ mkpa iji dịrị ndụ abụghị ọrụ ma ọ bụ ego, kama, ọ bụ nri. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ mgbe Chineke ga-emezu nkwa a o kwere: ‘Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa.’ Ma, ka ọ dịgodị, ‘ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.’ Obi na-esi anyị ike ma anyị cheta ihe a Baịbụl kwuru: ‘Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Ka anyị nwee obi ike wee sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.”’” *

Okwukwe anyị ga-esirịrị ike tupu anyị enwee ike ‘iso Chineke na-eje ije’ otú Paul na ezinụlọ ya na-eme. (Jenesis 6:9) Ma ihe ò siiri anyị ezigbo ike ugbu a ma ọ̀ ga-esiri anyị ike n’ọdịnihu, inwe okwukwe na igosi na anyị nwere ezi amamihe otú Paul mere ga-enyere anyị ezigbo aka.

Ma, gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe na-echegbu anyị bụ nsogbu ezinụlọ?

^ para. 10 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Atọ Ego Na-agaghị Azụtali

Anyị na-eji ego azụ ihe ndị dị anyị mkpa ma ego anaghị azụtali ihe ndị kacha mkpa ná ndụ.