Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mee 2015

 ṄOMIE OKWUKWE HA | JOSEF

“Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”

“Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”

WERE ya na ị na-ahụ Josef ka o guzo n’ubi ya n’otu mgbede, na-ele nkwụ na osisi ndị ọzọ dị ebe ahụ, na-elekwa ọmarịcha mmiri dị ebe ahụ na ahịhịa ndị dị n’ime ya. Ọ nọkwa n’ubi ahụ na-ele obí Fero. Ka ọ nọ ebe ahụ, ya ana-anụ olu ndị na-achị ọchị n’ime ụlọ ya. Manase nwa ya na-akpa Ifrem nwanne ya nke nta ọchị, nne ha ana-elekwa ha na-achị ọchị. Josef mụmụrụ ọnụ ọchị, kwee n’isi n’ihi na ọ ma na Chineke agọziela ya.

Ihe mere Josef ji gụọ ọkpara ya Manase bụ n’ihi nsogbu ndị Jehova mere ka o chefuo. (Jenesis 41:51) O nwere ọtụtụ ihe ọ na-abụ o cheta, obi ana-ajọ ya njọ. Ọ na-ewute ya na ọ nọghị n’ụlọ ha, ọ naghịkwa ahụ ụmụnne ya na papa ya. Ọ na-ewutekwa ya ma o cheta otú ụmụnne ya ndị nke tọrọ ya si kpọ ya asị, gwa ya okwu ọjọọ, kpaa nkata igbu ya, ma mechaakwa ree ya ka ọ gaa gbawa ohu. Kemgbe ahụ, ọtụtụ ihe emeela ná ndụ ya. N’ime ihe dị ka afọ iri na abụọ, ọ gbaala ohu, nọọkwa na mkpọrọ. O nwekwara mgbe a tụrụ ya ịgà n’ụkwụ. Ma ugbu a, obi na-atọ ya ụtọ na Chineke agọziela ya. Ọ bụ ya bụzi onye na-esote eze ndị Ijipt bụ́ obodo dị ike. *

Jehova kwuru na a ga-enwe afọ asaa ihe oriri ga-aba ụba n’Ijipt. Kemgbe afọ asaa ahụ bidoro, Josef ahụla otú ihe a Jehova kwuru si na-emezu. Ọ bụkwa Josef ka ọrụ ịchịkọta ihe oriri ndị ahụ na ichekwa ha dị n’aka. Ọ bụ n’oge ahụ ka nwunye ya bụ́ Asinat mụụrụ ya ụmụ nwoke abụọ. Ma, Josef ka na-echeta ndị ezinụlọ ha bi n’ebe dị ezigbo anya, karịchaa, nwanne ya nta bụ́ Benjamin na nna ya bụ́ Jekọb. O nwere ike ịbụ na Josef nọ na-eche ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha, ma obi ọ̀ ka fere ụmụnne ya azụ, nakwa ma ya na ha ọ̀ ga-adịghachili ná mma.

Ọ bụrụ na o nwetụla mgbe ndị ezinụlọ unu na-adịghị n’otu n’ihi na ụfọdụ na-enwere ibe ha anyaụfụ, ma ọ bụ rabanye ibe ha n’aka ndị ọjọọ, ma ọ bụkwanụ kpọọ ibe ha asị, mara na otú ọ dị gị ka ọ dị Josef. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Josef si lekọta ndị ezinụlọ ha?

“GAKWURUNỤ JOSEF”

Ọrụ zuru Josef ahụ́, afọ asaa ahụ ihe oriri ga-aba ụba agwụwakwala. Ihe Jehova gwara Fero ná nrọ emechaala mee. Ozugbo afọ asaa ahụ gachara, ala kwụsịrị imepụta ihe oriri. Obere oge, ụnwụ dara n’obodo niile gbara Ijipt gburugburu. Ma, Baịbụl kwuru na “ihe oriri dị n’ala Ijipt dum.” (Jenesis 41:54) O doro anya na nrọ ahụ Jehova si n’aka Josef kọwaa, nakwa otú Josef si hazie ihe niile nke ọma, baara ndị Ijipt uru.

Jehova akwụsịghị iji Josef na-arụ ọrụ n’ihi na Josef nọgidere na-adị umeala n’obi

Ọ ga-abụ na ndị Ijipt kelere Josef ezigbo ekele maka ihe o meere ha, tookwa ya maka nkà pụrụ iche o nwere n’ịhazi ihe. Ma, Josef achọghị ka ha bịa towe ya, kama ọ chọrọ ka ha na-eto Jehova bụ́ Chineke ya. Ọ bụrụ na anyị ejiri nkà ndị anyị nwere na-ejere Chineke ozi ma dịrị umeala n’obi, Chineke nwere ike ime ka anyị jiri nkà ndị ahụ rụọ ihe karịrị ihe anyị tụrụ anya na anyị ga-arụli.

 Ma, ụnwụ ahụ mechakwara kpawa ndị Ijipt aka ọjọọ. Ha rịọwara Fero ka o nyere ha aka, Fero asị ha: “Gakwurunụ Josef. Ihe ọ bụla ọ gwara unu, meenụ ya.” Josef bidoro mepewe ebe niile e debere ọka wit ma na-eresị ya ndị chọrọ ya.—Jenesis 41:55, 56.

Ma, ụnwụ ahụ kpara ndị bi ná mba ndị ọzọ aka ọjọọ, ha ahụghịdị nri nke ha nwere ike ịzụ azụ. Ụmụnne Josef na nna ha nọ na Kenan na-ahụsi anya n’ihi ụkọ nri. Kenan dị ihe karịrị narị kilomita atọ ma e si Ijipt gawa ya. Nna Josef bụ́ Jekọb nụrụ na e nwere ọka n’Ijipt. N’ihi ya, o dunyere ụmụ ya ka ha gaa Ijipt zụta ọka.—Jenesis 42:1, 2.

Jekọb dunyere naanị ụmụ ya ndị nwoke iri. Ọdụdụ nwa ya bụ́ Benjamin esoghị ha. Jekọb chetara ihe mere mgbe o zigara Josef nwa ya ọ hụrụ n’anya ka ọ gaa lee otú ụmụnne ya mere. Ihe ahụ bụ anya ikpeazụ ọ hụrụ Josef. Ihe ụmụnne ya welataziiri Jekọb bụ uwe mwụda pụrụ iche ọ kwaara Josef. Uwe ahụ bụzi ọbara ọbara, ọ dọkasịkwara adọkasị. Ụmụ ya ahụ mere ihe a ka o were ya na anụ ọhịa adọgbuola Josef. Obi gbawara Jekọb.—Jenesis 37:31-35.

“OZUGBO AHỤ, JOSEF CHETARA NRỌ NDỊ Ọ RỌRỌ”

Ụmụ Jekọb mere ogologo njem ma mechaa ruo Ijipt. Mgbe ha jụrụ otú ha ga-esi zụta ọka, a gwara ha ka ha gakwuru otu nnukwute onye ọchịchị aha ya bụ́ Zafenat-pania. (Jenesis 41:45) Mgbe ha hụrụ onye ahụ, hà matara na ọ bụ Josef? N’ebeekwanụ? Naanị ihe ha ma bụ na onye ahụ bụ nnukwu onye ọchịchị a ma ama n’Ijipt, nakwa na ọ bụ ya ga-enyere ha aka. Ha mere ihe ha kwesịrị ime ma ha hụ ụdị onye ahụ. Ha “bịara kpọọrọ ya isiala.”—Jenesis 42:5, 6.

Ma, Josef ọ̀ matara ụmụnne ya? Ozugbonụ. Ihe ọzọ bụkwa na mgbe ọ hụrụ ha ka ha na-akpọrọ ya isiala, o chetara ihe mere mgbe ọ dị obere. Baịbụl gwara anyị na “ozugbo ahụ, Josef chetara nrọ ndị” Jehova mere ka ọ rọọ mgbe ọ dị obere. Jehova ji nrọ ndị ahụ gosi na ụmụnne Josef ga-emecha na-akpọrọ Josef isiala. Ọ bụkwa ya ka ha na-eme ugbu a. (Jenesis 37:2, 5-9; 42:7, 9) Gịnị ka Josef ga-eme? Ọ̀ ga-aga makụọ ha, ka ọ̀ ga-eji ohere a megwara ha ihe ha mere ya?

Josef ma na ya ekwesịghị iji maka iwe ihe ahụ ụmụnne ya mere ya sị ka ya megwara ha. Ọ ma na aka Jehova dị n’ihe ndị a na-eme ugbu a. Jehova chọrọ iji ihe ndị a na-emenụ mezuo nkwa o kwere. O kwere nkwa na ya ga-eme ka ụmụ Jekọb ghọọ nnukwu mba. (Jenesis 35:11, 12) Ọ bụrụ na obi ka fere ụmụnne Josef azụ, ya abụrụkwa na ha ka na-eche naanị gbasara onwe ha, ma ọ bụ na ha ka na-akpa arụ iji nweta ihe ha chọrọ, ọ ga-emebi ọtụtụ ihe. Ihe ọzọ bụkwa na Josef mee ha ihe ọ bụla, o nwere ike ịkpaghasị ezinụlọ ha, ma ọ bụdị kpatara nna ya na nwanne ya Benjamin ezigbo nsogbu. Ọ maghịdị ma hà ka dị ndụ. N’ihi ihe ndị a, Josef kpebiri na ya agaghị eme ka ha mata onye ọ bụ ka o nwee ike ile ha ule ma chọpụta ma  hà agbanweela. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-amata ihe Jehova chọrọ ka o mee.

O nwere ike ụdị ihe a mere Josef agaghị eme gị. Ma, ọtụtụ ezinụlọ taa adịghị n’udo. Ọ bụrụ na anyị nọ n’ụdị ezinụlọ a, obi anyị nwere ike ịna-agwa anyị ka anyị mee ihe anyị chere na ọ bụ ya kacha mma. Ma, ihe kacha mma anyị ga-eme bụ iṅomi Josef. Anyị kwesịrị ịgbalị chọpụta ihe Chineke chọrọ ka anyị mee. (Ilu 14:12) Anyị na ndị ezinụlọ anyị kwesịrị ịna-adị n’udo. Ma, ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ka anyị na Jehova na Ọkpara ya na-adị n’udo.—Matiu 10:37.

“A GA-EJI NKE A NWALEE UNU”

Josef mere ọtụtụ ihe iji chọpụta ụdị obi ụmụnne ya nwere ugbu a. Ihe mbụ o mere bụ iji asụsụ ndị Ijipt bawara ha mba, onye ọzọ ana-atapịara ha ihe ọ na-ekwu. Josef gwara ụmụnne ya na ha bịara iledo ala Ijipt. Ma, ụmụnne ya bidoro ịgọrọ isi ha. Ha gwara ya banyere ezinụlọ ha, gwakwa ya na ha nwere nwanne ntakịrị nọ n’ụlọ. Josef emeghị ka ha mata na obi tọrọ ya ụtọ maka ihe a ha kwuru. Ma, Josef chọrọ ịma ma Benjamin ọ̀ ka nọ ndụ n’eziokwu. Ọ gwaziri ha, sị: “A ga-eji nke a nwalee unu.” Ọ sịrị na otu onye n’ime ha ga-agarịrị kpọta nwanne ha nke nta ahụ ka ya hụ ya. Ma, Josef mechara kweta na ya ga-ahapụ ha ka ha gaa kpọta nwanne ha nke nta ahụ ma ọ bụrụ na otu onye n’ime ha ga-anọ, ndị nke ọzọ agawa.—Jenesis 42:9-20.

Ụmụnne Josef bidoro ịta onwe ha ụta maka ihe ha mere afọ iri abụọ gara aga. Ma, ha amaghị na Josef na-aghọta ihe niile ha na-ekwu. Ha nọ na-ekwu, sị: “O doro anya na anyị bụ ndị ikpe mara n’ihe metụtara nwanne anyị nwoke, n’ihi na anyị hụrụ otú mkpụrụ obi ya si nọrọ ná mwute mgbe ọ nọ na-arịọ anyị ka anyị nweere ya ọmịiko, ma anyị egeghị ntị. Ọ bụ ya mere ahụhụ a ji dakwasị anyị.” Josef nụrụ ihe niile ha kwuru, anya mmiri agbawa ya. Ma, o si n’ebe ha nọ pụọ ka ha ghara ịma na ọ na-ebe ákwá. (Jenesis 42:21-24) Ma, ọ ma na ihe e ji ama ma mmadụ ò chegharịala abụghị naanị ma onye ahụ kwaa ụta mgbe ọ na-ata ahụhụ ihe o mere. N’ihi ya, o lere ha ule.

Ọ kpọchiri Simiọn n’ụlọ nga ma hapụ ndị ọzọ ka ha lawa. O kwukwara ka e tinyeghachiri ha ego ha n’akpa nri ndị ha bu na-ala. Mgbe ha laruru, chọọ ịgaghachi Ijipt, ha rịọsiri nna ha Jekọb arịrịọ ike ka o kwe ka ha kpọrọ Benjamin gaa. Ma, ọ rara ahụ́ tupu ha emee ka Jekọb kweta. Mgbe ha lọghachiri Ijipt, ha gwara onye na-elekọta ụlọ Josef na ha hụrụ ego n’akpa ha, na ha jikwa ya bịa ka ha nye ha ya. Ihe ahụ ha mere dị mma. Ma, Josef chọkwuru ịma ma hà agbanweela n’eziokwu. O meere ha oriri. Ma, o kweghị ka ha mata otú obi dị ya mgbe ọ hụrụ Benjamin. O mechakwara bunye ha ihe oriri ma hapụ ha ka ha lawa. Ma, e zoro iko ọlaọcha Josef n’akpa Benjamin.—Jenesis 42:26–44:2.

Josef ma na ugo eberela ná mgbagbu. Ọ gwara onye ahụ na-elekọta ụlọ ya ka ọ chụwa ha, jide ha ma kpọghachi ha n’ihi na ha zuuru iko ya. Mgbe a hụrụ iko ahụ n’akpa Benjamin, a kpọghachiri ha niile n’ụlọ Josef. Ugbu a ka Josef ga-amatazi ma ụmụnne ya hà agbanweela n’eziokwu. Juda kwuchitere ọnụ ụmụnne ya ndị nke ọzọ. O bidoro rịwa ka e meere ha ebere. Ọ sịdịrị ka ha niile nọrọzie n’Ijipt gbawa ohu. Ma, Josef gwara ha na ọ bụ naanị Benjamin ga-anọ n’Ijipt gbawa ohu, na ndị nke ọzọ niile ga-alawa.—Jenesis 44:2-17.

Juda gwaziri Josef okwu metụrụ ya n’obi. Ọ gwara ya na ọ bụ ‘naanị Benjamin fọdụrụ n’ime ndị nne ya mụrụ, nna ya hụkwara ya n’anya.’ Josef bụ ọkpara Rechel nwunye Jekọb. Jekọb hụkwara nwunye ya a n’anya. Ma, Rechel nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa ya nke abụọ bụ́ Benjamin. O doro anya na mama Josef anaghị apụ Josef apụ n’obi otú ahụ ọ na-anaghịkwa apụ nna ha n’obi. Ọ ga-abụ ya mere Josef ji hụ Benjamin n’anya nke ukwuu.—Jenesis 35:18-20; 44:20.

Juda nọgidere na-arịọ Josef ka Benjamin ghara ịgbawa ohu. Ọ gwadịrị ya ka ọ hapụ ka ya gbachitere Benjamin ohu. Ọ gwaziri ya ihe a na-emetụ n’obi: “Olee otú m ga-esi lakwuru nna m n’akpọghị nwa okoro a wee jiri anya m hụ ọdachi ga-adakwasị nna m?” (Jenesis 44:18-34) O doola anya ugbu a na Juda agbanweela. Ihe a o mere gosiri  na o chegharịala, gosikwa na o nwere obi nwanne, na ọ naghị achọ naanị ọdịmma onwe ya, nakwa na ihe banyere onye ọzọ na-emetụ ya n’obi.

Josef chọpụtara na ụmụnne ya agbanweela

Josef enweghịzi ike ijide onwe ya. Ákwá juru ya obi. Ọ gwara ndị niile na-ejere ya ozi ka ha pụọ n’èzí. Mgbe ha pụchara, o bidoro besiwe ákwá ike nke mere na ndị nọ n’ụlọ Fero nọ na-anụ olu ya. Ọ gwaziri ụmụnne ya onye ọ bụ. Ọ gwara ha, sị: “Abụ m Josef nwanne unu.” Ihe a o kwuru gbara ụmụnne ya gharịị. Ma, ọ gara makụọ ha ma gwa ha na ya agbagharala ha maka ihe ọjọọ niile ha mere ya. (Jenesis 45:1-15) Josef gbaghaara ndị mejọrọ ya otú ahụ Jehova na-eme. (Abụ Ọma 86:5) Ànyị na-eme ka Josef?

“Ị KA NỌ NDỤ”

Mgbe Fero nụrụ ihe mere mkpọtụ ji na-eme n’ụlọ Josef, ọ kpọrọ Josef ma gwa ya ka ọ kpọta nna ya na ndị ezinụlọ ha niile n’Ijipt. O teghị aka, nna Josef akwata Ijipt, ya na Josef ahụ. Mgbe Jekọb hụrụ Josef nwa ya, o bewere ákwá ma sị: “Adị m njikere ịnwụ ugbu a, ugbu a m hụworo ihu gị, ebe ọ bụ na ị ka nọ ndụ.”—Jenesis 45:16-28; 46:29, 30.

Jekọb dịkwuru ndụ afọ iri na asaa ọzọ mgbe ọ bịachara Ijipt. Afọ ole a ọ dịkwuru ndụ nyekwara ya ohere ịgọzi ụmụ ya iri na abụọ. Jekọb nyere Josef bụ́ nwa ya nwoke nke iri na otu òkè abụọ a na-enyekarị diọkpara. A ga-esi n’ụmụ Josef abụọ nweta ebo abụọ n’Izrel. Juda kwanụ, bụ́ nwa ya nwoke nke anọ? Ọ bụ ya kacha ụmụnne ya ndị ọzọ niile gosi na ya agbanweela. Ngọzi nke ya pụkwara iche. Nna ya gwara ya na onye ga-abụ Mesaya ga-esi n’ezinụlọ ya.—Jenesis, isi nke 48 na 49.

Jekọb nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri anọ na asaa. Mgbe ọ nwụrụ, ụmụnne Josef chere na Josef ga-achọzi imegwara ha ihe ọjọọ ha mere ya ebe ọ bụzi nnukwu mmadụ. Ma, Josef mere ka obi sie ha ike na o nweghị ihe ya ga-eme ha. O teela Josef ma na aka Jehova dị n’ọbịbịa ha bịara Ijipt. Ọ gwara ha ka ha kwụsị ịna-enwe mwute maka ihe ha mere ya. Ọ jụziri ha, sị: “Ànọ m n’ọnọdụ Chineke?” (Jenesis 15:13; 45:7, 8; 50:15-21) Josef ma na ọ bụ Jehova nwe ikpe ikpe, nakwa na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Oleezi otú Josef ga-esi mesiwe ụmụnne ya Jehova gbaghaarala ike?—Ndị Hibru 10:30.

Ò nwere mgbe ọ na-esiri gị ike ịgbaghara mmadụ ihe ọjọọ o mere gị? Ọ na-akacha esi ike ma ọ bụrụ na onye ahụ kpachaara anya mee gị ihe ahụ. Ma, ọ bụrụ na onye mejọrọ gị akwaa ụta maka ihe o mere gị, i kwesịrị iji obi gị niile gbaghara ya. Ọ ga-abara ma gị ma onye ahụ uru. Ọ ga-egosikwa na ị na-eṅomi Josef na Jehova bụ́ Nna anyị na-eme ebere.

^ para. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2014; Nọvemba 1, 2014; na Febụwarị 1, 2015.