Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Nọvemba 2014

 IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA KPARỊTARA

Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Abụọ)

Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị? (Agba nke Abụọ)

N’ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Kelvin gaghachiri n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Jon.

IHE ANYỊ KWUBURU GBASARA NRỌ NEBUKADNEZA

Kelvin: Jon, obi dị m ụtọ na m bịara na nke gị ọzọ. Baịbụl mụ na gị na-amụ kwa izu na-atọ m ụtọ. * Kedụ ka eke si anya anwụ?

Jon: Ọfụma. Daalụ.

Kelvin: Obi dị m ụtọ na ị dị mma. N’oge gara aga m bịara na nke gị, anyị kwuru ihe mere Ndịàmà Jehova ji kwere na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. * N’ụbọchị ahụ, anyị lebara anya n’otu amụma dị n’akwụkwọ Daniel isi 4 nke gosiri na ọ bụ n’afọ ahụ ka Alaeze Chineke malitere ịchị. Ọ̀ kwa i chetara ihe e dere n’ebe ahụ?

Jon: Ee, echetara m ya. Ọọ otu nnukwu osisi Eze Nebukadneza rọrọ ná nrọ.

Kelvin: I kwutere ya. Ná nrọ ahụ, Nebukadneza hụrụ otu nnukwu osisi toruru n’eluigwe. Ọ nụkwara mgbe mmụọ ozi Chineke nyere iwu ka e gbutuo osisi ahụ ma hapụ úkwù ya na mgbọrọgwụ ya n’ala. Osisi ahụ ga-epulite ọzọ mgbe “oge asaa” gafechara. * Anyị kwukwara ihe mere o ji bụrụ na amụma ahụ ga-emezu ugboro abụọ. Ì chetara otú o si mezuo na nke mbụ ya?

Jon: O mezuru n’isi Nebukadneza mgbe ara gbara ya afọ asaa, ọ̀ kwa ya?

Kelvin: Gbam. Nebukadneza kwụsịtụrụ ịchị mgbe ahụ ara gbara ya. Ma, otú amụma ahụ ga-esi emezu ná nke ugboro abụọ ya ga-akarị otú o si mezuo ná nke mbụ ya. Ná nke ugboro abụọ ya, ọchịchị Chineke ga-akwụsịtụ ịchị n’ụwa ruo oge asaa. Anyị mụtara na oge asaa ahụ malitere mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Malite mgbe ahụ gawa, e nwekwaghị eze nọchiri anya Jehova Chineke nke na-achị ụmụ Izrel. Ma mgbe oge asaa ahụ ga-agwụ, Chineke ga-ahọpụta onye nọ n’eluigwe nke ga-abụ Eze ọhụrụ ga-achị ndị ya. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ mgbe oge asaa ahụ gwụrụ ka Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe ga-ebido ịchị. Anyị ekwubuola mgbe oge asaa ahụ malitere. Ọ bụrụ na anyị achọpụta otú oge asaa ahụ hà n’ogologo, anyị ga-amata mgbe Alaeze Chineke bidoro ịchị. Ị̀ ghọtara ihe niile m kwuru?

Jon: Ee. Ihe ndị a i kwuru echetarala m ihe anyị kpara n’ụbọchị ahụ.

Kelvin: Ọ dị mma. Ka anyị kwuzie otú oge asaa ahụ hà n’ogologo. Ọ dịbeghị anya m gụrụ gbasara ya ka m nwee ike icheta ihe ndị dị mkpa na ya. Ka m gbalịa kọwara gị ya.

Jon: Ngwanụ.

OGE ASAA AHỤ GWỤRỤ, OGE IKPEAZỤ AMALITE

Kelvin: Mgbe amụma ahụ mezuru nke mbụ ya n’isi Nebukadneza, oge asaa ahụ bụ afọ asaa  nkịtị. Ma ná mmezu ya nke abụọ nke gbasara Alaeze Chineke, oge asaa ahụ ga-adị ezigbo ogologo karịa afọ asaa nkịtị.

Jon: Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?

Kelvin: Cheta na ọ bụ mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst ka oge asaa ahụ malitere. Anyị bido n’afọ ahụ gụrụ gawa, afọ asaa ga-agwụ n’afọ 600 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ma, o nweghị oké ihe mere n’afọ ahụ nke gbasara ọchịchị Chineke. Ihe ọzọ bụ na mgbe ọtụtụ narị afọ gaferela, ya bụ, n’oge Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru ihe gosiri na oge asaa ahụ agwụbeghị. Ì chetara na anyị kwuru gbasara ya n’oge gara aga?

Jon: Ọọ eziokwu. Echetala m.

Kelvin: N’amụma a, oge asaa ahụ abụghị afọ asaa nkịtị. Ọ karịrị afọ asaa.

Jon: Ọ̀ bụ afọ ole?

Kelvin: Ebe ọ bụ na ihe e dere n’akwụkwọ Mkpughe gbasara ihe e dere n’akwụkwọ Daniel, anyị ga-eji ihe e dere ná Mkpughe mata otú oge asaa ahụ hà n’ogologo. Mkpughe kwuru na afọ atọ na ọkara pụtara otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii. * Ihe ọ pụtara bụ na oge asaa, ya bụ, oge atọ na ọkara ụzọ abụọ, bụ puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị ise na iri abụọ. Ò doro gị anya?

Jon: Ee, o doro m. Ma, ahụbeghị m otú ihe niile a i kwuru si gosi na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914.

Kelvin: Ngwanụ, ka anyị hụ otú o si gosi ya. N’amụma ụfọdụ e buru na Baịbụl, otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ. * Ọ bụrụ na anyị ewere na otu ụbọchị bụ otu afọ, ọ pụtara na puku ụbọchị abụọ na narị ụbọchị ise na iri abụọ ahụ ga-abụzi puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ. Anyị bido n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst gụrụ ya bịawa, puku afọ abụọ na narị afọ ise na iri abụọ ahụ ga-agwụ n’afọ 1914. * Otú a ka anyị si mata na oge asaa ahụ gwụrụ n’afọ 1914, Jizọs amalitekwa ịchị n’Alaeze Chineke. Kemgbe afọ 1914, e nweela oké ihe ndị merela n’ụwa bụ́ ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’oge ikpeazụ.

Jon: Olee oké ihe ndị ị na-ekwu?

Kelvin: Ka anyị leba anya n’ihe dị iche iche Jizọs kwuru na Matiu 24:7, bụ́ ndị ga-eme n’ụwa mgbe ọ ga-ebido ịchị n’eluigwe. Jizọs sịrị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.” Ị̀ hụrụ na o kwuru a ga-enwe ụkọ nri na ala ọma jijiji n’oge ahụ? Ọ̀ bụ na e nwebeghị ọtụtụ nsogbu n’ụwa kemgbe otu narị afọ gara aga?

Jon: Ha ka nkụ.

Kelvin: Jizọs kwukwara n’amaokwu a na n’oge ọ ga na-achị n’Alaeze Chineke, a ga-enwe agha n’ụwa. Akwụkwọ Mkpughe mere ka anyị mata na agha a abụghị agha a ga-alụ n’otu obodo, kama ọ bụ agha a ga-alụ n’ụwa niile n’oge ikpeazụ. * Ì chetara mgbe a lụrụ agha ụwa nke mbụ?

Jon: Ọọ n’afọ 1914, ọọ kwa n’afọ ahụ ka ị na-ekwu na Jizọs bidoro ịchị. Amaghịdị m na agha ahụ a lụrụ n’afọ ahụ so n’ihe gosiri na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914.

Kelvin: Ọ bụrụ na anyị ewere ihe niile a otú anyị si kwuo ha, amụma oge asaa ahụ na amụma  ndị ọzọ Baịbụl buru gbasara oge ikpeazụ ga-edokwu anyị anya. Obi siri Ndịàmà Jehova ike na Jizọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke n’afọ 1914 nakwa na ọ bụ n’afọ ahụ ka oge ikpeazụ malitere. *

Jon: M ka na-agbalị ka ihe niile ị kọwara doo m anya.

Kelvin: Aghọtara m otú ọ dị gị. Agwaburu m gị na o wetụrụ mụnwa oge tupu mụ aghọta ya nke ọma. Ma ó nweghị ihe ọzọ, ihe anyị kparala emeela ka ị ghọta na n’agbanyeghị na e deghị 1914 na Baịbụl, ihe Ndịàmà Jehova kweere gbasara afọ ahụ si na Baịbụl.

Jọn: Ihe i kwuru bụ eziokwu. M na-eweliri unu aka n’ihi na unu na-eji Baịbụl egosi na ihe ọ bụla unu kwuru bụ eziokwu. Ọ bụghị echiche unu ka unu na-ekwu. Ma, ihe m na-eche bụ ihe mere ihe a ji esi ike nghọta. Gịnị mere Chineke agwaghị anyị hoo haa na Baịbụl na ọ bụ n’afọ 1914 ka Jizọs ga-amalite ịchị n’eluigwe?

Kelvin: Jọn, ajụjụ a ị jụrụ amaka. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe Chineke na-agwaghị anyị hoo haa n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, mmadụ nwere ike ịjụwa ihe mere Chineke ji kwe ka e dee Baịbụl otú ga-eme ka mmadụ gbaa mbọ tupu ya aghọta ihe e dere na ya. M ga-achọ ka anyị kpaa ya ụbọchị ọzọ m ga-abịa.

Jon: Ọ dị mma.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-edoghị gị anya? Ka è nwere ihe Ndịàmà Jehova kweere ma ọ bụ ihe ha na-eme nke ị na-aghọtaghị? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ. Obi ga-atọ Onyeàmà Jehova ahụ ụtọ ka gị na ya kpaa ya.

^ para. 5 Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị agbata obi ha Baịbụl n’anaghị ha ego. Ha na ndị agbata obi ha na-ekwurịta isiokwu dị iche iche si na Baịbụl.

^ para. 24 Lee chaatị isiokwu ya bụ “Osisi Nebukadneza Rọrọ ná Nrọ.”

^ para. 30 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig.

^ para. 71 T.O.N.K. pụtara Tupu Oge Ndị Kraịst, ebe O.N.K. pụtara Oge Ndị Kraịst.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?