Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Eprel 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ì KWESỊRỊ ỊNA-EKPE EKPERE?

Ì Kwesịrị Ịna-ekpe Ekpere?

Ì Kwesịrị Ịna-ekpe Ekpere?

I nwere ike ịjụ, sị: ‘Gịnị mere m ga-eji na-ekpe ekpere ebe ọ bụ na Chineke ma ihe niile dị m n’obi, marakwa ihe dị m mkpa?’ Ihe a bụ ezigbo ajụjụ n’ihi na Jizọs kwuru na ‘Chineke bụ́ Nna anyị maara ihe ndị na-akpa anyị tupu anyị arịọ ya.’ (Matiu 6:8) Eze Devid kwukwara ihe gosiri na Chineke ma ihe niile dị anyị n’obi. O kwuru, sị: “Ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, Jehova, lee! ị marachaala ya.” (Abụ Ọma 139:4) Gịnịzi mere anyị ga-eji na-ekpegara Chineke ekpere? Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ a. *

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”Jems 4:8

 EKPERE NA-EME KA ANYỊ NA CHINEKE DỊRỊ NÁ MMA

Baịbụl gwara anyị na Jehova * Chineke ma ihe niile, gwakwa anyị na ihe dị Chineke mkpa abụghị naanị ka ọ matachaa ihe niile gbasara ndị na-efe ya. (Abụ Ọma 139:6; Ndị Rom 11:33) Ọ bụ eziokwu na Chineke nwere ikike icheta ihe ọ bụla ọ chọrọ icheta gbasara ụmụ mmadụ, ma ọ dịghị ka kọmputa nke e nwere ike idenyecha ihe niile gbasara ụmụ mmadụ n’ime ya. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na Chineke chọrọ ịmata ihe dị anyị n’ala ala obi n’ihi na ọ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. (Abụ Ọma 139:23, 24; Jems 4:8) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere n’agbanyeghị na Nna ya ma ihe ndị dị ha mkpa. (Matiu 6:6-8) Anyị na Chineke ga na-adịkwu ná mma ma anyị na-agwa ya ihe dị anyị n’obi.

Ma, o nwere ike ịna-esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịmata ihe anyị ga-arịọ Chineke. Ọ bụrụ na ọ dị anyị otú ahụ, Chineke nwere ike inyocha obi anyị ma meere anyị ihe ndị na-akpa anyị n’agbanyeghị na anyị enweghị ike ikwupụta ya ekwupụta. (Ndị Rom 8:26, 27; Ndị Efesọs 3:20) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na Chineke nyeere anyị aka, anyị ga-achọ ka anyị na ya dịkwuo ná mma, ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị otú o si nyere anyị aka.

CHINEKE Ọ̀ NA-AZA EKPERE NIILE?

Baịbụl gwara anyị na Chineke na-aza ekpere ndị ji obi ha niile na-efe ya, gwakwa anyị ihe mere na Chineke anaghị aza ekpere ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọtụtụ ụmụ Izrel na-eme ihe ike n’oge ochie, Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa ha, sị: “Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, adịghị m ege ntị; aka unu jupụtara n’ọbara.” (Aịzaya 1:15) Nke a gosiri na Chineke anaghị aza ekpere ndị kpọrọ iwu ya asị ma ọ bụ nke ndị bu ihe ọjọọ n’obi na-ekpe ekpere.—Ilu 28:9; Jems 4:3.

Ma, Baịbụl kwukwara na ‘ihe ọ bụla anyị rịọrọ Chineke dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.’ (1 Jọn 5:14) Nke a ọ̀ pụtara na Chineke ga-emere ndị na-efe ya ihe niile ha rịọrọ ya? Mba. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi rịọrọ Chineke ugboro atọ ka o wepụrụ ya nsogbu na-adụ ya ka “ogwu n’anụ ahụ́.” (2 Ndị Kọrịnt 12:7, 8) O nwere ike ịbụ nsogbu anya ka Pọl nwere. Ma ọ̀ bụ nsogbu anya ma ọ̀ bụ ihe ọzọ, o doro anya na ọ dịghịrị ya mfe. N’oge ahụ, e nyela Pọl ikike ịgwọ ndị mmadụ ọrịa, o jikwa ikike e nyere ya kpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, nsogbu nke ya akwụsịghị, kama ọ nọ na-edi ya. (Ọrụ Ndịozi 19:11, 12; 20:9, 10) N’agbanyeghị na Chineke azaghị Pọl ekpere ya otú ọ chọrọ, obi dị ya ụtọ na Chineke nyeere ya aka.—2 Ndị Kọrịnt 12:9, 10.

“Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”1 Jọn 5:14

N’eziokwu, Baịbụl kwuru na e nwere ndị rịọrọ Chineke arịrịọ, Chineke arụọ ọrụ ebube, ha enweta ihe ha chọrọ ozugbo. (2 Ndị Eze 20:1-7) Ma, Chineke anaghị esikarị otú ahụ aza ndị mmadụ ekpere, ma n’oge Baịbụl ma n’oge anyị a. O wutere ụfọdụ ndị fere Chineke mgbe ha rịọchara Chineke arịrịọ, ya adị ha ka Chineke azaghị ha ekpere ha. Eze Devid jụrụ Chineke, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m? Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?” (Abụ Ọma 13:1) Ma mgbe Devid chetara na Jehova enyerela ya aka ọtụtụ ugboro, obi sikwuru ya ike na Chineke echefubeghị ya. N’ekpere ahụ o kpere, ọ sịrị: “Ma mụ onwe m, n’obiọma gị ka m tụkwasịrị obi.” (Abụ Ọma 13:5) Ndị na-efe Chineke n’oge a na-arịọkwa Chineke arịrịọ otú ahụ Devid rịọrọ ya. Mgbe ụfọdụ, ha na-arịọ Chineke arịrịọ ugboro ugboro ruo mgbe ha ghọtara na Chineke azala ha ekpere.—Ndị Rom 12:12.

 OTÚ CHINEKE SI AZA EKPERE

Chineke na-emere anyị ihe ndị na-akpa anyị.

Ọ bụghị mgbe niile ka ndị nne na nna na-emere ụmụ ha ihe ha chọrọ n’oge ha chọrọ ya. Chineke nwere ike ọ gaghị emere anyị ihe anyị rịọrọ ya mgbe anyị chọrọ ka o meere anyị ya ma ọ bụ otú anyị tụrụ anya ka o si mee ya. Ma ebe ọ bụ na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya otú nna si ahụ ụmụ ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-emere anyị ihe ndị na-akpa anyị otú ga-abara anyị uru nakwa n’oge kwesịrị ekwesị.—Luk 11:11-13.

Chineke nwere ike isi na Baịbụl zaa anyị ekpere

Chineke nwere ike ịza anyị ekpere otú anyị na-atụghị anya ya.

Ọ bụrụ na anyị rịọrọ Chineke ka o nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu, ànyị ga-asị na ọ zaghị anyị ekpere ahụ maka na ọ rụghị ọrụ ebube wepụ nsogbu ahụ? Mba. Ihe anyị kwesịrị ime bụ ịchọpụta ma ò nweela otú ọzọ Chineke sirila nyere anyị aka, ya abụrụ na anyị amaghị. Dị ka ihe atụ, enyi anyị nwere ike ịgbatara anyị ọsọ enyemaka mgbe nsogbu ji anyị n’olu. (Ilu 17:17) O nwere ike ịbụ Jehova mere ka onye ahụ bịa nyere anyị aka. Chineke nwekwara ike isi na Baịbụl zaa anyị ekpere anyị n’ihi na ihe anyị gụtara na Baịbụl nwere ike ime ka anyị ghọta otú anyị ga-esi die nsogbu ahụ.—2 Timoti 3:16, 17.

Chineke nwere ike isi n’aka ndị enyi anyị gbatara anyị ọsọ enyemaka mgbe nsogbu ji anyị n’olu

Ihe Chineke na-emekarị bụ inye ndị na-efe ya ike ha ga-eji die nsogbu bịaara ha kama iwepụrụ ha nsogbu ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs nọ ná nsogbu, o chere na nsogbu ahụ ga-eme ka a kọchaa aha Chineke, ya arịọ Chineke ka o wepụ nsogbu ahụ. Ma Chineke ewepụghị ya, kama o zipụrụ otu mmụọ ozi ka ọ gbaa Jizọs ume. (Luk 22:42, 43) Chineke nwekwara ike imere anyị ụdị ihe a o meere Jizọs. O nwere ike isi n’aka ezigbo enyi anyị gbaa anyị ume mgbe anyị nọ ná nsogbu. (Ilu 12:25) Ebe ọ bụ na Chineke agaghị akụrụ anyị ékwé ma o si otú a zaa anyị ekpere, anyị kwesịrị ịna-elerukwu anya ka anyị nwee ike ịmata mgbe ọ zara anyị ekpere anyị.

Chineke na-aza ekpere ụfọdụ mgbe oge ya ruru.

Baịbụl kwuru na Chineke na-emere ndị dị umeala n’obi amara “mgbe oge ruru” ka o mee otú ahụ. (1 Pita 5:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ dị anyị ka Chineke ọ̀ na-egbu oge ịza anyị ekpere, anyị ekwesịghị iche na ọ ga-abụ na Chineke ahụghị anyị n’anya. Kama, anyị kwesịrị ịghọta na ebe ọ bụ na Chineke ma ihe karịa anyị, o doro anya na ọ na-abụ ya nụ ekpere anyị, ya eleba ya anya mara ihe ka mma ọ ga-emere anyị.

“Wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru.”1 Pita 5:6

Weregodị ya na obere nwa gị rịọrọ gị ka ị zụọrọ ya ígwè. Ị̀ ga-azụrụ ya ígwè ozugbo? Ọ bụrụ na i chere na o torubeghị ịgba ígwè, ị gaghị azụrụ ya ígwè mgbe ahụ. Ma, i nwere ike imecha zụọrọ ya ígwè mgbe ị ma na o toruola ịgba ígwè. Otú ahụ ka Chineke na-emekwa. O nwekwara ike inye anyị ‘ihe niile anyị ji obi anyị na-arịọ’ mgbe oge ruru, ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ịrịọ ya.—Abụ Ọma 37:4.

KA OBI SIE GỊ IKE NA JEHOVA NA-ANỤ EKPERE

Baịbụl gwara ezigbo Ndị Kraịst na ha ekwesịghị ichewe na ekpere abaghị uru. Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ọ naghị adị mfe mgbe ụfọdụ ikweta na ekpere bara uru. N’eziokwu, ọ bụrụ na o teela ihe nyewere anyị nsogbu ma ọ bụkwanụ na o teela ndị mmadụ megbuwere anyị, o nwere ike ịdị anyị ka Chineke na-egbu oge ịza anyị ekpere. Ma, anyị kwesịrị ịna-echeta na Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere n’esepụghị aka.

O nwere mgbe Jizọs mere otu ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Ọ sịrị na otu nwaanyị di ya nwụrụ nọ na-agakwuru otu ọkàikpe, na-arịọ ya ka o nyere ya aka ka a ghara ikpe ya ikpe mkpegbu. (Luk 18:1-3) Ọ bụ eziokwu na  ọkàikpe ahụ achọbughị inyere nwaanyị ahụ aka, ma o mechara gwa onwe ya, sị: “M ga-ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka o wee ghara ịnọgide na-abịa enyegbu m ná nsogbu.” (Luk 18:4, 5) Otú e si dee amaokwu a n’asụsụ Grik bụ na ọkàikpe ahụ gere nwaanyị ahụ ntị ka nwaanyị ahụ ghara “isu ya ọkpọ n’okpuru anya,” ya bụ, ka nwaanyị ahụ ghara ịga “kọwara ndị mmadụ na ọ bụ onye ọjọọ.” * Ọ bụrụ na ọkàikpe ahụ, bụ́ onye ajọ omume, nyeere nwaanyị ahụ di ya nwụrụ aka maka na ọ chọghị ka ndị mmadụ lewe ya anya ọjọọ, ọ̀ bụ na Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, agaghị eme ka “ndị na-etiku ya ehihie na abalị” nweta ikpe ziri ezi? Jizọs sịrị na Chineke “ga-eme ka ha nweta ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ.”—Luk 18:6-8.

“Na-arịọnụ, a ga-enye unu.”Luk 11:9

Mgbe ụfọdụ, ike ịrịọ Chineke arịrịọ nwere ike ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ọ dịla anya anyị rịọwara ya otu ihe. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ike gwụ anyị. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekpe ekpere, anyị ga-egosi na anyị ji obi anyị niile chọọ ka Chineke nyere anyị aka. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi na-aghọta mgbe Chineke zara anyị ekpere. Nke a ga-emekwa ka anyị na Chineke dịkwuo ná mma. N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-aza ekpere anyị ma ọ bụrụ na ihe anyị na-arịọ ya dị mma, anyị enwee okwukwe, na-arịọkwa ya ihe ahụ n’esepụghị aka.—Luk 11:9.

^ para. 3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza anyị ekpere, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-eme ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-ahụ na ekpere bara uru otú a kọwara ya n’isiokwu a. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere ekpere, gụọ isi nke 17 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike ịga na www.jw.org/ig.

^ para. 5 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

^ para. 22 N’oge ochie, Chineke gwara ndị na-ekpe ikpe n’Izrel ka ha na-emetara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ anwụ na ụmụ na-enweghị nna ebere ma na-enyere ha aka.—Diuterọnọmi 1:16, 17; 24:17; Abụ Ọma 68:5.