Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Ọgọst 2014

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Anaghị M Achọ Iji Anya Ahụ Ebe Ndị Mmadụ Na-emegbu Ibe Ha

Anaghị M Achọ Iji Anya Ahụ Ebe Ndị Mmadụ Na-emegbu Ibe Ha
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1960

  • ABỤ M ONYE: LEBANỌN

  • NDỤ M BIRI: ABỤ M AKA OCHIE N’ỊGBA KARAT NAKWA N’ỊKỤ ỌKPỌ

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Anọ m n’obodo a na-akpọ Remish too n’oge a na-alụ agha na Lebanọn. Obodo a dị nso n’ókè Izrel na Lebanọn. M ka na-echeta otú ogbunigwe ndị e liri n’ala si agbawa gbapụ ndị ọ na-enweghị ihe ha mere aka ma ọ bụ ụkwụ. Ihe siiri anyị ike, mpụ na ime ihe ike jukwara ebe niile.

Anyị dị mmadụ iri na abụọ n’ezinụlọ anyị. Anyị na-aga chọọchị a na-akpọ Maronaịt. Chọọchị a so n’ụdị Chọọchị Katọlik e nwere ná mpaghara ọwụwa anyanwụ ụwa. Ịkpa afọ ezinụlọ anyị anaghị ekwe papa m gaa chọọchị. Ma, mama m na-ahụ na mmadụ niile ọzọ gara chọọchị. Ka oge na-aga, ọ bịara dị m ka chọọchị anyị achịtaghị ájá ọ bụla n’ihi na ọ naghị enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka otú ọhaneze na-anaghị enyere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha aka.

N’oge m na-eto, ịkụ ọkpọ na ịgba karat bịara masịwa m. M malitere ịmụsi ịkụ ọkpọ na ịgba karat ike. Nke a mere ka m ghọọ aka ochie n’ịgba karat nakwa n’ịkụ ọkpọ, meekwa ka m bụrụ ọkaibe n’iji ngwá ọgụ dị iche iche alụ ọgụ. M kwuru n’obi m na ‘agaghị m akwụsịli agha ndị mmadụ na-alụ, ma m ga-agbalị mee ka ndị mmadụ kwụsị imeso ibe ha ihe ike.’ M hụhaala ebe mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, m na-egbo ha ọgụ ozugbo. M na-ewe iwe ọkụ, obere ihe na-ewekwa m iwe. Ndị niile bi n’ebe ndịda Lebanọn na-atụ m ụjọ ebe ọ bụ na anaghị m achọ iji anya ahụ ebe ndị mmadụ na-emegbu ibe ha ma ọ bụ na-emeso ibe ha ihe ike.

N’afọ 1980, m bidoro iso òtù ndị na-agba karat ma na-akụ ọkpọ e nwere n’obodo a na-akpọ Beirut. N’agbanyeghị na a na-atụ bọmbụ n’obodo a kwa ụbọchị, na-akwakwa mgbọ, m na-aga amụ ịgba karat. Naanị ihe m na-eme bụ iri ihe, ihi ụra, na ibi ndụ ka Bruce Lee. Bruce Lee bụ nwoke Chaịna a mụrụ n’Amerịka. N’oge ọ nọ ndụ, ọ na-eme fim, ọ bụkwa azụ eru ala n’ịgba karat nakwa n’ịkụ ọkpọ. M na-akpụ isi m ka ọ dị ka nke Bruce Lee, na-aga ije ka ya, na-etikwa mkpu otú o si eti ma ọ gbawa karat. Ihu anaghịkwa atọ m ọchị.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Ebu m n’obi ịga Chaịna jiri ịgba karat na ịkụ ọkpọ na-akpata ego. Ma ná mgbede otu  ụbọchị, mgbe m nọ na-amụ ịgba karat iji kwadebe nke ọma maka ịga Chaịna, otu enyi m kụụrụ m aka n’ụzọ. O du Ndịàmà Jehova abụọ bịa na nke m. Ihe m yi mgbe ahụ bụ efe ojii m na-eyi ma m mụwa ịgba karat, ọsụsọ zukwara m ahụ́. M gwara Ndịàmà Jehova ahụ, sị: “O nweghị ihe m ma na Baịbụl.” Amaghị m na malite mgbe ahụ gawa, ndụ m ga-agbanwe.

Ndịàmà Jehova ahụ ji Baịbụl gosi m ihe mere na ndị mmadụ agaghị emeli ka mmegbu na ime ihe ike kwụsịchaa. Ha gwara m na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-akpata ihe ọjọọ ndị ahụ. (Mkpughe 12:12) Otú ahụ́ si ruo Ndịàmà Jehova ahụ ala na otú ha si na-ekwu okwu n’atụghị ụjọ masịrị m. Obi dị m ụtọ mgbe ha gwara m na Chineke nwere aha. (Abụ Ọma 83:18) Ha gụkwaara m ihe e dere na 1 Timoti 4:8. Ebe ahụ sịrị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru; ma nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe niile, ebe o nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a, na ndụ nke gaje ịbịa.” Ihe a Baịbụl kwuru gbanwere ndụ m.

O wutere m na mụ na Ndịàmà Jehova ahụ ahụghịzi n’ihi na ndị ezinụlọ m gwara ha abịazila. Ma, ekpebiri m na m ga-akwụsị ịgba karat na ịkụ ọkpọ, kpebiekwa na m ga-ebido ịmụ Baịbụl. Ihe a m kpebiri ime adịghị ụmụnne m ndị nwoke mma. Ma, m fooro ntutu taa na m ga-achọtarịrị Ndịàmà Jehova ka ha kụziwere m Baịbụl.

M chọgharịrị Ndịàmà Jehova, ma ahụghị m ha. N’oge ahụ, papa m nwụrụ na mberede. Ọnwụ ya na nsogbu ndị ọzọ anyị nwere n’ezinụlọ anyị wutere m. M bidola ịrụ ọrụ mgbe ahụ n’otu ụlọ ọrụ na-arụ ụlọ. Otu ụbọchị, otu onye mụ na ya na-arụ ọrụ aha ya bụ Adel kwụsịrị m, jụọ m ihe mere ihu m ji gbarụọ. Mgbe m kọọrọ ya, ọ gwara m na Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. N’ọnwa itoolu sochirinụ, Onyeàmà Jehova ahụ dị obiọma ji ndidi kụziere m Baịbụl.

Ka m na-amụtakwu ihe Baịbụl kwuru, m bidoro chọpụtawa na m kwesịrị ịgbanwe otú m si akpa àgwà. Ma, ọ dịrịghị m mfe. Obere ihe na-ewe m iwe. Ma, Baịbụl mere ka m mụta otú m ga-esi na-ejide onwe m ma a kpasuo m iwe, m mụtakwara na ọ bụghị ihe ọ bụla batara m n’obi ka m kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, Jizọs dụrụ anyị ọdụ na Matiu 5:44, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” Ndị Rom 12:19 kwukwara, sị: “Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” Amaokwu Baịbụl ndị a na ndị ọzọ mere ka obi jiri nwayọọ nwayọọ dajụọ m.

URU NDỊ M RITERELA:

Ọ bụ eziokwu na ndị ezinụlọ m achọbughị ka mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ha na-akwanyeziri Ndịàmà Jehova ùgwù. Otu n’ime ụmụnne m ndị nwoke esorola m na-efe Jehova. Mgbe mama m nọ ndụ, ọ na-abụ ọ nụ ka ndị ọzọ na-akọjọ Ndịàmà Jehova, ya agbachitere ha.

Chineke ejirila ezigbo nwaanyị aha ya bụ Anita gọzie m. Mụ na ya na-eso ekwusa ozi ọma oge niile. Kemgbe afọ 2000, mụ na nwunye m bi n’ebe a na-akpọ Eskilstuna. Ọ dị na Swidin. Anyị na-akụziri ndị na-asụ asụsụ Arabik bi n’ebe ahụ Baịbụl.

M ka na-emetere ndị a na-emeso ihe ike ebere. Ma, ebe m ma ihe kpatara ndị mmadụ ji emeso ibe ha ihe ike, marakwa na obere oge ugbu a Chineke ga-eme ka ime ihe ike kwụsị, ahụ́ eruola m ala, obi na-adịkwa m ụtọ.—Abụ Ọma 37:29.

Mụ na nwunye m na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma. Obi na-atọ anyị ụtọ ịkụziri ndị mmadụ gbasara Jehova