Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Jun 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SAYENSỊ Ọ̀ BAZIRI URU KARỊA BAỊBỤL?

Otú Sayensị Si Abara Gị Uru

Otú Sayensị Si Abara Gị Uru

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ọrụ ndị sayensị bụ “ịsa anya ná mmiri mụọ gbasara otú ihe ndị dị na mbara igwe na n’ụwa si arụ ọrụ, ime ezigbo nchọnchọ, nwalee ihe ọ bụla ha chọpụtara, leruo ha anya ma gbakọọ ihe ụfọdụ gbasara ihe ndị ahụ.” Ime ihe a niile adịghị mfe, ọ na-agwụkarịkwa ike. Ọ na-ewe ndị sayensị ọtụtụ izu, ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa, ma ọ bụdị ọtụtụ afọ tupu ha achọpụta ihe. Mgbe ụfọdụ, mbọ ha na-agba ịchọpụta ihe na-akụ afọ n’ala. Ma ọtụtụ mgbe, ha na-achpụta ihe na-abara ndị mmadụ uru. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

Otu ụlọ ọrụ Yurop emepụtala ọkpọka ngwá ọrụ e ji aza mmiri ka onye ṅụrụ mmiri e ji ya zaa ghara ibute ọrịa ịṅụ mmiri ọjọọ na-akpata. Ụdị ngwá ọrụ a abaarala ndị mmadụ ezigbo uru n’ebe ndị e nwere ọdachi ndị na-emere onwe ha, dị ka mgbe ala ọma jijiji mere na Heiti n’afọ 2010.

Ndị sayensị emepụtakwala ngwá ọrụ na-agwa mmadụ ebe ọ nọ, nke a na-akpọ GPS n’olu Bekee. Ọ bụ ndị agha ka e bubu n’obi mepụta ngwá ọrụ a. Ma ugbu a, ọ na-abara ọtụtụ ndị uru, dị ka ndị ọkwọ ụgbọ mmiri, ndị ọkwọ ụgbọala, ndị ọkwọ ụgbọelu, ndị dinta, na ndị na-eji ụkwụ aga ebe dị iche iche elegharị anya. Ọ na-enyere ha aka ịmata ụzọ. O doro anya na ihe a ndị sayensị mepụtara na-abara anyị ezigbo uru.

Ọ bụrụ na i nwere ekwentị, kọmputa, na-aga n’Ịntanet, ma ọ bụ na-eji ụgbọelu eme njem, ma ọ bụkwanụ na o nweela mgbe ị rịara ọrịa, ṅụọ mkpụrụ ọgwụ, ahụ́ adị gị mma, mara na ihe ndị sayensị mepụtara na-abara gị ezigbo uru.

IHE NDỊ SAYENSỊ NA-ENWEGHỊ IKE IME

Ndị sayensị na-emekwu nchọnchọ iji mata ọtụtụ ihe ha na-amaghị gbasara ụwa anyị a. Ndị nke na-amụ banyere ụmụ irighiri ihe a na-akpọ atọm na-agba mbọ ka ha mata otú ihe ndị dị n’ime atọm si arụ ọrụ, ebe ndị nke na-amụ banyere ihe ndị dị na mbara igwe na-agba mbọ ka ha mata ihe ndị mere ọtụtụ ijeri afọ gara aga ka ha si otú ahụ mata mgbe eluigwe na ụwa bidoro dịwa. Otú a ha si aga n’ime ime mbara igwe achọpụta ihe dị iche iche emeela ka ụfọdụ n’ime ha kwuo na á sị na Chineke e kwuru okwu ya na Baịbụl dị adị, na ha gaara ahụla ya.

Otu onye sayensị a na-akpọ Amir D. Aczel kwuru na ụfọdụ ndị sayensị na ndị ọzọ gụrụ oké akwụkwọ ‘na-ekwu na Chineke adịghị.’ Dị ka ihe atụ, otu onye sayensị a ma ama kwuru na “ebe ọ bụ na ha ahụbeghị ihe gosiri na e nwere Chi kere eluigwe na ụwa, o doro anya na ụdị chi ahụ adịghị.” Ndị ọzọ na-ekwu na ihe ndị e dere na Baịbụl na Chineke mere bụ “majik” na “ihe ndị e ji aghọgbu ndị mmadụ.” *

 Ma, ihe anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị bụ, ihe ndị a niile ndị sayensị mụtarala gbasara ụwa anyị a, ò zuola ha iji ya kpebie ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị? Anyị ma na azịza ya bụ mba. Ndị sayensị achọpụtala ọtụtụ ihe. Ma, ọtụtụ ndị sayensị kwetakwara na e nwere ọtụtụ ihe ha na-amaghị, nakwa ihe ndị o nwere ike ịbụ na ha agaghị amatali. Otu onye sayensị a ma ama aha ya bụ Steven Weinberg kwuru, sị; “Anyị enweghị ike ịmatacha ihe niile gbasara ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa.” Otu prọfesọ a ma ama aha ya bụ Martin Rees dere, sị: “E nwere ike inwe ihe ndị ụmụ mmadụ na-agaghị amatali ná ndụ ha niile.” Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị sayensị na-enwebeghị ike ịmata gbasara ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha:

  • Ndị sayensị amatachabeghị ihe ndị na-eme n’ime mkpụrụ ndụ, otú o si eji ike ya arụ ọrụ, otú o si emepụta protin, na otú o si emepụta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ.

  • E nwere ikike ji ihe ndị dị na mbara igwe na ihe ndị dị n’ụwa. O nweghị onye ọ bụla n’ime anyị ikike a na-anaghị emetụta. Ma, ndị sayensị amatachabeghị otú o si arụ ọrụ. Ha amatachabeghị otú ikike a si adọtu onye wụliri elu na otú o si eme ka ọnwa na-agba ụwa gburugburu.

  • Ndị na-amụ gbasara ụwa na mbara igwe kwuru na e kee ihe ndị dị n’ụwa na mbara igwe ụzọ iri, ihe ndị sayensị ga-ejili onyokomita ha hụ erudịghị otu ụzọ. Ha amatabeghị otú ihe ndị ahụ ha na-anaghị ahụli dị na otú ha si arụ ọrụ.

E nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ndị sayensị na-enwebeghị ike ịchọpụta. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Otu onye sayensị a ma ama kwuru na ihe ha ma enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ha na-amaghị. O kwukwara na ihe ndị sayensị na-achọpụta kwesịrị ime ka ọ na-agụ ha agụụ ịmata ihe ndị ha na-amatabeghị, ọ bụghị ime ka ha kwubie na ihe ndị ahụ ha na-amatabeghị adịghị adị.

N’ihi ya, ọ bụrụ na i chere na sayensị baziri uru karịa Baịbụl, na-achọkwa ime ka i chewe na Chineke adịghị, chebara ihe a echiche: Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ntakịrị ihe ka ndị sayensị a ụbụrụ na-aghọ nkọ nwerela ike iji ọkpọka ngwá ọrụ ha chọpụta, ọ̀ dabara adaba ikwu na ihe ndị nke ha na-achọpụtabeghị adịghị adị? Ị manụ na ọ dabaghị adaba. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopedia Britannica ji kwuo, sị: “Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ anọ gara aga e nyochawara mbara igwe, malite n’oge ndị Babịlọn ruokwa taa, ọtụtụ ihe gbasara ya ka na-agbagwoju ndị na-enyocha ya anya.”

Anyịnwa bụ́ Ndịàmà Jehova ma na ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ebe ọ kwụ n’okwu a. Ma, anyị na-agbalị eme ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5) Ọ bụ ya mere anyị ji agba gị ume ka ị gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị hụ na e nwere ihe ndị Baịbụl na sayensị nwere otu olu na ha.

^ para. 9 Ụfọdụ ndị anaghịzi ekwere ihe Baịbụl kwuru n’ihi ihe ndị chọọchị na-akụzi. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-akụzi bụ na ụwa nọ n’etiti, ihe ndị dị na mbara igwe a na-agba ya gburugburu, ma ọ bụ na Chineke ji abalị isii nkịtị kee ihe niile.—Gụọ ihe e dere n’igbe bụ́ “ Ihe Baịbụl Kwuru na Ihe Ndị Sayensị Chọpụtara.”

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?

Baịbụl kwuru ihe ise gbara ọkpụrụkpụ gosiri na Chineke dị adị.

TETA!

Olee Otú Baịbụl Kwuru Chineke Si Kee Ihe?

Baịbụl kwuru na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe. Ụbọchị ndị ahụ hà bụ ụbọchị isii nkịtị?