Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE MACH 2015

Onyinye A Na-enye Ndị Eze

Onyinye A Na-enye Ndị Eze

“Ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ, . . . meghekwara igbe akụ̀ ha wee nye ya onyinye, ya bụ, ọlaedo na frankinsens na mea.”—Matiu 2:1, 11.

Ọ BỤRỤ na ị chọrọ inye eze obodo unu ma ọ bụ onye ọzọ a ma ama onyinye, gịnị ka ị ga-enye ya? N’oge ochie, e weere ihe ndị na-esi ísì ọma otú e si were ọlaedo, nke na a na-eji ha enye ndị eze onyinye. * Ọ bụ ya mere ihe abụọ na-esi ísì ọma ji dịrị n’onyinye ahụ ndị na-agụ kpakpando nyere “eze ndị Juu.”—Matiu 2:1, 2, 11.

Mmanụ bọlsọm

Baịbụl gwakwara anyị na mgbe eze nwaanyị Shiba bịara ileta Sọlọmọn, o nyere ya “ọlaedo dị otu narị talent na iri abụọ na mmanụ bọlsọm dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa; ọ dịghị mmanụ bọlsọm ha ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn.” * (2 Ihe E Mere 9:9) E nwekwara ndị eze ndị ọzọ na-ewetara Sọlọmọn mmanụ bọlsọm iji gọọrọ ya ọfọ ọma.—2 Ihe E Mere 9:23, 24.

Gịnị mere e ji achọsi ihe ndị a na-esi ísì ọma ike mgbe ahụ, ha ana-adakwa ọnụ? Ọ bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị e ji ha eme. Dị ka ihe atụ, a na-eji ha eme ihe ndị e ji achọ mma, jiri ha efe ofufe, jirikwa ha akwadebe ozu maka olili. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe A Na-eji Ihe Ndị Na-esi Ísì Ọma Eme n’Oge Ochie.”) E wezụgakwa na a na-achọsi ha ike, ihe ọzọ mere ihe ndị ahụ na-esi ísì ọma ji ada ọnụ bụ na a na-emefu nnukwu ego iji tụbata ha.

ỊGAFE ỌZARA AREBIA

Kashịa

N’oge ochie, ụfọdụ osisi ndị e si na ha emepụta ihe ndị na-esi ísì ọma dị na Ndagwurugwu Jọdan. Ma, a na-atụbata ihe ndị ọzọ na-esi ísì ọma atụbata. E nwere ọtụtụ ihe na-esi ísì ọma e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha a kacha mara bụ okooko safrọn, ahịhịa alo, mmanụ bọlsọm, sinamọn, frankinsens, na mea. E nwekwara ihe ndị na-esi ísì ọma e ji eme ka nri dịkwuo ụtọ, dị ka, kọmin, mkpá akwụkwọ mint, na mkpá akwụkwọ dil.

Olee ebe e si enweta ihe ndị a na-esi ísì ọma? E si na Chaịna, India, na Siri Lanka enweta ahịhịa alo, osisi kashịa, na sinamọn. Ebe e si enweta mea na frankinsens bụ n’osisi ndị dị n’ọzara malite n’ebe ndịda Arebia ruo Somalịa dị n’Afrịka. Ma, ọ bụ naanị n’India ka e si enweta ihe e ji eme mmanụ nad nke a na-akpọkwa mmanụ spaịknad.

Okooko safrọn

A na-esi Arebia ebubata ọtụtụ ihe ndị a na-esi ísì ọma n’Izrel. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe ndị a na-esi ísì ọma kwuru na n’ihe dị ka n’agbata puku afọ anọ na puku afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị Arebia kacha esi ná mba ndị dị n’Eshia eburu ngwá ahịa aga ná mba ndị dị na Yurop. Na Negev, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Izrel, e nwere ihe ndị gosiri na ndị a na-agba ahịa ihe ndị na-esi ísì ọma na-esi n’obodo ahụ agafe. Ihe ndị ahụ bụ ụlọ ndị mgbe ochie, ebe ndị e wusiri ike ndị agha na-anọ, na ebe dị iche iche ndị ahịa na-akwụsịtụ ezuru ike. Ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ  òtù UNESCO kwuru na otú e si rụọ ebe ndị ahụ ‘gosiri na ndị a na-esi n’ebe ndịda Arebia ebu ahịa aga n’obodo ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian na-enweta ezigbo ego n’ahịa a ha na-agba.’

Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book of Spices kwuru, sị: “Ihe ndị na-esi ísì ọma na-adị ntakịrị, dị ọnụ, dịkwa ụkọ. A na-achọsikwa ha ike.”

Ndị ahịa a na-ebu ihe ndị a na-esi ísì ọma aga n’ebe dị iche iche n’Arebia. Ha na-aga ihe dị ka otu puku kilomita na narị asatọ iji gazuo ebe ndị a. (Job 6:19) Baịbụl kọrọ gbasara ndị Ishmel si Gilied buru ngwá ahịa ha, bụ́ ihe ndị na-esi ísì ọma, na-aga Ijipt. Ha bu “mmanụ labdanọm na mmanụ bọlsọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó.” (Jenesis 37:25) Ụmụ Jekọb resịrị ndị ahịa a Josef nwanne ha ka ọ gaa gbawa ohu.

Ọ DỊBEGHỊ NGWÁ AHỊA E ZOCHIRI OTÚ E SI ENWETA YA KARỊA YA

Mkpá akwụkwọ dil

Ọ bụ naanị ndị ahịa Arebia gbara ahịa ihe ndị a na-esi ísì ọma ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ bụ naanị ha na-esi ná mba ndị dị n’Eshia ebuga kashịa na sinamọn ná mba ndị ọzọ. E nwere ihe ndị ahịa Arebia ndị a na-eme ka ndị bi ná mba ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian ghara iso ha na-agba ahịa a ha na-agba. Ha na-akọrọ ha akụkọ ndị ga-eme ka ụjọ na-atụ ha iso ha gbawa ahịa a. Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book of Spices sịrị na ‘ọ dị ka ọ dịbeghị ngwá ahịa e zochirila otú e si enweta ya karịa otú e sirila zochie otú e si enweta ihe ndị a na-esi ísì ọma.’

Kọmin

Olee ihe ndị Arebia a na-akọrọ ndị ọzọ? N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị anọ gara aga, otu onye Grik bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Herodotus kọrọ na nnukwu nnụnụ na-eji ụgbụgbọ osisi sinamọn akpa akwụ ha n’ugwu ndị dị ezigbo elu. Ọ sịrị na ndị na-eweta sinamọn na-edowe ọtụtụ ọkpụrụkpụ anụ n’ala ala ugwu ndị ahụ. Nnụnụ ndị ahụ na-abịazi na-eburu anụ ndị ahụ etinye n’akwụ ha, ya emezie ka akwụ ha daa. Ndị na-eweta sinamọn na-emezi  ngwa ngwa buru ụgbụgbọ sinamọn ndị ahụ gaa resị ndị na-agba ahịa ihe ndị na-esi ísì ọma. Akụkọ a na akụkọ ndị ọzọ yiri ya bịara gbasaa ebe niile. Akwụkwọ ahụ a na-akpọ The Book of Spices kwukwara na n’ihi otú a ‘a sịrị o si esi ike inweta sinamọn, a na-ere ya oké ọnụ.’

Mkpá akwụkwọ mint

Ma e mechara mata ihe a ndị Arebia na-ezo ezo kemgbe. Ndị ọzọ esorozie gbawa ahịa ihe ndị a na-esi ísì ọma. N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e bidoro na-ebubata ma na-ere ọtụtụ ihe ndị na-esi ísì ọma n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’Alegzandria n’Ijipt. Mgbe ụfọdụ, ikuku na-eku n’Oké Osimiri India na-eche ihu n’ebe e si aga India. Mgbe ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ndị Rom matara na ikuku a nwere ike inyere ha aka ịkwọrọ ụgbọ ha ruo India, ha bidoro na-esi n’Ijipt akwọ ụgbọ ha aga India. Ihe a meziri ka ihe ndị a na-esi ísì ọma bụrụ atụrụ tawa, ọnụ ahịa ha adalatakwa.

Taa, ndị mmadụ weere ọlaedo ka ihe bara uru karịa ihe ndị na-esi ísì ọma. Ọ na-esikwa ike ịhụ onye ga-ele ihe ndị na-esi ísì ọma anya ka onyinye a ga-enye eze. Ma, ọtụtụ ndị ka na-eji ihe ndị a na-esi ísì ọma eme sent na ọgwụ, ha na-ejikwa ha esi nri. Nke bụ́ eziokwu bụ na ísì ọma ihe ndị a nwere na-amasị anyị taa otú ahụ ọ masịkwara ndị oge gboo.

Sinamọn

^ para. 3 N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, ihe a na-akpọ ihe na-esi ísì ọma bụ ahịhịa na-esi ísì ọma, ọ bụghị ihe e ji eme ka nri dị ụtọ.

^ para. 4 “Mmanụ bọlsọm” bụ ihe dị mmiri mmiri ma ọ bụ mmanụ na-esi ísì ọma a na-esi n’osisi enweta.