Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mach 2015

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Ista Ọ̀ Bụ Ememme Ndị Kraịst n’Eziokwu?

Ista Ọ̀ Bụ Ememme Ndị Kraịst n’Eziokwu?

Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na Ista bụ ‘ememme Ndị Kraịst na-eme iji na-echeta Mbilite n’Ọnwụ Jizọs Kraịst.’ Ma, ememme a ọ̀ bụ ememme Ndị Kraịst n’eziokwu?

Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịchọpụta ma ihe ọ̀ bụ nke ezigbo ya ka ọ̀ bụ nke adịgboroja, o kwesịrị ileru ya anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ịma ma Ista ọ̀ bụ ememme Ndị Kraịst ka ọ̀ bụ na ọ bụghị, anyị kwesịrị ileru ihe gbasara ya anya nke ọma.

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ ya. Pọl onyeozi kpọrọ ncheta ọnwụ Jizọs a “Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.”—1 Ndị Kọrịnt 11:20; Luk 22:19, 20.

Ihe ọzọ bụ na akwụkwọ ahụ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwukwara na “o nweghị ihe jikọrọ” ihe ndị a na-eme n’oge Ista na mbilite n’ọnwụ Jizọs, “kama na e si n’omenala ndị mmadụ nweta ha.” Dị ka ihe atụ, mgbe akwụkwọ ahụ na-ekwu gbasara àkwá na oké bekee a na-eji agba Ista n’ọtụtụ mba, ọ sịrị na ‘àkwá ahụ nọchiri anya ndụ ọhụrụ na-esi n’àkwá apụta ma àkwá gbawaa.’ O kwukwara na “ihe e ji mara oké bekee bụ na ọ na-amụ ọtụtụ ụmụ. Ọ bụ ya mere e ji were ya ka ihe na-egosi oge ihe a kụrụ n’ubi ji eme nke ọma.”

Otu nwoke aha ya bụ Philippe Walter, onye mụrụ gbasara akwụkwọ ndị mgbe ochie, kwuru otú e si webata omenala ndị a n’ememme Ista. O kwuru na “mgbe ndị mmadụ na-achọ otú ha ga-esi eme ka ndị ọgọ mmụọ ghọọ Ndị Kraịst,” ha mere ka otu ememme ndị ọgọ mmụọ na-eme yie ka ò nwere ihe jikọtara ya na mbilite n’ọnwụ Jizọs. Ndị ọgọ mmụọ a na-eme ememme a maka na “oge oyi agaala, oge opupu ihe ubi eruwekwala.” Nwoke ahụ kwukwara na ọ bụ otú ahụ ka e si bido mewe “ememme Ndị Kraịst” n’oge ndị ọgọ mmụọ ji eme nke ha. Ihe a meziri ka ọ dịrị ọtụtụ ndị ọgọ mmụọ mfe ịbata na chọọchị.

Ma, e sighị otú a mee ka ndị mmadụ ghọọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi Jizọs. Baịbụl kwuru na ndịozi ahụ bụ “ihe mgbochi” mgbe ahụ. Ha ekweghị ka e webata ihe ndị ọgọ mmụọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (2 Ndị Tesalonaịka 2:7) Pọl onyeozi kwuru na mgbe ọ “pụsịrị,” e nwere ndị ga-ebido “na-ekwu ihe gbagọrọ agbagọ iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ Ndịozi 20:29, 30) Ná ngwụcha oge ndịozi Jizọs, Jọn onyeozi kwuru na e nweela ndị malitere iduhie Ndị Kraịst. (1 Jọn 2:18, 26) Ihe a meziri ka ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst mechaa mewe omenala ndị ọgọ mmụọ.

“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.”2 Ndị Kọrịnt 6:14

Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ihe ndị ahụ a na-eme n’oge Ista enweghị ihe ha mere, ebe ọ bụ na o mere ka “ndị ọgọ mmụọ” ghọtakwuo ihe mbilite n’ọnwụ Jizọs pụtara. Ma, ọ bụrụ na Pọl onyeozi nọ ya ugbu a, ọ gaghị ekweta n’ihe a ndị mmadụ chere. Ọ bụ eziokwu na Pọl hụrụ ọtụtụ omenala ndị ọgọ mmụọ mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma n’obodo dị iche iche ndị Rom na-achị, ma o webataghị omenala ndị ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ka o nwee ike inyere ndị ọgọ mmụọ aka ịmatakwu banyere Jizọs. Kama ime otú ahụ, ọ dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu? Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere? ‘Ya mere, sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’”—2 Ndị Kọrịnt 6:14, 17.

Olee ihe anyị chọpụtara ugbu a anyị lebachara anya n’ihe ụfọdụ gbasara Ista? O doola anyị anya na Ista abụghị ememme Ndị Kraịst.