Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JULAỊ 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE IHE ỌJỌỌ JI EME NDỊ EZIGBO MMADỤ?

Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme Ndị Ezigbo Mmadụ?

Gịnị Mere Ihe Ọjọọ Ji Eme Ndị Ezigbo Mmadụ?

Ọtụtụ ndị nwere ike ịna-ekwu na ọ bụ Jehova Chineke * na-akpata ihe ọ bụla na-eme n’ụwa, ma ihe ọma ma ihe ọjọọ, ebe ọ bụ ya kere ihe niile, bụrụkwa onye pụrụ ime ihe niile. Ma, ka anyị lebagodị anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ezi Chineke:

  • “Jehova bụ onye ezi omume n’ụzọ ya niile.”—Abụ Ọma 145:17.

  • “Ụzọ [Chineke] niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.”—Diuterọnọmi 32:4.

  • “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.”—Jems 5:11.

Ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Ma, ọ̀ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ? Mba. Baịbụl kwuru, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’” Gịnị mere Baịbụl ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na “a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) O nweghị onye Chineke na-anwa, ya bụ, o nweghị onye Chineke na-eme ka o mee ihe ọjọọ. Ọ bụghịkwa ya na-akpata ihe ọjọọ. Oleezi onye ma ọ bụ ihe na-akpata ihe ọjọọ?

IHE ỌJỌỌ NWERE IKE ỊDABARA ONYE Ọ BỤLA

Baịbụl kwuru otu ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ. Ọ sịrị: “Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Mgbe ihe mberede ma ọ bụ ihe a na-atụghị anya ya mere, ihe na-emekarị ka o metụta mmadụ bụ ebe onye ahụ nọ mgbe ihe ahụ mere. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jizọs Kraịst kwuru na e nwere ụlọ elu daranụ dagbuo mmadụ iri na asatọ. (Luk 13:1-5) Ihe mere ha ji nwụọ abụghị ụdị ndụ ha biri. Naanị ihe kpatara ya bụ na ha nọ n’okpuru ụlọ elu ahụ mgbe ọ dara. Na Jenụwarị afọ 2010, ala ọma jijiji kpara mkpamkpa na Heiti. Gọọmenti Heiti kwuru na ihe karịrị narị puku mmadụ atọ nwụrụ n’ala ọma jijiji ahụ. Ha niile nwụrụ, n’agbanyeghị onye onye ọ bụla n’ime ha bụ. Ọrịa nwekwara ike igbu onye ọ bụla mgbe ọ bụla.

Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ọdachi na-adakwasị ndị ezigbo mmadụ?

Ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị: ‘Ọ̀ bụ na Chineke enweghị ike igbochi ọdachi ndị a na-asụ ndị mmadụ akwụ? Ọ̀ bụ na o nweghị ike ime ka ihe ọjọọ ghara ịna-eme ndị ezigbo mmadụ?’ Ọ bụrụ na Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ ghara ime, ọ pụtara na ọ ga-ama na ihe ọjọọ na-aga ime tupu ihe ọjọọ ahụ emee. Ọ bụ eziokwu na Chineke nwere ikike ọ ga-eji amata ihe ndị ka ga-eme eme, ajụjụ anyị kwesịrị ileba anya bụ: Ọ̀ bụ mgbe niile ka Chineke na-eji ikike ahụ amata ihe ọjọọ ọ bụla ga-emenụ?—Aịzaya 42:9.

Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Chineke anyị bi n’eluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ n’obi ka ọ na-eme.” (Abụ Ọma 115:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru gosiri na ọ bụghị ihe niile Jehova ga-emeli ka ọ na-eme. Ihe ndị ọ na-eme bụ ihe ndị o lere anya na ya kwesịrị ime. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe ndị ka ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ  naanị ndị nke ọ chọrọ ịmata ka ọ na-amata. Dị ka ihe atụ, mgbe ihe ọjọọ juru n’obodo Sọdọm na Gọmọra oge ochie, Chineke gwara Ebreham, sị: “Ekpebisiwo m ike ịgbada ka m wee hụ ma ha na-eme nnọọ dị ka mkpu ákwá a na-eti maka ya si dị, bụ́ nke ruworo m ntị, ọ bụrụkwa na ọ dịghị otú ahụ, m ga-ama.” (Jenesis 18:20, 21) Ebe a gosiri na o nwere mgbe Jehova na-amaghị otú ihe jọruru njọ n’obodo Sọdọm na Gọmọra maka na ọ chọghị ịma. Nke a gosiri na Jehova nwere ike ikpebi na ya agaghị ama ihe niile ka ga-eme eme. (Jenesis 22:12) Ma, nke a apụtaghị na Chineke ezughị okè ma ọ bụ na ọ dịghị ike. Ebe ọ bụ na Baịbụl sịrị na ọrụ Chineke “zuru okè,” ọ na-eji ikike o ji amata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu amata ihe ndị ga-eme ka uche ya mezuo. Ọ naghị amanye ndị mmadụ amanye ka ha mee ihe otú yanwa chọrọ. * (Diuterọnọmi 32:4) Olee ihe anyị kwesịrị ịghọta? Anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụghị ihe niile ka Chineke na-eji ikike o nwere amata. Ọ bụ naanị ihe ndị ọ chọrọ ịmata ka ọ na-amata.

Gịnị mere Chineke ji ekwe ka ndị ezigbo mmadụ na-adaba n’aka ndị ọjọọ?

NDỊ MMADỤ SO AKPATA IHE ỌJỌỌ NDỊ NA-EMENỤ

Ihe ọjọọ ụfọdụ na-emenụ si ndị mmadụ n’aka. Lee otú Baịbụl si kọwaa ihe nwere ike ime ka mmadụ mee ihe ọjọọ. Ọ sịrị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie; mgbe e mechara mmehie, ọ na-amụpụta ọnwụ.” (Jems 1:14, 15) Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe ọjọọ batara ya n’obi, ọ ga-eji isi ya buru ihe o metara. (Ndị Rom 7:21-23) Ihe ndị mere eme gosiri na ndị mmadụ arụọla ala puo ezé elu. Arụrụala ha emeekwala ka ọtụtụ ndị tagbuo onwe ha n’ahụhụ. Ihe ọzọ bụ na ndị ọjọọ nwere ike ime ka ndị ọzọ soro ha mewe ihe ọjọọ, ihe ọjọọ esi otú ahụ ghara ịkwụsị akwụsị.—Ilu 1:10-16.

Ndị mmadụ arụọla ala puo ezé elu. Arụrụala ha emeekwala ka ọtụtụ ndị tagbuo onwe ha n’ahụhụ

Chineke ò kwesịrị ime ka ndị na-eme ihe ọjọọ kwụsị ime ihe ọjọọ? Chebagodịrị otú Chineke si kee mmadụ echiche. Akwụkwọ Nsọ sịrị na Chineke kere mmadụ n’onyinyo ya, ya bụ, n’oyiyi Chineke. N’ihi ya, ndị mmadụ nwere ike ịkpa àgwà ka Chineke. (Jenesis 1:26) Chineke nyere ndị mmadụ ikike ikpebi ihe ha ga-eme. Ha nwekwara ike kpebie na ha ga-ahụ Chineke n’anya ma rapara ya n’ahụ́, ya bụ, na-eme ihe ndị dị ya mma. (Diuterọnọmi 30:19, 20) Ọ bụrụ na Chineke na-amanye ndị mmadụ ka ha na-eme ihe ha na-achọghị ime, ọ pụtara na ọ napụla ha ikike ahụ o nyere ha. Ọ pụtakwara na o meela ka ndị mmadụ dị ka ígwè nkịtị nke na-arụ naanị ihe e bu n’obi mepụta ya. Ọ bụrụkwa na ihe niile anyị na-eme ma ọ bụ ihe niile na-eme anyị si n’akara aka, ọ pụtara na anyị dị ka ígwè nkịtị na-enweghị ike ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Chineke hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe ndị anyị chọrọ ime. Ihe a o mere gosiri na o ji anyị kpọrọ ihe. Ma, nsogbu ndị mmadụ na-akpatara onwe ha n’ihi ihe na-adịghị mma ha na-ahọrọ  ime nakwa n’ihi na ha ezughị okè agaghị adị ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ̀ BỤ IHE MMADỤ METARA N’ỤWA YA MBỤ MERE O JI ATA AHỤHỤ?

Ọ bụrụ na ị jụọ onye na-ekpe okpukpe ndị Hindu ma ọ bụ okpukpe ndị Buda ajụjụ e dere n’ihu Ụlọ Nche a, ihe o nwere ike ịza gị bụ na ‘ọ bụ iwu a na-akpọ iwu Kama mere ihe ọjọọ ji eme ndị ezigbo mmadụ. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ ihe ha metara n’ụwa ha mbụ mere ha ji ata ahụhụ ugbu a.’ *

Ihe ga-enyere anyị aka ịmata ma nkụzi a ọ̀ bụ eziokwu bụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ọnwụ. Mgbe Chineke kechara mmadụ mbụ bụ́ Adam n’ogige Iden, ọ sịrị ya: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:16, 17) Adam gaara adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma a sị na o mehieghị. Ihe mere o ji nwụọ bụ na o nupụụrụ Chineke isi. Mgbe Adam na nwunye ya mechara mụọ ụmụ, ‘ọnwụ gbasara ruo mmadụ niile.’ (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ ya mere e ji asị na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Baịbụl kwukwara na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:7) Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ nwụọ, ọ kwụọla ụgwọ mmehie niile o mere.

Ọtụtụ nde mmadụ taa na-ekwu na ọ bụ ihe ndị mmadụ metara n’ụwa ha mbụ mere ha ji ata ahụhụ ugbu a. Ndị kweere ná nkụzi a anaghị enyekarị onwe ha nsogbu ma ha tawa ahụhụ ma ọ bụkwanụ ma ndị ọzọ tawa ahụhụ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na nkụzi a na-eme ka ndị mmadụ ghara inwe olileanya na ihe ọjọọ ga-emecha kwụsị. Ndị kweere ná nkụzi a na-ekwu na ọ gwụla mgbe mmadụ kwụsịrị ịlọ ụwa ka ọ ga-akwụsị ịta ahụhụ. Ihe ga-emekwanụ ka ọ kwụsị ịlọ ụwa bụ ma ọ na-eme ihe dị ọhaneze mma ma mara ihe ụfọdụ pụrụ iche ndị ọzọ na-amaghị. Ma, ihe a ha kweere dị ezigbo iche n’ihe Baịbụl kwuru. *

ISI IHE MERE NDỊ MMADỤ JI ATA AHỤHỤ

Ị̀ ma na onye kacha akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata bụ “onye na-achị ụwa,” ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu?Jọn 14:30

Ọ bụghị ndị mmadụ kacha akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu butere mmehie n’ụwa. Setan bụbu mmụọ ozi na-erubere Chineke isi. Ma, ‘o guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ọ bụ ya mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi n’ogige Iden. (Jenesis 3:1-5) Jizọs Kraịst kpọrọ ya “ajọ onye ahụ,” kpọọkwa ya “onye na-achị ụwa.” (Matiu 6:13; Jọn 14:30) Ọtụtụ ndị taa na-eme ka Setan n’ihi na ha na-eme ihe Setan chọrọ ka ha na-eme kama ime ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme. (1 Jọn 2:15, 16) Jọn nke Mbụ 5:19 kwuru na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” E nwekwara ndị mmụọ ozi ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ ma soro Setan. Baịbụl gosiri na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi,” ha na-emekwa ka ‘ahụhụ dịrị ụwa.’ (Mkpughe 12:9, 12) N’ihi ya, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kacha akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa.

O doro anya na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme ndị mmadụ. Ọ bụghịkwa ya na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Kama ịkpata ihe ọjọọ, o kwere anyị nkwa na ya ga-ewepụ ihe ọjọọ niile. Isiokwu na-esonụ ga-egosi otú ọ ga-esi eme ya.

^ para. 3 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ para. 11 Ị chọọ ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ dịrị, gụọ isi nke 11 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 16 Ị chọọ ịmata otú iwu Kama si malite, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? peeji nke 8-12. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 18 Ị chọọ ịma ihe Baịbụl kwuru na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ nakwa ma ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ, gụọ isi nke 6 na nke 7 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Olee otú ihe ọjọọ si malite, gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a? È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?