Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Febụwarị 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA Ị GA-EME KA ỌRỤ GỊ NA-ATỌ GỊ ỤTỌ?

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?

Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?

Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.” (Ekliziastis 3:13) Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka ọrụ anyị na-atọ anyị ụtọ, ọ̀ bụ na ọ gaghị agwa anyị ihe anyị ga-eme ka ọrụ anyị nwee ike na-atọ anyị ụtọ? (Aịzaya 48:17) Obi dị anyị ụtọ na ọ gwala anyị ya na Baịbụl. Lee ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka ọrụ gị na-atọ gị ụtọ.

WERE ỌRỤ GỊ KA IHE NA-ABARA GỊ URU

Ma ị̀ na-arụ ọrụ e ji ike ọkpụkpụ aka arụ, ma ị̀ na-arụ n’ọfis, ma ị̀ na-arụkwanụ ụdị ọrụ ọzọ, cheta na “uru dị n’ụdị ndọgbu n’ọrụ niile.” (Ilu 14:23) Olee uru dị na ya? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ị ga-esi na ya na-enweta ihe ị ga-eji na-egbo mkpa gị. Chineke kwere ndị na-efe ya nkwa na ya ga na-egboro ha mkpa ha. (Matiu 6:31, 32) Mana, ọ chọkwara ka anyị na-agbalị akpa afọ anyị n’arụrụghị aka.—2 Ndị Tesalonaịka 3:10.

N’ihi ya, i kwesịrị ị na-ele ọrụ gị anya ka ihe na-enyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime. Ọrụ anyị na-enyere anyị aka igbo mkpa anyị. Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na ise aha ya bụ Joshua kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị na-akpali afọ gị, e kwesịrị ikwe gị n’aka. Ọ bụrụkwa na ị na-akpata ego na-ezuru gị igbo mkpa gị, mara na ọrụ ị na-arụ efughị ọhịa.”

Ọrụ ị na-arụsi ike ga-emekwa ka ị mara na i zuru ka e mee. A sịdị kwuwe, ịrụsi ọrụ ike adịghị mfe. Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-arụ ọrụ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ na o siri ike, anyị ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-agba mbọ eme ihe na-adịghị mfe. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ na anyị na-eme ihe gosiri na anyị abụghị ndị umengwụ. (Ilu 26:14) Ihe ndị a gosiri na ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ mara na ya zuru ka e mee. Aaron anyị dere ihe o kwuru  n’isiokwu bu nke a ụzọ kwukwara, sị, “Obi na-adị m ụtọ ma m rụchaa ọrụ lọta. Ọ bụ eziokwu na ike na-agwụcha m, o nwekwara ike ndị ọzọ agaghịdị ama na o nwere ihe m rụrụ, ma ama m na agbaala m mbọ.”

TINYE UCHE GỊ N’ỌRỤ GỊ

Baịbụl kwuru okwu ọma banyere nwoke “nwere nkà n’ọrụ ya,” na nwaanyị ‘na-arụ ọrụ ọ bụla aka ya nwere mmasị ịrụ.’ (Ilu 22:29; 31:13) Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ga-agbarịrị mbọ tupu ọrụ ya edoo ya anya. Ọ bụrụkwa na ọrụ mmadụ na-arụ edoghị ya anya, ọ ga-esi ike ka ọ na-atọ onye ahụ ụtọ. Ọ ga-abụ ya mere ọrụ ọtụtụ ndị anaghị atọ ha ụtọ n’ihi na ha agbasibeghị mbọ ike ka ọrụ ha doo ha anya.

Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ nwere ike ime ka ụdị ọrụ dị iche iche na-atọ ya ụtọ. Naanị ihe onye ahụ ga-eme bụ itinye uche ya n’ọrụ ahụ mụta ya nke ọma. Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ William kwuru, sị: “Mmadụ tinye ike ya niile n’ọrụ ọ na-arụ ma hụ ihe ọ rụpụtara, obi na-abụ ya sọ aṅụrị. Ma, obi agaghị abụ onye ahụ sọ aṅụrị ma ọ bụrụ na o ji aghụghọ rụọ ọrụ ahụ ma ọ bụkwanụ na ọ rụrụ ya elu elu.”

NA-ECHETA OTÚ ỌRỤ GỊ SI ABARA NDỊ ỌZỌ URU

Adịla na-eche naanị gbasara ego ole ị na-enweta n’ọrụ ị na-arụ. Kama nke ahụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Olee uru ọrụ a m na-arụ bara? Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na a rụghị ya, ma ọ bụkwanụ na a rụghị ya nke ọma? Olee otú ọrụ a m na-arụ si abara ndị ọzọ uru?’

Ọ ga-adị mma ma i chebara ajụjụ nke ikpeazụ a ezigbo echiche, n’ihi na ọrụ mmadụ na-arụ ga-akacha na-atọ ya ụtọ ma ọ hụ otú o si abara ndị ọzọ uru. Jizọs sịdịrị na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ihe anyị na-eme na-abara ndị ahịa anyị na ndị anyị na-arụrụ ọrụ uru. Ma, ọ na-abakwara ndị ezinụlọ anyị na ndị nọ ná mkpa uru.

Ndị ezinụlọ anyị. Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ na-agba mbọ na-akpa afọ ezinụlọ ya, o pekata mpe, e nwere ụzọ abụọ ihe ọ na-eme si abara ndị ezinụlọ ya uru. Nke mbụ bụ na ọ na-eme ka ha nweta ihe ndị dị ha mkpa, ya bụ, ihe oriri, uwe, na ebe obibi. Onye na-agba mbọ otú a na-eme ihe Chineke gwara ndị isi ezinụlọ ka ha na-eme, ya bụ, ka ha ‘na-egboro ndị nke ha mkpa ha.’ (1 Timoti 5:8) Nke abụọ bụ na onye na-agba mbọ akpa afọ ezinụlọ ya na-akụziri ụmụ ya na ịrụsi ọrụ ike bara uru. Shane, onye anyị dere ihe o kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, kwuru, sị: “E ji ịrụsi ọrụ ike mara papa m. Kemgbe ụwa ya, ọ na-arụsi ọrụ ike, na-akwụwakwa aka ya ọtọ. Ọrụ kapịnta ka ọ rụrụla karịchaa. Esi m n’aka ya mụta uru ọ bara ịrụ ọrụ aka ga-abara ndị ọzọ uru.”

Ndị nọ ná mkpa. Pọl Onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha ‘na-arụsi ọrụ ike ka ha nwee ihe ha ga-ekenye ndị nọ ná mkpa.’ (Ndị Efesọs 4:28) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ na-akpa afọ anyị na ndị ezinụlọ anyị, anyị nwekwara ike inwe ihe anyị ga-enyetụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. (Ilu 3:27) Ihe a gosiri na ịrụsi ọrụ ike na-eme ka mmadụ nwee ihe  ọ ga-enyetụ onye ọzọ, si otú ahụ nweta obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe.

NA-ARỤ IHE KARỊRỊ IHE A TỤRỤ ANYA KA Ị RỤỌ

Mgbe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ihe n’elu ugwu, ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl, soro ya gaa maịl abụọ.” (Matiu 5:41) Olee otú i nwere ike isi mee ihe a Jizọs kwuru ma a bịa n’ọrụ ị na-arụ? Kama ịrụ naanị obere ihe kwụsị, gbalịa rụọ ihe karịrị ihe a tụrụ anya ka ị rụọ. Kpebie ihe ndị ị ga-eme. Dị ka ihe atụ, kpebisie ike na ị ga-eme ka ọrụ gị ka mma, ma ọ bụkwanụ na ị ga-arụ ya ngwa ngwa karịa. Elegharala ihe ọ bụla gbasara ọrụ gị anya, ọ sọgodị ya ya bụrụ ntakịrị ihe.

Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ arụ ihe karịrị ihe a tụrụ anya ka ị rụọ, o nwere ike ime ka ọrụ gị na-atọ gị ụtọ. Gịnị mere ọ ga-eji na-atọ gị ụtọ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ gịnwa ji aka gị kpebie ịrụ karịa ihe a tụrụ anya na ị ga-arụ. Ị naghị eme ya n’ihi na mmadụ na-amanye gị mee ya. (Faịlimọn 14) Ihe a na-echetara anyị ihe dị n’akwụkwọ Ilu 12:24. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ aka ndị dị uchu ga-achị achị, ma aka dị umengwụ ka a ga-amanye ịrụ ọrụ.” O nwere ike a naghị amanye gị ịrụ ọrụ ma ọ bụ ịgba ohu. Ma, ọ bụrụ na ị naghị arụ ihe a tụrụ anya ka ị rụọ, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ na-agba ohu n’ihi na a ga na-atụ anya ka ị rụkwuo. Ma, ọ gaghị adị onye na-arụ ihe karịrị ihe a tụrụ anya ka ọ rụọ ka ọ̀ na-agba ohu, n’ihi na ọ bụ ya ji aka ya kpebie ịrụ ya.

EKWELA KA ỌRỤ GỊ GBOCHIE GỊ IME IHE NDỊ ỌZỌ DỊ MKPA

Ịrụsi ọrụ ike dị mma. Ma, anyị kwesịkwara icheta na e nwere ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ịna-eme ná ndụ. Baịbụl gbara anyị ume ka anyị dị uchu n’ọrụ anyị. (Ilu 13:4) Ma, ọ gwaghị anyị ka anyị na-anwụ n’ọrụ. Ekliziastis 4:6 sịrị na “obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” Gịnị ka ihe a e kwuru n’Ekliziastis pụtara? Ọ pụtara na ọ bụrụ na mmadụ na-arụgbu onwe ya n’ọrụ, o nwere ike onye ahụ agaghịzi eji obi ụtọ eri ihe ọ na-arụta n’ọrụ. Onye ahụ ga-adị ka onye ‘na-achụso ifufe.’ O nweghịzi uru ọrụ ya baara ya.

Baịbụl ga-enyeliri anyị aka ịna-ele ọrụ anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ gwara anyị ka anyị na-agba mbọ n’ọrụ anyị. Ma, ọ gwakwara anyị ka anyị “chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Gịnị bụ ihe ndị ahụ ka mkpa? Ihe ndị so na ha bụ iso ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị na-anọrị. Ma, nke kacha mkpa bụ iwepụta oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke, dị ka ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na ya.

Ndị na-arụsi ọrụ ike ma na-ewepụta oge eme ihe ndị ọzọ dị mkpa na-aka enwe obi ụtọ n’ọrụ ha. William anyị dere ihe o kwuru ná mmalite kwuru, sị: “Otu onye m na-arụburu ọrụ bụ onye e ji ama atụ ma a bịa n’ịrụsi ọrụ ike na iwepụta oge eme ihe ndị ọzọ dị mkpa. Obi na-abụ ndị na-ewetara ya ọrụ sọ aṅụrị maka otú o si arụrụ ha ọrụ nke ọma. Ma, a gbasahaala ọrụ, ọ na-etinyezi uche n’ihe gbasara ndị ezinụlọ ya na ihe gbasara ofufe ọ na-efe Chineke. Ịgwa gị eziokwu, o so ná ndị m ma kacha enwe obi ụtọ.”

GỤKWUO GBASARA YA

TETA!

Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị Nke Ọma

Ihe ise ga-enyere gị aka ka ihe na-agara gị nke ọma.