Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Jenụwarị 2015

Ndị Bụ́ Di—Meenụ Ka Obi Na-eru Nwunye Unu Ala

Ndị Bụ́ Di—Meenụ Ka Obi Na-eru Nwunye Unu Ala

OLEE otú di ga-esi eme ka obi na-eru nwunye ya ala? Ọtụtụ ndị chere na ọrụ kacha mkpa nwoke nwere ịrụ bụ ịna-akpata ego ga-ezu igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Ma, obi anaghị eru ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị di ha nwere ego ala, ụjọ na-atụkwa ha. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị Spen aha ya bụ Rosa kwuru, sị: “Di m bụ ọka mma n’ámá. Ọ batahaala n’ụlọ, ya ana-ebigbọ ka ọdụm.” Nwaanyị Naịjirịa aha ya bụ Joy kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m na-ekwetaghị ihe di m kwuru, ọ na-asị m: ‘Ị ga-eme ihe ọ bụla m kwuru n’ihi na abụ m di gị.’”

Olee otú nwoke ga-esi na-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, hụkwa ha n’anya? Olee otú nwoke ga-esi eme ka obi na-eru ndị ezinụlọ ya ala ma mee ka ụlọ ha ghọọrọ nwunye ya “ebe izu ike”?—Rut 1:9.

IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA IKIKE DI NWERE

Ọ bụ eziokwu na di na nwunye enweghị onye ka ibe ya n’anya Chineke, Baịbụl kwuru na onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ọrụ ọ ga na-arụ n’ezinụlọ. Ndị Rom 7:2 kwuru na nwaanyị lụrụ di nọ n’okpuru ‘iwu di ya.’ Chineke họpụtara di ka ọ bụrụ isi nke nwunye ya otú ahụ ọtụtụ ụlọ ọrụ na-ahọpụta onyeisi ga na-ahụ maka ihe ndị a na-eme n’ụlọ ọrụ ha. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Di kwesịrị ịbụ onye mbụ ga na-ahụ na ihe na-agazi agazi n’ezinụlọ ya.

Ọ bụrụ na ị bụ di, olee ihe i kwesịrị iji ikike a Chineke nyere gị na-eme? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:25) Ọ bụ eziokwu na Jizọs Kraịst alụghị nwaanyị, ma otú o si mesoo ndị mmadụ ga-enyere gị aka ka ị bụrụ ezigbo di. Ka anyị hụ otú nke a si bụrụ eziokwu.

IHE NDỊ BỤ́ DI GA-AMỤTA N’AKA JIZỌS

Jizọs mere ka ahụ́ ruo ndị mmadụ ala ma nyere ha aka. Jizọs gwara ndị a na-emegbu emegbu na ndị nsogbu ụwa na-anyịgbu, sị: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Matiu 11:28, 29) Ọtụtụ mgbe, Jizọs nyere ha nri, gwọọ ha ọrịa ma nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọtụtụ ndị nọ na-abịa Jizọs nso n’ihi na ha ma na ọ ga-eme ka nsogbu ha belata.

Otú ndị bụ́ di ga-esi na-eme ka Jizọs. Gbalịa na-enyere nwunye gị aka n’ọrụ dị iche iche ọ na-arụ n’ụlọ. Rosa kwuru, sị: “Di m na-eme m ka m̀ bụ ohu ya.” E nwekwara ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ụwa ha dị otú ọ dị Rosa. Ma, otu nwoke aha ya bụ Kweku, bụ́ onye ya na nwunye ya bi n’udo, sịrị: “Ana m  ajụkarị nwunye m ihe ọ chọrọ ka m nyere ya aka mee. Ebe m hụrụ ya n’anya, ana m enyere ya aka arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ n’echeghị ka ọ gwa m agwa.”

Jizọs chebaara ndị mmadụ echiche, nweekwara ha ọmịiko. Otu nwaanyị dara ogbenye rịara ọrịa ọjọọ afọ iri na abụọ. Mgbe ọ nụrụ na Jizọs na-arụ ọrụ ebube, “ọ nọ na-ekwu, sị: ‘Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.’” Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Ọ gakwuuru Jizọs, metụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka, ya agbakee ozugbo. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị nọ mgbe ihe a mere kwuru n’obi ha na nwaanyị ahụ ekwesịghị imetụ Jizọs aka. Ma Jizọs matara na ọrịa ahụ ataala ya ahụhụ. * Ọ gwara nwaanyị ahụ, sị: “Nwa m nwaanyị, . . . gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.” Jizọs abaraghị ya mba ma ọ bụ menye ya ihere, kama ọ ghọtara ihe ya na ya na-alụ. Ihe a Jizọs mere gosiri na o nwere ọmịiko.—Mak 5:25-34.

Nwoke ichebara ihe ndị Jizọs mere echiche nwere ike ime ka ọ bụrụ ezigbo di na ezigbo nna

 Otú ndị bụ́ di ga-esi na-eme ka Jizọs. Ọ bụrụ na ahụ́ adịghị nwunye gị, na-enwere ya ndidi ma na-echebara ya echiche karịa otú ị na-emebu. Gbalịa ka ị ghọta ihe mere o ji ele ihe anya otú o si ele ya nakwa ihe mere o ji eme ihe ụfọdụ ọ na-eme. Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Ricardo kwuru, sị: “M chọpụta na ahụ́ na-agbakasị nwunye m, m na-agbalịsi ike ka m ghara ikwu ihe ga-eme ka iwe wekwuo ya.”

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-ekwurịta okwu. Jizọs na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha na-amaghị, na-agwakwa ha otú obi dị ya. Ọ gwara ha, sị: “Ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe Jizọs na-achọ ịnọ naanị ya chee echiche ma kpee ekpere, ma ọtụtụ mgbe, ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ihe dị ya n’obi. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs ka ọ̀ bụ onye omekome, ọ gwara ha na ihe na-aga ime ‘na-ewute mkpụrụ obi ya nke ukwuu.’ O zoroghị ha ọnụ. (Matiu 26:38) Ọ bụrụgodị na ha mere ihe wutere Jizọs, ọ naghị akwụsị ịgwa ha okwu.—Matiu 26:40, 41.

Otú ndị bụ́ di ga-esi na-eme ka Jizọs. Na-agwa nwunye gị otú obi dị gị nakwa ihe ị na-eche. Ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-ekwu na di ha na-ekwusara ndị mmadụ okwu n’èzí, ma ha lọta n’ụlọ, ha anaghị atụpụ ọnụ. Ma, otu nwaanyị aha ya bụ Ana kwuru otú obi na-adị ya ma di ya gwa ya obi ya. Ọ sịrị: “M na-amata na ọ hụrụ m n’anya n’eziokwu, m na-ahụkwu ya n’anya.”

A nwala anwa kwụsị ịtụpụrụ nwunye gị ọnụ maka na o mejọrọ gị. Otu nwaanyị kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m mere ihe kpasuru di m iwe, ọ naghị atụpụrụ m ọnụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Ihe a ọ na-eme na-eme ka obi ghara izu m ike, ya adịzie m ka à jụrụ m ajụ.” Ma, otu nwoke aha ya bụ Edwin na-agbalị ime ka Jizọs. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ nwunye m kpasuo m iwe, anaghị m ekwu okwu ozugbo, kama m na-achọta oge dị mma mụ na ya ga-ekwurịta ya.”

Joy, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mbido isiokwu a, achọpụtala na di ya agbanwewala kemgbe Ndịàmà Jehova na-akụziri ya Baịbụl. Joy sịrị: “Ọ gbanwewala, ọ na-agbalịsi ike ka ọ na-eme ka Jizọs ma bụrụ ezigbo di.” Ihe ọtụtụ di na nwunye na-amụta na Baịbụl a na-akụziri ha na-abara ha uru. Ị̀ ga-achọ iso ná ndị a na-amụ Baịbụl? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ka ọ bịa ka gị na ya mụwa Baịbụl. Ị gaghị akwụ ya ụgwọ ọ bụla.

^ para. 10 Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru na onye na-arịa ụdị ọrịa nwaanyị ahụ rịara adịghị ọcha. N’ihi ya, onye ọ bụla o meturu aka ga-aghọkwa onye na-adịghị ọcha.—Levitikọs 15:19, 25.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Gịnị Bụ Ọmụmụ Baịbụl?

Chọpụta azịza ajụjụ a na-ajụ gbasara otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.