Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MEE 2015

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ihe ndị e gwupụtara n’ala hà gosiri na ihe ndị e dere na Baịbụl bụ eziokwu?

Onye a bụ Eze Asiria aha ya bụ Sagọn nke abụọ e kwuru okwu ya n’Aịzaya 20:1

Otu isiokwu gbara n’akwụkwọ a na-akpọ Biblical Archaeology Review kwuru na e nwere, ‘ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, mmadụ iri ise’ a kpọrọ aha n’Agba Ochie aha ha dịkwa n’ihe ndị e gwupụtara n’ala. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị eze iri na anọ chịrị Juda na Izrel, ma ndị nke a na-anụ aha ha, dị ka Devid na Hezekaya, ma ndị nke a na-anaghị anụcha aha ha, dị ka Menahem na Pika. Ndị ọzọ sokwa ná ndị a hụrụ aha ha n’ihe ndị e gwupụtara n’ala bụ ndị eze ise chịrị Ijipt na ndị eze iri na itoolu chịrị Asiria, Babịlọn, Moab, Peshia, na Siria. Ma, ọ bụghị naanị ndị eze ka a hụrụ aha ha n’ihe ndị ahụ e gwupụtara n’ala. Ndị ọzọ a hụkwara aha ha bụ ndị isi nchụàjà, otu odeakwụkwọ, na ndị ọzọ nwere ọrụ pụrụ iche ha na-arụ.

Isiokwu ahụ gbara n’akwụkwọ ahụ anyị kwuburu okwu ya kwukwara na “ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ kweere” na ọ bụ ndị ahụ e kwuru okwu ha na Baịbụl bụ ndị ahụ aha ha dị n’ihe ndị ahụ e gwupụtara n’ala. E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ a kpọrọ aha n’Agba Ọhụrụ aha ha dịkwa n’ọtụtụ ihe ndị e gwupụtara n’ala. Ha bụ ndị dị ka Herọd, Pọntiọs Paịlet, Taịbiriọs, Keyafas, na Sajiọs Pọlọs.

Olee mgbe a kwụsịrị ịhụ ọdụm n’obodo ndị dị n’oge e dere Baịbụl?

Ọdụm e ji ọmarịcha brik ndị na-egbuke egbuke tụọ n’ahụ́ mgbidi n’obodo Babịlọn

Ọ bụ eziokwu na o nweghịzi ọdụm dị n’Izrel taa, ma ndị dere Baịbụl kwuru okwu banyere ọdụm ihe dị ka otu narị ugboro na iri ise. O gosiri na ndị ahụ dere Baịbụl ma banyere ọdụm. N’ọtụtụ n’ime ebe ndị ahụ e kwuru okwu ọdụm na Baịbụl, ọ bụ ihe atụ ka e ji ha mee. Ma, o nwekwara ebe ụfọdụ e kwuru na Baịbụl gbasara ọdụm nkịtị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na Samsịn, Devid, na Benaya gbuchara ọdụm. (Ndị Ikpe 14:5, 6; 1 Samuel 17:34, 35; 2 Samuel 23:20) O nwekwara ndị o kwuru ọdụm gburu.1 Ndị Eze 13:24; 2 Ndị Eze 17:25.

N’oge gboo, e nwere ọdụm ndị dị n’Eshia Maịnọ, Gris, Palestaịn, Siria, Mesopotemia, nakwa n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ India. A na-atụ ọdụm ndị a ezigbo ụjọ, na-akwanyekwara ha ezigbo ùgwù. Ndị na-ese ihe n’oge ahụ na-esekarịkwa ha n’ihe osise ha. N’obodo Babịlọn, e nwekwara ọdụm ndị e ji ọmarịcha brik ndị na-egbuke egbuke tụọ n’ahụ́ mgbidi ndị dị n’Okporo Ámá E Si Agafe n’Oge Ememme.

E kwukwara na ndị agha ndị Krisendọm chụrụ nta ọdụm na Palestaịn n’ihe dị ka n’agbata afọ 1160 na afọ 1200. Ma, obere oge afọ 1300 gachara, o yiri ka e nweghịzi ọdụm ka fọrọ ebe ahụ. Ma, ruo n’ihe dị ka n’afọ 1801, ndị ụfọdụ na-ekwu na ha ka na-ahụ ọdụm na Mesopotemia nakwa na Siria. Ruokwa n’ihe dị ka n’afọ 1901, o nwekwara ndị na-ekwu na ha ka na-ahụ ọdụm n’Ịran nakwa n’Ịrak.