Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2015

Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?

Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?

A kpọrọ otu fim na-atụ ụjọ e mere na nso nso a Antichrist nke pụtara Onye Na-emegide Kraịst.

Okwu Bekee bụ́ Antichrist, nke pụtara Onye Na-emegide Kraịst, dị n’aha otu egwú otu òtù egwú a ma ama kụrụ.

Ihe otu nwoke gụrụ oké akwụkwọ kpọrọ otu akwụkwọ o dere bụ The Antichrist, nke pụtara Onye Ahụ Na-emegide Kraịst. Aha nwoke a bụ Friedrich Nietzsche. O dere ọtụtụ akwụkwọ n’agbata afọ 1872 na afọ 1888.

N’oge ochie, ndị eze na-akpọkarị ndị iro ha ndị na-emegide Kraịst.

Otu onye Jamanị aha ya bụ Matịn Luta, bụ́ onyeisi ndị malitere ịgba ihe ndị Katọlik na-akụzi ụkwụ, kpọrọ ndị poopu Katọlik ndị na-emegide Kraịst.

EBE ọ bụ na e nweela ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-akpọ “onye na-emegide Kraịst,” anyị kwesịrị ịchọsi ike ịma onye bụ́ onye na-emegide Kraịst nakwa ma ò nwere uru ịmata ya ga-abara anyị. Na Baịbụl, e nwere ebe abụọ e dere “onye na-emegide Kraịst,” nwee ebe abụọ e dere “onye ahụ na-emegide Kraịst,” nweekwa otu ebe e dere “ndị na-emegide Kraịst.” N’ihi ya, e nweghị ebe ọzọ ka mma anyị kwesịrị ibido chọwa ihe “onye na-emegide Kraịst” pụtara karịa na Baịbụl.

OTÚ E SI MATA ONYE NA-EMEGIDE KRAỊST

N’ime ndị niile so dee Baịbụl, ọ bụ naanị Jọn onyeozi dere okwu bụ́ “onye na-emegide Kraịst.” Olee otú o si kọwaa ihe ọ pụtara? O kwuru na 1 Jọn 2:18, 19, 22, sị: “Ụmụntakịrị, ọ bụ oge awa ikpeazụ, dịkwa nnọọ ka unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọbụna ugbu a, e nwewo ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst; nke bụ́ ihe anyị ji mara na ọ bụ oge awa ikpeazụ. Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu . . . Ònye bụ onye ụgha ma ọ bụghị onye na-asị na Jizọs abụghị Kraịst? Ọ bụ onye a bụ onye na-emegide Kraịst, ya bụ, onye na-agọnahụ Nna ahụ na Ọkpara ya.”

Jọn onyeozi ghọtara na onye na-emegide Kraịst abụghị otu onye, kama, ọ bụ ndị niile kpachaara anya na-akụziri ọhaneze ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jizọs Kraịst, na-ekwukwa na Jizọs kwuru ihe ndị ọ na-ekwughị

Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a Jọn kwuru? Jọn kwuru na e nwere “ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst.” Ọ pụtara na ọ bụghị otu onye na-emegide Kraịst, kama, ọ bụ ọtụtụ ndị. Òtù ma ọ bụ ndị a na-emegide Kraịst na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jizọs. Ha na-asị na Jizọs abụghị Kraịst, ma ọ bụ Mesaya ahụ. Ha na-agbalịkwa ime ka ndị mmadụ ghara ịmata na Chineke dị iche, Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst adịrị iche. Ndị a na-emegide Kraịst na-ekwu na ha bụ Kraịst ma ọ bụkwanụ na ha na-anọchite anya Kraịst. Ma, ebe “ha si n’ebe anyị nọ pụọ,” ha anaghịzi ekwu ihe Baịbụl kwuru. Ihe ọzọ bụkwa na ndị a na-emegide Kraịst nọ ya mgbe Jọn na-ede akwụkwọ ozi a ‘n’oge awa ikpeazụ.’ Oge ikpeazụ a ga-abụ obere oge tupu ndịozi anwụchaa.

Olee ihe ọzọ Jọn kwuru gbasara onye na-emegide Kraịst? Jọn gwara anyị ka anyị kpachara anya maka ndị amụma ụgha. Ọ sịrị: “Okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-ekwupụta na Jizọs Kraịst bịara n’anụ ahụ́, si n’aka Chineke, ma okwu ọ bụla nke si n’aka mmụọ, nke na-adịghị ekwupụta Jizọs, esighị n’aka Chineke. Ọ bụ ya bụ okwu si n’aka mmụọ nke onye ahụ na-emegide Kraịst, onye unu nụrụ na ọ na-abịa, ugbu a, ọ nọrọlarị n’ụwa.” (1 Jọn 4:2, 3) N’akwụkwọ ozi nke abụọ Jọn dere, o mesiri ihe a ọ na-ekwu ike. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị nduhie abanyewo n’ụwa, bụ́ ndị na-adịghị ekwupụta na Jizọs Kraịst bịara n’anụ ahụ́. Nke a bụ onye nduhie ahụ na onye ahụ na-emegide Kraịst.” (2 Jọn 7) O doro anya na Jọn ghọtara na onye na-emegide Kraịst abụghị otu onye, kama, ọ bụ ndị niile kpachaara anya na-akụziri ọhaneze ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jizọs Kraịst, na-ekwukwa na Jizọs kwuru ihe ndị ọ na-ekwughị.

 “NDỊ AMỤMA ỤGHA” NA “ONYE AHỤ NA-EMEBI IWU”

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpachara anya n’ihi na ndị amụma ụgha ga-abịakwute ha “n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji”

Ọtụtụ afọ tupu Jọn edee gbasara ndị okpukpe a na-eduhie ndị mmadụ, Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha ndị na-abịakwute unu n’oyiyi atụrụ, ma n’ime ha, ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.” (Matiu 7:15) Pọl onyeozi gwakwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka sị: ‘Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ụbọchị Jehova agaghị abịa ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nwee ndapụ n’ezi ofufe, e kpugheekwa onye ahụ na-emebi iwu, nke bụ́ nwa mbibi.’—2 Ndị Tesalonaịka 2:3.

Ihe ndị a anyị lebarala anya gosiri na ndị amụma ụgha na ndị na-ezi ozizi ụgha anọrọla kemgbe oge ndịozi Jizọs, ha na-agbalịkwa iduhie ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị niile na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu gbasara Jizọs na ndị na-akụzi ihe ọ na-akụzighị socha na ndị Jọn onyeozi kpọrọ “onye na-emegide Kraịst.” Pọl kpọkwara ha “nwa mbibi.” Ihe a Pọl kpọrọ ha mere ka anyị mata otú Jehova si ele ha anya.

KPACHARA ANYA KA ONYE NA-EMEGIDE KRAỊST GHARA IDUHIE GỊ

Oleekwanụ gbasara oge anyị a? Ndị mmadụ na òtù dị iche iche bụ́ ndị na-emegide Kraịst ka na-emegidekwa ya ma na-ekwu na ihe ndị ọ kụziri abụghị eziokwu. Ha na-akpachara anya na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu ma na-eduhie ndị mmadụ ka ha ghara ịma nke bụ́ eziokwu gbasara Jehova Chineke na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iji ihe ndị a ha na-akụzi duhie anyị. Ka anyị lebagodi anya n’ihe abụọ ha na-akụzi.

Kemgbe ọtụtụ afọ, chọọchị dị iche iche na-akụzi ozizi Atọ n’Ime Otu. Ha na-ekwu na Chineke na Ọkpara ya bụ otu onye. Onye na-emegide Kraịst na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu gbasara onye Jehova Chineke na Jizọs Kraịst bụ. Ihe a ha na-eme na-emezi ka ọ na-esiri ndị mmadụ ike iṅomi Jizọs na ịbịaru Chineke nso bụkwanụ ihe Baịbụl gbara ha ume ka ha mee.—1 Ndị Kọrịnt 11:1; Jems 4:8.

O nwekwara ihe ọzọ chọọchị dị iche iche na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma nke bụ́ eziokwu. Ha na-agwa ndị òtù ha ka ha na-agụ Baịbụl ndị e wepụrụ aha Chineke, bụ́ Jehova, na ha. Ma mgbe e dere Baịbụl, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara na ya ihe dị ka ugboro puku asaa. Ihe a ha mere emeela ka o sikwuoro ndị mmadụ ike ịmata onye ezi Chineke bụ.

Ma, ịmata na aha Chineke bụ Jehova enyerela ọtụtụ ndị chọrọ ife Chineke aka ịbịaru ya nso. Ụdị ihe a mere otu nwoke aha ya bụ Richard. O kwuru ihe mere mgbe ya na Ndịàmà Jehova abụọ kparịtachara ụka. Ọ sịrị: “Ha ji Baịbụl gosi m na aha Chineke bụ Jehova. Obi tọrọ m ụtọ ịmata na Chineke nwere aha. Anụtụbeghị m ya mbụ.” Bido mgbe ahụ gawa, nwoke a kwụsịrị ndụ ọjọọ ọ na-ebi, kpawa àgwà ọma n’ihi na ọ chọrọ ime ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl, chọọkwa ime Jehova obi ụtọ. O kwukwara, sị: “Ịmata ezigbo aha Chineke emeela ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma.”

Kemgbe ọtụtụ narị afọ, onye ahụ na-emegide Kraịst emeela ka ọtụtụ ndị ghara ịma nke bụ́ eziokwu. Ma, Baịbụl anyị na-amụ emeela ka anyị mata onye ahụ na-emegide Kraịst. O meekwala ka anyị ghara iso ná ndị o ji ụgha na aghụghọ na-eduhie.—Jọn 17:17.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Baịbụl Ò Kwuru na Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu?

Ọtụtụ ndị chọọchị na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ihe a ha na-akụzi ò sị na Baịbụl?

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.