Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Jenụwarị 2015

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỌCHỊCHỊ NRỤRỤ AKA NA-AGAGHỊ ADỊ NA YA

Nrụrụ Aka Agaghị Adị n’Alaeze Chineke

Nrụrụ Aka Agaghị Adị n’Alaeze Chineke

E nwere ihe otu onye Nikaragụa bụ́ aka ochie n’ịgụkọ ego kwuru mgbe ọ na-akọwa ihe mere o ji chee na nrụrụ aka agaghị ala ala na gọọmenti. Ọ sịrị: “Ndị ọrụ gọọmenti bụ ụmụ amaala, ebe ọ bụ na ụmụ amaala na-arụrụ aka, ndị ọrụ gọọmenti ga-esokwa na-arụrụ aka.”

Ebe ọ bụ na onye ukwu na onye nta na-arụrụ aka, í cheghị na ndị ọchịchị ga na-arụrụkwa aka? Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na ọchịchị nke nrụrụ aka na-agaghị adị na ya agaghị esi n’aka ụmụ mmadụ. Baịbụl gwara anyị na ọchịchị ahụ bụ Alaeze Chineke. Ọ bụ ya ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka ọ bịa.—Matiu 6:9, 10.

Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọchịchị ahụ ga-ewepụ ọchịchị niile nke ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 2:8, 9; Mkpughe 16:14; 19:19-21) E nwere ọtụtụ ihe ọma Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ. Otu n’ime ha bụ na ọ ga-eme ka nrụrụ aka ndị ọchịchị na-arụrụ kwụsị. Ka anyị leba anya n’ihe isii gosiri na Alaeze Chineke ga-eme ya.

NKE MBỤ: IKE Ọ GA-EJI ACHỊ

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Ọchịchị ụmụ mmadụ na-esikarị n’ụtụ isi nakwa n’ụtụ ndị ọzọ ụmụ amaala ha na-atụ enweta ego ha ji arụ ọrụ. Ego niile a na-enubata n’akpa gọọmenti na-adọ ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti akpịrị, mee ka ha na-ezuru ego gọọmenti, meekwa ka ụfọdụ n’ime ha na-anara ndị mmadụ aka azụ ka ha wepụrụ ha ego n’ụtụ isi ha kwesịrị ịtụ ma ọ bụ n’ego ọzọ ndị ha kwesịrị ịkwụ gọọmenti. Ebe ọ bụ na ego niile a anaghị abatacha n’akpa gọọmenti, gọọmenti na-ebugo ụtụ isi ndị mmadụ na-akwụ. Ha na-ebugo ya, ndị na-ezuru ya ana-achọkwu nke ha ga-ezuru, nrụrụ aka ana-arịzi ibe ya elu. Ndị kacha ata ahụhụ ya bụ ndị na-akwụwa aka ọtọ.

IHE GA-AKWỤSỊ YA: Ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ onye pụrụ ime ihe niile, hiwere Alaeze Chineke. * (Mkpughe 11:15) Mgbe Alaeze ahụ ga-achịwa ụwa, a gaghị na-ana ndị mmadụ ụtụ isi ka e nwee ike na-egboro ha mkpa ha. Kama, ‘ike dị ukwuu’ Chineke nwere na  otú o si emesapụ aka ga-eme ka ọ na-egboro ndị niile Alaeze ahụ ga-achị mkpa ha.—Aịzaya 40:26; Abụ Ọma 145:16.

NKE ABỤỌ: ONYE GA-ACHỊ

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Susan Rose-Ackerman, onye anyị dere ihe o kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, sịrị na ọ bụrụ na nrụrụ aka ga-akwụsị, ọ ga-ebido ná “ndị nọ n’isi.” Ọ bụrụ na gọọmenti agbalịwa ka o mee ka ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị kọstọm kwụsị ịrụrụ aka, ma hapụ ndị isi ọchịchị, ndị mmadụ na-ebido lewe ha anya ọjọọ. Otú ọ sọkwara onye ọchịchị ya bụrụ ezigbo mmadụ, ọ ga na-eme mmehie. Baịbụl sịrị “na e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe.”—Ekliziastis 7:20.

Jizọs anabataghị elu na ala Setan chọrọ inye ya

IHE GA-AKWỤSỊ YA: Jizọs Kraịst adịghị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè n’ihi na ọ bụ Chineke họpụtara ya ka ọ bụrụ eze ga-achị n’Alaeze ya, o nweghịkwa onye nwere ike ịnwata ya ka o mewe ihe ọjọọ. Ihe Jizọs mere mgbe Ekwensu nwara ya gosiri na nke a bụ eziokwu. Ekwensu kwuru na ọ ga-enye ya “alaeze niile nke ụwa na ebube ha” ma ọ bụrụ na Jizọs adaa n’ala fee ya. Ma, Jizọs anabataghị elu na ala ahụ ọ chọrọ inye ya. (Matiu 4:8-10; Jọn 14:30) N’oge a kpọgidere Jizọs n’osisi, o kpebisiri ike na ya agaghị eme ihe ọjọọ ọ bụla. Ọ bụ ya mere o ji jụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ e nyere ya, nke gaara eme ka uche ghara izucha ya okè, ahụhụ ọ na-ata agharakwa irucha ya n’ahụ́. (Matiu 27:34) Jizọs nọzi n’eluigwe ugbu a. Ihe niile o mere gosiri na o ruru eru ịbụ eze n’Alaeze Chineke.—Ndị Filipaị 2:8-11.

NKE ATỌ: A GAGHỊ AGBANWE ỌCHỊCHỊ A AGBANWE

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Ọ na-abụ afọ ole na ole gafee, mba dị iche iche emee ntụliaka ọchịchị ná mba ha. A sịrị na ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha wepụ ndị na-arụrụ aka n’ọchịchị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ná mba dị iche iche, ma ndị nke a sịrị mepere emepe, ọ na-abụ a chụwa nta vootu ma ọ bụ e mewe ntụliaka, ndị mmadụ anaghị akwụwa aka ha ọtọ. Mgbe ụfọdụ, ego ndị ọgaranya na-enye ndị na-azọ ọkwá ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ha na-emere ha na-emezi ka ndị meriri ná ntụliaka mewezie ihe ndị ahụ nyere ha ego chọrọ.

Otu ọkàikpe e nwere n’ụlọikpe kasị elu n’Amerịka, bụ́ John Paul Stevens, dere na ihe a ndị nwere ego na-emere ndị na-azọ ọkwá ọchịchị “na-emebi ọchịchị, na-emekwa ka ndị a na-achị ghara ịtụkwasị ndị ọchịchị obi.” Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị n’ebe niile n’ụwa ji eche na ọ bụ òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị kacha arụrụ aka.

IHE GA-AKWỤSỊ YA: Alaeze Chineke ga-eme ka nrụrụ aka a na-arụrụ ma a chụwa nta vootu ma ọ bụ ma e mewe ntụliaka kwụsị n’ihi na ọ bụ ọchịchị a na-agaghị agbanwe agbanwe. (Daniel 7:13, 14) Ebe ọ bụ Chineke họpụtara Eze ga-achị n’Alaeze ahụ, ndị mmadụ agaghị eme ntụliaka ka ha họpụta ya ma ọ bụ chụpụ ya n’ọchịchị. Ebe ọ bụkwa na Eze a na ọchịchị ya agaghị agbanwe agbanwe, ihe niile ọ ga-emere ndị mmadụ ga-abara ha uru mgbe niile.

 NKE ANỌ: IWU NDỊ Ọ GA-ACHỊ GA-EDEBE

Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Mmadụ nwere ike iche na e nwekwuo iwu ọhụrụ, nrụrụ aka ebelata. Ma, ndị ọkachamara achọpụtala na ọtụtụ mgbe, imekwu iwu ndị ọhụrụ na-eme ka nrụrụ aka na-akakwu njọ. Ihe ọzọ bụ na e tie iwu ọhụrụ ga-eme ka nrụrụ aka belata, a na-emefukarị nnukwu ego tupu iwu ọhụrụ ahụ enwee isi. E mechaakwa, o nweghị ezigbo uru iwu ọhụrụ ahụ na-aba.

IHE GA-AKWỤSỊ YA: E nwere iwu ndị a chọrọ ka ndị Alaeze Chineke ga-achị na-edebe. Iwu ndị ahụ ka iwu niile ọchịchị ụmụ mmadụ na-eti mma. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ ihe, o nyeghị ha ọtụtụ iwu ha ga na-edebe, kama ọ sịrị ha: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Otu ihe mere iwu Chineke ji dị mma karịa iwu mmadụ bụ na iwu ya na-enyere mmadụ aka ka ihe ọ na-eche n’obi ya na àgwà ọ na-akpa ka mma. Jizọs sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Ebe ọ bụ na Chineke ma ihe dị ndị mmadụ n’obi, ọ ga-ahụ na ndị Alaeze ya ga-achị na-eme ihe niile ọ chọrọ.—1 Samuel 16:7.

NKE ISE: Ọ GA-EME KA IHE ỌJỌỌ GHARA ỊNA-ADỊ NDỊ MMADỤ N’OBI

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Ọ bụ anyaukwu na ndị mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru mere ha ji arụrụ aka. Ọtụtụ mgbe, ndị ọchịchị na ndị a na-achị achị na-egosi na ha nwere anyaukwu nakwa na ha na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ọ bụ ya mere ndị rụrụ ụlọ ahịa ahụ dagburu ndị mmadụ, bụ́ nke anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, ji nye ndị na-ahụ maka ụlọ ndị a na-arụ n’obodo Sol aka azụ. Ha ma na inye ha aka azụ ga-akara ha mfe karịa ịrụ ụlọ ahụ otú kwesịrị ekwesị.

Ihe ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịrụrụ aka bụ ịkụziri ha ihe ga-eme ka ha kwụsị ịdị anyaukwu na ịchọ ihe ga-abara naanị ha uru, kwụsịkwa àgwà ọjọọ ndị ọzọ ririla ha ahụ́. Ma, ọchịchị ụmụ mmadụ achọghị ịkụziri ndị mmadụ ihe ga-eme ka ihe ọjọọ ghara ịna-adị ha n’obi. Ọ bụrụgodị na ha chọrọ, ha agaghị emeli ya.

IHE GA-AKWỤSỊ YA: Alaeze Chineke ga-eme ka nrụrụ aka kwụsị kpamkpam n’ihi na a ga-akụziri ndị Alaeze a  ga-achị ihe ha ga-eme ka ha kwụsị iche ihe ọjọọ n’obi ha, bụ́kwanụ ihe na-eme ka ndị mmadụ rụrụwa aka. * Ihe a a ga-akụziri ha ga-eme ka ‘ike nke na-eduzi uche ha dị ọhụrụ.’ (Ndị Efesọs 4:23) Ha ga-amụta otú ihe ha nwere ga-esi na-eju ha afọ na otú ha ga-esi na-achọ ọdịmma ndị ọzọ kama inwe anyaukwu na ịchọ ihe ga-abara naanị ha uru.—Ndị Filipaị 2:4; 1 Timoti 6:6.

NKE ISII: NDỊ GA-ABỤ ỤMỤ AMAALA YA

NSOGBU E NWERE N’ỤWA: Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ nọ n’ebe ihe niile na-agaziri ha, a na-akụzikwara ha otú kacha mma ha ga-esi na-ebi ndụ, ụfọdụ n’ime ha ka nwere ike ịna-arụrụ aka ma na-eme otú masịrị ha. Otu ọkachamara kwuru na ọ bụ ya mere na ọchịchị ụmụ mmadụ agaghị akwụsịli nrụrụ aka. Naanị ihe ha nwere ike ime bụ ịkwụsịlata ya nakwa nsogbu ndị ọ na-akpatara ndị mmadụ.

IHE GA-AKWỤSỊ YA: Ngalaba òtù mba ụwa na-ahụ maka ịkwụsị nrụrụ aka kwuru na ọ bụrụ na nrụrụ aka ga-akwụsị, gọọmenti kwesịrị ịgba ụmụ amaala ya ume ka ha “na-akwụwa aka ọtọ, na-ekwu eziokwu ma na-eme ihe ha kwesịrị ime n’obodo ha.” Ihe a ngalaba òtù mba ụwa kwuru amaka. Ma, ihe Alaeze Chineke na-eme abụghị naanị ịgba ndị ọ ga-achị ume ka ha kpawa àgwà ndị a, kama ọ na-eme ka o doo ha anya na ọ bụ ihe ha ga-emerịrị. Baịbụl kwuru na “ndị anyaukwu” na “ndị ụgha” agaghị eketa Alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11; Mkpughe 21:8.

Ndị mmadụ nwere ike ịmụta ịna-akpa àgwà ọma otú ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mụtara. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Saịmọn nyewere ndịozi Jizọs aka azụ ka ha mee ka o nweta mmụọ nsọ, ha jụrụ ịnata ya ego ahụ ma sị ya: “Chegharịa n’ihe ọjọọ a ị na-eme.” Ozugbo Saịmọn hụrụ na ihe ọjọọ ahụ dị ya n’obi ga-akpatara ya nsogbu, ọ rịọrọ ndịozi ahụ ka ha kpeere ya ekpere ka nsogbu ahụ ghara iri isi ya.—Ọrụ Ndịozi 8:18-24.

IHE Ị GA-EME KA I SORO NÁ NDỊ ALAEZE AHỤ GA-ACHỊ

I nwere ike iso ná ndị Alaeze Chineke ga-achị n’agbanyeghị ebe i si n’ụwa. (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) N’ebe niile n’ụwa taa, a na-akụziri ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ha soro ná ndị Alaeze ahụ ga-achị. Ihe a a na-akụziri ndị mmadụ ga-eme ka ị mata otú ị ga-esi soro ná ndị ọ ga-achị. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ igosi gị otú ha si akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego. Gị na ha nwere ike iji ihe dị ka nkeji iri na-amụ Baịbụl kwa izu. Ị ga-amụtakwu gbasara “ozi ọma alaeze Chineke” na otú Alaeze ahụ ga-esi eme ka nrụrụ aka ndị ọchịchị na-arụrụ kwụsị, mụtakwa ihe ndị ọzọ. (Luk 4:43) Gbalịa kpọtụrụ Ndịàmà Jehova bi gị nso ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig.

Ị̀ ga-achọ ka Ndịàmà Jehova bịa n’ụlọ gị na-amụrụ gị Baịbụl n’anaghị gị ego?

^ para. 8 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ para. 22 Dị ka ihe atụ, gụọ isiokwu bụ́ “Mmadụ Ò Nwere Ike Ịkwụwa Aka Ọtọ n’Ụwa A Nrụrụ Aka Juru?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 1, 2012.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.