Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Julaị 2015

Ànyị Ga-emeli Ihe Dị Chineke Mma?

Ànyị Ga-emeli Ihe Dị Chineke Mma?

Ò nwetụla mgbe ị gụrụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ọma banyere ha na Baịbụl, ya adị gị ka ị gaghị adịli ka ha? I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Abụghị m onye ezi omume, ọ bụghịkwa mgbe niile ka m na-eme ihe dị mma.’

Job “enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, ọ bụkwa onye ezi omume.”Job 1:1

Baịbụl kwuru na Job bụ nwoke ‘na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, ọ bụkwa onye ezi omume.’ (Job 1:1) Baịbụl kwukwara na Lọt bụ onye “ezi omume.” (2 Pita 2:8) Baịbụl gwakwara anyị na Devid mere “ihe ziri ezi” n’anya Chineke. (1 Ndị Eze 14:8) Ma, ka anyị lebagodị anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú ndị a si bie ndụ. Anyị ga-achọpụta na (Nke Mbụ) e nwere ihe ndị ha na-emetaghị, (Nke Abụọ) e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ha, nakwa (Nke Atọ) anyị ga-emeli ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị na anyị ezughị okè.

E NWERE IHE NDỊ HA NA-EMETAGHỊ

“[Chineke] napụtara onye ezi omume bụ́ Lọt, onye nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ.”2 Pita 2:7

E nwere mgbe Job tara ezigbo ahụhụ. Ma, o cheghị na ya kwesịrị ịta ụdị ahụhụ ahụ. O bidoro iche na Chineke achọghị ịma ma ò nwere okwukwe na ya ma ọ̀ bụ na o nweghị. Ihe a o chere ezighị ezi. (Job 9:20-22) Otú Job si were onwe ya ka onye ezi omume mere ka ndị ọzọ chewe na ọ na-ekwu na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke.—Job 32:1, 2; 35:1, 2.

 E nwere mgbe Lọt nọ na-egbu oge ime ihe doro anya o kwesịrị ime. Omume rụrụ arụ ndị Sọdọm na Gọmọra na-aṅụ ka mmiri nọ na-enye ya ezigbo nsogbu n’obi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “a na-emekpa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ́” n’ihi omume ha. (2 Pita 2:8) Chineke kwuru na ya ga-ebibi obodo ọjọọ ndị ahụ nakwa na ya chọrọ ichebe Lọt na ezinụlọ ya. I nwere ike iche na ebe ihe a na-eme n’obodo ndị ahụ na-ewute Lọt, ọ ga-agbapụ ozugbo ma a sị ya gbapụ. Ma o gbuwere oge mgbe a sịrị ya gbapụ. Ọ bụzi ndị mmụọ ozi e dunyere ka ha gaa napụta Lọt na ezinụlọ ya jidere ha aka ma kpọpụta ha n’obodo ahụ ka a ghara ibibi ha.—Jenesis 19:15, 16.

David “jikwa obi ya dum soro [Chineke] site n’ime naanị ihe ziri ezi n’anya [Chineke].”—1 Ndị Eze 14:8

E nwere mgbe Devid na-ejidelighị onwe ya, ya na nwunye mmadụ akwaa iko. Ka ọ nọ na-agba mbọ ka ndị ọzọ ghara ịma ihe a o mere, ya emee ihe ọzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. O mere ka e gbuo di nwaanyị ahụ. (2 Samuel, isi nke 11) Baịbụl kwuru na ihe a Devid mere “dị njọ n’anya Jehova.”—2 Samuel 11:27.

Job, Lọt na Devid mejọchara ihe. Ụfọdụ ihe ha mejọrọ dị oké njọ. Ma, ka anyị na-amụtakwu gbasara ha, anyị ga-achọpụta na ha ji obi ha niile chọọ ife Chineke nakwa irubere ya isi. Ha dị njikere igosi na ihe ha mere wutere ha nakwa na ha chọrọ imezi ihe ha mejọrọ. Ọ bụ ya mere Chineke ji meere ha ebere. Ọ bụkwa ya mere Baịbụl ji sị na ha kwesịrị ntụkwasị obi.

OLEE IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA HA?

Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị ga na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 3:23) Ma ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe, anyị kwesịrị igosi na ihe anyị mere wutere anyị ma mee ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị mezie ihe ahụ anyị mejọrọ.

 Olee otú Job, Lọt na Devid si gbalịa ka ha mezie ihe ha mejọrọ? Job weere na ya anaghị emejọ ihe. Ma, mgbe Chineke jụchara ya ajụjụ ndị mere ka o chee echiche, Job gbanwere echiche ya, kwuzie na ya ekwukwaghị ihe ya kwuru. (Job 42:6) Omume rụrụ arụ ndị Sọdọm na Gọmọra na-eme wutere Lọt otú ahụ o wutere Chineke. Nsogbu ya bụ na o gburu oge ime ihe o kwesịrị ime. Ma, o mechara si n’obodo ahụ a chọrọ ibibi gbapụ. O rubekwara isi mgbe a gwara ya ka ọ ghara ile anya n’azụ n’oge ha na-agbapụ. Ọ bụ ya mere o ji lanahụ. Mgbe Devid mebiri iwu Chineke, o gosiri na ihe o mere wutere ya. O si n’ala ala obi ya chegharịa ma rịọsie Chineke ike ka o meere ya ebere.—Abụ Ọma 51.

Otú Chineke si meere ndị a ebere gosiri na ọ ghọtara na anyị ezughị okè. Baịbụl kwuru na Chineke “maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:14) Ọ bụrụ na Chineke maara na anyị nwere ike imehie ya, oleezi ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme?

Chineke “maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Abụ Ọma 103:14

OLEE OTÚ MMADỤ NA-EZUGHỊ OKÈ GA-ESI NA-EME IHE DỊ CHINEKE MMA?

E nwere ihe Devid gwara Sọlọmọn nwa ya nke ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi mee ihe dị Chineke mma. Ọ gwara ya, sị: “Sọlọmọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jirikwa obi gị dum . . . jeere ya ozi.” (1 Ihe E Mere 28:9) Gịnị ka mmadụ iji obi ya dum jeere Chineke ozi pụtara? Ọ pụtara na onye ahụ ga-eji obi ya niile hụ Chineke n’anya, kpebisie ike ịna-eme ihe dị ya mma ma na-erubere ya isi. Ọ pụtaghị na onye ahụ ga-ezu okè, kama, ọ ga na-agụsi ya agụụ ike irubere Chineke isi. Ya mejọọkwa ihe, ya ekweta ka a gbazie ya. Ọ bụ n’ihi na Job, Lọt na Devid hụrụ Chineke n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi, mere Chineke ji kpọọ Lọt onye “ezi omume,” kwuo na Job bụ onye ‘na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,’ kwuokwa na Devid ‘na-eme naanị ihe ziri ezi.’ Ha meliri ihe dị Chineke mma n’agbanyeghị na ha mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ.

Mmadụ iji obi ya dum ejere Chineke ozi pụtara na onye ahụ ga na-agbasi mbọ ike na-eme uche Chineke ma na-achọsi ike irubere ya isi

Ọ bụrụ na anyị echewe ihe na-adịghị mma ma ọ bụ kwuo ihe anyị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụkwanụ mee ihe anyị mechara ghọta na ọ dịghị mma, akụkọ Job, Lọt na Devid ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme. Chineke ma na anyị ezughị okè ugbu a. Ma, ọ chọrọ ka anyị hụ ya n’anya ma na-agba mbọ irubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile na-eme ihe ndị a, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-emelikwa ihe dị Chineke mma.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke