Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Septemba 2014

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ndị mmụọ ozi hà nwere ike inyere anyị aka?

Ndị mmụọ ozi na-eme ka ozi ọma a na-ekwusa taa baara ndị mmadụ uru otú ahụ ha nyeere Daniel onye amụma Chineke aka n’oge ochie

Jehova Chineke kere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi tupu ya ekee ụmụ mmadụ. (Job 38:4, 7) Ndị mmụọ ozi bụ mmụọ, ha dịkwa ike. Ha na-ejere Chineke ozi. Mgbe ụfọdụ, Chineke na-edunye ha ka ha chebe ndị na-efe ya nọ n’ụwa ma nyere ha aka. (Abụ Ọma 91:10, 11) Taa, ndị mmụọ ozi na-enyere ndị mmadụ aka ka ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ezisara ha baara ha uru.—Gụọ Mkpughe 14:6, 7.

Ànyị kwesịrị ikpegara ndị mmụọ ozi ekpere ka ha nyere anyị aka? Mba. Ọ bụ n’ihi na mgbe anyị na-ekpe ekpere, anyị na-efe onye anyị na-ekpegara ya ofufe. Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ife. (Mkpughe 19:10) Ebe ọ bụ na ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi, ihe ha na-eme bụ ihe Chineke chọrọ ka ha mee, ọ bụghị ihe ndị mmadụ chọrọ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị na-ekpe ekpere, ọ bụ Chineke ka anyị kwesịrị ikpegara ya n’aha Jizọs.—Gụọ Abụ Ọma 103:20, 21; Matiu 26:53.

È nwere ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ?

Chineke kere ndị mmụọ ozi ka ha jiri aka ha na-ekpebi ma hà ga-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ otú o kekwara ụmụ mmadụ. Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. (2 Pita 2:4) Setan bụ mmụọ ozi mbụ nupụụrụ Chineke isi. Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sooro ya nupụrụ Chineke isi ma ghọọ ndị mmụọ ọjọọ. N’oge na-adịchabeghị anya, e si n’eluigwe chụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa.—Gụọ Mkpughe 12:7-9.

Ihe ọjọọ na tigbuo zọgbuo na-arị ibe ya elu kemgbe afọ 1914. Nke a gosiri na oge Chineke ga-eme ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya kwụsị ịkpa ike eruwela. Chineke ga-emezi ka ụwa anyị a dị otú o kwesịrị ịdị.—Gụọ Mkpughe 12:12; 21:3, 4.