Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mach 2014

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Ndị Si n’Okpukpe Dị Iche Iche Na-efekọ Ya Ọnụ?

Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Ndị Si n’Okpukpe Dị Iche Iche Na-efekọ Ya Ọnụ?

E nwere otu ajụjụ gbara n’otu akwụkwọ akụkọ. Ajụjụ ahụ bụ: “Okpukpe ọ̀ na-ekewa ndị mmadụ ka ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu?” Ọtụtụ n’ime ndị gụrụ akwụkwọ akụkọ ahụ zara na okpukpe na-ekewa ndị mmadụ.

NDỊ chọrọ ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ ekwetaghị na okpukpe na-ekewa ndị mmadụ. Otu onye n’ime ha bụ Eboo Patel. Nwoke a hiwere òtù maka ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ si n’okpukpe dị iche iche. O kwuru, sị: ‘E nweghị okpukpe na-anaghị achọ ka ndị mmadụ na-anabata ibe ha nke ọma ma na-emetere ibe ha ebere. E nweghịkwa okpukpe na-achọghị ka ụwa dị mma obibi.’

E nweela mgbe ndị Buda, ndị Katọlik, ndị Protestant, ndị Hindu, ndị Alakụba na ndị si n’ọtụtụ okpukpe ndị ọzọ jikọtara aka gbalịa ka ndị mmadụ kwụsị ịda ogbenye nakwa ka ndị mmadụ na-enweta ihe ruuru ha. Ha gbakwara mbọ ka a kwụsị ili bọmbụ n’ala nakwa ka ndị mmadụ mata ihe ndị nwere ike ime ka ụwa ghara ịdị mma obibi. Ndị si n’okpukpe dị iche iche ezukọtala ugboro ugboro kparịta otú ha ga-esi na-emekọ ihe ọnụ ma na-agba ibe ha ume. Ọ na-abụ ha zukọta, ha emee ememme, mụọ kandụl, kụọ egwú, kpekọọ ekpere ma mee ihe ndị ọzọ.

Ọ bụrụ na ndị si n’okpukpe dị iche iche ana-efekọ ofufe ọnụ, ọ̀ ga-eme ka ha na ibe ha dịrị n’otu? Chineke ọ̀ chọrọ isi otú a mee ka ụwa ka mma?

ÀNYỊ KWESỊRỊ ỊHAPỤ IKWUTE OKWU CHINEKE KA ANYỊ NA NDỊ OKPUKPE ỌZỌ DỊRỊ N’OTU?

E nwere ọtụtụ òtù e hiwere maka na a chọrọ ka okpukpe dị iche iche na-emekọ ihe ọnụ. A sịrị na nke kacha n’ime ha nwere ndị òtù ná mba iri asaa na isii. Ndị nọkwa n’òtù a si n’ihe karịrị narị okpukpe abụọ. Ndị hiwere ya kwuru na ihe mere ha ji hiwe ya bụ ‘ka ndị si n’okpukpe ma ọ bụ chọọchị dị iche iche na-emekọ ihe ọnụ.’ Ma, ikwu ya ekwu abụghị ebe okwu biri. Dị ka ihe atụ, ndị isi òtù ahụ kwuru na ha sara anya ná mmiri n’oge ha na-ede iwu na-achị òtù ha ka ihe ha ga-ede ghara ịkpasu ndị òtù ha iwe. Gịnị mere ha ji dee ya otú ahụ? Otu n’ime ihe ndị kpatara ya bụ na ọ bụghị ha niile kwetara ka e kwute okwu Chineke n’akwụkwọ iwu ha. Ihe ha meziri bụ na o nweghị otu ebe ha kwuru gbasara Chineke n’akwụkwọ ahụ.

À ga-asị na ha nwere okwukwe ebe ọ bụ na ha ekwuteghị gbasara Chineke? Oleekwanụ otú ha si dị iche n’òtù ndị ọzọ na-enweghị ihe gbasara ha na okpukpe, dị ka òtù na-agbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka? Ndị hiwere òtù a kwudịrị na ihe mere ha ji hiwe ya abụghị maka ikpere Chineke, kama ọ bụ ka ha mee ka ndị si n’okpukpe dị iche iche dịrị n’otu.

Ọ̀ BỤ NAANỊ IMERE NDỊ ỌZỌ IHE ỌMA KA E JI AMA NDỊ NA-EFE CHINEKE?

Otu nwoke a ma ama aha ya bụ Dalai Lama so ná ndị chọrọ ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ. O kwuru, sị: “Okpukpe niile na-akụziri ndị mmadụ ka ha hụ ibe ha n’anya, ka ha na-emere  ibe ha ebere ma na-agbaghara ibe ha. Ihe dịzi mkpa bụ ka anyị na-eme ha eme.”

O doro anya na ndị mmadụ ịhụ ibe ha n’anya na imere ibe ha ebere na ịgbaghara ibe ha bara ezigbo uru. Jizọs kwuru, sị: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12) Ma, ọ̀ bụ naanị imere ndị mmadụ ihe ọma ka e ji amata ndị na-ekpe ezigbo okpukpe?

O nwere ihe Pọl onyeozi kwuru gbasara ọtụtụ ndị sịrị na ha na-efe Chineke n’oge ọ nọ ndụ. Ọ sịrị: “Ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” Gịnị bụ nsogbu ha? Pọl kwuru na ‘ha amaghị ezi omume Chineke’ nakwa na ha “na-achọ ime ka ezi omume nke ha guzosie ike.” (Ndị Rom 10:2, 3) Okwukwe ha na mbọ niile ha gbara bụ n’efu n’ihi na ha amaghị ihe Chineke chọrọ ka ha mee.—Matiu 7:21-23.

BAỊBỤL Ò KWURU KA OKPUKPE DỊ ICHE ICHE NA-EFEKỌ CHINEKE ỌNỤ?

Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo.” (Matiu 5:9) Jizọs mere ihe ọ kụziiri ndị mmadụ. Otú o si mee ya bụ na o nweghị mgbe ọ kwadoro ka ndị mmadụ na-eme ihe ike, ọ kụzikwaara ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche ihe ga-eme ka ha na ndị ọzọ dịrị n’udo. (Matiu 26:52) Ndị mere ihe Jizọs kụziri malitere ịhụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu. (Ndị Kọlọsi 3:14) Ma, ihe mere Jizọs ji kụziere ndị mmadụ ihe ọ̀ bụ naanị ka o mee ka ndị si n’okpukpe dị iche iche dịrị ná mma? Ò so ndị okpukpe ọzọ kpee okpukpe ha?

Ndị Farisii na ndị Sadusii achọghị iji anya ahụ Jizọs. Ha gbakwara mbọ ka ha gbuo ya. Ma, gịnị ka Jizọs mere? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì.” (Matiu 15:14) Jizọs agakwurughị ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na ya fekọọ Chineke.

E mechara nwee ọgbakọ Ndị Kraịst n’obodo Kọrịnt. N’oge ahụ, okpukpe ndị mmadụ na-ekpe n’obodo Kọrịnt karịrị akarị. Gịnị ka Ndị Kraịst bi na Kọrịnt kwesịrị ime n’ụdị ebe ahụ ha bi? Pọl onyeozi degaara ha akwụkwọ ozi ma gwa ha, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.” Gịnị mere na ha na ha ekwesịghị ikekọta onwe ha? Pọl jụrụ Ndị Kraịst ahụ, sị: ‘Olee nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Bilial? Ma ọ bụ, olee òkè onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere?’ Ọ gwaziri ha, sị: “Ya mere, sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụnụ onwe unu.”—2 Ndị Kọrịnt 6:14, 15, 17.

O doro anya na Chineke achọghị ka ndị si n’okpukpe dị iche iche bịakọta ọnụ na-efe ya. Ma, ajụjụ i nwere ike ịjụ bụ, ‘Gịnị ga-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu?’

OTÚ NDỊ MMADỤ NA IBE HA GA-ESI ADỊ N’OTU

Taa, e nwere ụlọ ọrụ ndị nwere ọtụtụ ndị ọrụ. Ụlọ ọrụ ndị ahụ na-arụpụta ihe ndị ha chọrọ ịrụ maka na ndị ọrụ ha kwekọrịtara otú ha ga-esi na-arụ ha.

Ma, ndị ahụ chọrọ ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-efekọ ofufe ọnụ emeghị ka ụlọ ọrụ ndị ahụ. Ọ bụ eziokwu na ha na-ekwu na ọ dị mma ka ndị si n’okpukpe dị iche iche na-akwanyere ibe ha ùgwù ma na-emekọ ihe ọnụ, ma ihe ndị ha kweere abụghị otu. Ọ bụ ya mere na àgwà ndị ahụ na-efekọ ofufe ọnụ na-akpa na ihe ndị ha na-akụzi ji dịrị iche n’ibe ha, ọ bụkwa ya mere na ha adịghị n’otu.

Ma, Baịbụl kwuru ihe Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme. Ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara anyị uru. Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru anaghị akpọ ndị agbụrụ ọzọ na ndị okpukpe ọzọ asị, ha amụtala otú ha na ibe ha ga-esi na-emekọ ihe ọnụ ma dịrị n’otu. Chineke buru amụma n’oge ochie na ihe a ga-eme. Ọ sịrị: “M ga-agbanwe asụsụ nke ndị dị iche iche ka ọ bụrụ asụsụ dị ọcha, ka ha niile wee na-akpọku aha Jehova, ka ha wee jiri otu obi na-efe ya ofufe.” Ihe asụsụ ahụ dị ọcha pụtara bụ otú Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ si na-efe ya. Ife Chineke otú ahụ na-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu.—Zefanaya 3:9; Aịzaya 2:2-4.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị ka ị bịa n’ebe ha na-anọ amụ ihe ka i jiri anya gị hụ otú ha na ibe ha si dịrị n’otu.—Abụ Ọma 133:1.