N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta àjà ahụ ọ na-aga ịchụ. Ọ gwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.

N’afọ a, a ga-echeta ọnwụ Jizọs na Fraịdee, abalị atọ n’ọnwa Eprel, mgbe anyanwụ dachara. Ndịàmà Jehova na-akpọ gị na ndị ezinụlọ gị ka unu bịa ncheta ọnwụ Jizọs a, nakwa ka unu gere okwu ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa ka Jizọs nwụọ maka anyị na uru ọnwụ ya ga-abara unu.