Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE JUN 2014

Ànyị Ga-ahụ Ndị Nna Nna Anyị Nwụrụ Anwụ Ọzọ?

Ànyị Ga-ahụ Ndị Nna Nna Anyị Nwụrụ Anwụ Ọzọ?

E NWERE otu isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ ndị Koria. Ọtụtụ ndị nwere mmasị ịgụ ihe e kwuru na ya. Isiokwu ahụ bụ: “‘Shim Cheong, Ọmarịcha Nwa Agbọghọ’ Na-amaghị Gbasara Jizọs, Ọ̀ Gara Ọkụ Ala Mmụọ?”

Isiokwu a nwere ike ịdara ndị mmadụ ọgụ n’ihi na Shim Cheong bụ nwaada dị ọha mma ndị Koria na-akọ n’akụkọ ifo. A sịrị na o ji ndụ ya chụọ àjà ka o nyere nna ya kpụrụ ìsì aka. Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị mmadụ na-aja ya mma. Na Koria, e weere Shim Cheong ka onye nwa agbọghọ ọ bụla kwesịrị iṅomi.

Ọtụtụ ndị chere na ịta onye dị otú ahụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ maka na ọ bụghị Onye Kraịst e mere baptizim adịghị mma. Ha chere na mmadụ ekwesịghị ikwu ụdị ihe a n’ihi na a sịrị na akụkọ Shim Cheong mere ọtụtụ afọ tupu ndị obodo ya ebido ịnụ gbasara Kraịst.

Akwụkwọ akụkọ ahụ kọkwara ihe otu ụkọchukwu kwuru mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ. A jụrụ ụkọchukwu ahụ ma ndị ọ na-adabaraghị ịmụta gbasara Jizọs tupu ha anwụọ hà ga-aga ọkụ ala mmụọ. Olee ihe ọ zara? Ọ sịrị: “Anyị amaghị. Ma anyị chere na e nwere ihe Chineke ga-emere ha.”

Ọ̀ BỤ IWU NA A GA-EME MMADỤ BAPTIZIM TUPU A ZỌPỤTA YA?

Akwụkwọ bụ́ The New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “A ga-emerịrị mmadụ baptizim tupu a zọpụta ya. Kraịst ji ọnụ ya kwuo na ọ bụrụ na e jighị mmiri na Mmụọ Nsọ mụgharịa mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịba n’Alaeze Chineke (Jn 3.5).” Ihe a Kraịst kwuru emeela ka ụfọdụ ndị chee na ndị a na-emeghị baptizim na-aga ọkụ ala mmụọ ma ha nwụọ ma ọ bụkwanụ na e nwere otú ọzọ e si ata ha ahụhụ.

Ma, e nwere ọtụtụ ndị na-ekweghị na ihe a ha chere bụ eziokwu. Ọtụtụ nde mmadụ anwụọla n’amaghị ihe ọ bụla gbasara Baịbụl. È kwesịrị ịta ha ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?

NKWA BAỊBỤL KWERE

Baịbụl mere ka anyị mata na Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ maka na ọ dabaraghị ha ịmata Onye ọ bụ tupu ha anwụọ. Ọrụ Ndịozi 17:30 gwara anyị, sị: “Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya.” Oleezi ihe Baịbụl kwuru banyere ndị ọ na-adabaraghị ịmụta banyere Chineke tupu ha anwụọ?

Jizọs kwuru, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Gịnị ka nkwa a o kwere pụtara?

Anyị ga-amata azịza ya n’ihe Jizọs gwara otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ha na ya n’osisi. Onye omekome ahụ sịrị Jizọs: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Gịnị ka Jizọs gwara ya? Ọ gwara ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:39-43.

Ihe a Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na onye omekome ahụ ga-aga eluigwe? Mba. E jighị mmiri na mmụọ nsọ mụọ ya ọzọ. Tupu mmadụ abanye n’Alaeze eluigwe, a ga-amụrịrị ya ọzọ. (Jọn 3:3-6) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ya ga-akpọlite onye omekome ahụ n’ọnwụ ka ọ dịrịzie ndụ na Paradaịs. Ebe ọ bụ na onye omekome ahụ bụ onye Juu, ọ ga-abụ na ọ maara gbasara paradaịs ahụ e nwere n’ụwa, ya bụ, ogige Iden. E kwuru gbasara ya n’akwụkwọ mbụ e nwere na Baịbụl. (Jenesis 2:8) Nkwa Jizọs kwere onye omekome ahụ mere ka obi sie ya ike na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe a ga-eme ka ụwa bụrụghachi paradaịs.

N’eziokwu, Baịbụl kwere nkwa na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) “Ndị ajọ omume” e kwuru okwu ha ebe a bụ ndị na-emeghị ihe Chineke chọrọ maka na ha amaghị uche Chineke. Jizọs ga-akpọlite onye omekome ahụ ya na ya kwurịtara okwu n’ọnwụ nakwa ọtụtụ nde ndị ajọ omume nwụrụ anwụ ma ọ bụdị ọtụtụ ijeri ndị ajọ omume, bụ́ ndị na-amaghị uche Chineke tupu ha anwụọ. A ga-akụziri ha iwu Chineke na paradaịs. Ha mụtachaa iwu Chineke, a ga-ahapụ ha ka ha gosi ma hà hụrụ Chineke n’anya. Otú ha ga-esi egosi na ha hụrụ ya n’anya bụ irubere ya isi.

 MGBE A GA-AKPỌLITE NDỊ AJỌ OMUME N’ỌNWỤ

A kpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ, à ga-ekpe ha ikpe n’ihi ihe ha mere tupu ha anwụọ? Mba. Ndị Rom 6:7 kwuru na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” Mgbe ndị ajọ omume nwụrụ, ha akwụọla ụgwọ mmehie ha. N’ihi ya, ọ bụ ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ ka a ga-eji kpee ha ikpe, ọ bụghị ihe ha mere n’amaghị ama tupu ha anwụọ. Olee uru ihe a Chineke buuru ha n’obi ga-abara ha?

A kpọlitechaa ndị ajọ omume n’ọnwụ, ha ga-enwe ohere ha ga-eji mụta iwu Chineke. A ga-esi n’akwụkwọ mpịakọta ihe atụ nke a ga-emeghe mgbe ahụ mee ka ndị mmadụ mara iwu Chineke. A ga-ekpezi ha ikpe “dị ka omume ha si dị.” Ihe ọ pụtara bụ na ihe ga-ekpebi ikpe a ga-ekpe ha bụ ma hà rubeere Chineke isi ma ọ bụ na ha erubereghị ya isi. (Mkpughe 20:12, 13) Ọtụtụ n’ime ndị ajọ omume a ga-akpọlite n’ọnwụ enwetụbeghị ohere mụọ gbasara Chineke. Ihe a ga-abụrụ ọtụtụ ndị ajọ omume a ga-akpọlite n’ọnwụ ohere mbụ ha ga-eji mụta uche Chineke, mee ya emee ma dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe a Baịbụl kwuru emeela ka ọtụtụ ndị kwụsịrị inwe okwukwe na Chineke bidokwa inwe okwukwe. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Yeong Sug. Mgbe ọ na-eto, ọ bụ ezigbo onye Katọlik. Ọtụtụ ndị ezinụlọ ya bụ ndị ụkọchukwu. Yanwa chọrọ ka e chie ya sista. N’ihi ya, ọ gara biri n’ebe ndị sista na-ebi. Ma, o mechara pụta n’ihi na ihe a na-eme n’ebe ahụ gwụrụ ya ike. Ihe ọzọkwa bụ na o kwetaghị na Chineke ga-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ n’ihi na o chere na ọ bụ naanị onye obi fere azụ ga-eme mmadụ ụdị ihe a. O chekwara na ịta ụmụ mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ bụ ikpe mkpegbu.

Otu ụbọchị, Onyeàmà Jehova gosiri Yeong Sug ihe a Baịbụl kwuru: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ.” (Ekliziastis 9:5) Onyeàmà Jehova ahụ mere ka ọ ghọta na ndị nna nna ya nwụrụ anwụ anọghị n’ọkụ ala mmụọ na-ata ahụhụ. Kama, ha na-ehi ụra n’ili, na-eche mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.

Mgbe Yeong Sug matara na ọtụtụ ndị anụbeghị eziokwu dị na Baịbụl, o chebaara ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14 echiche. Jizọs sịrị na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’ Ugbu a, Yeong Sug so ná ndị na-ekwusa ozi ọma ma na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọma a ọ mụtara na Baịbụl.

“CHINEKE ADỊGHỊ ELE MMADỤ ANYA N’IHU”

Baịbụl kwuru na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:34, 35) Anyị niile kwesịrị ịtụ anya na o nweghị onye Chineke ga-ele anya n’ihu ebe ọ bụ na ọ “hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.”—Abụ Ọma 33:5.