Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Mach 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Ihe Chineke Meere Gị

Ihe Chineke Meere Gị

‘Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a na o nyere naanị otu Ọkpara ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.’ —Jọn 3:16, Bible Nsọ Ọhụụ.

Amaokwu a so n’amaokwu ndị mmadụ kacha mara na Baịbụl. Ọ bụkwa ya ka ndị mmadụ kacha eji ekwu okwu. E kwuola na ọ bụ naanị amaokwu a “ji mkpụrụ okwu ole na ole kọwaa otú ihe si kwụrụ n’etiti Chineke na ụmụ mmadụ nakwa otú a ga-esi azọpụta ụmụ mmadụ.” Ọ bụ ya mere na ị gaa obodo ụfọdụ, ị ga-ahụ ebe e dere Jọn 3:16 ma ọ bụ ihe ụfọdụ e kwuru na ya n’ahụ́ ụgbọala nakwa n’ebe ndị ọzọ.

O nwere ike ịbụ na obi siri ndị na-ede amaokwu Baịbụl a ike na Chineke ga-enye ha ndụ ebighị ebi ebe ọ bụ na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Gịnwa kwanụ? Ì chere na ịhụnanya Chineke ga-abara gị uru? Gịnị ka i chere Chineke meere gị nke gosiri na ọ hụrụ gị n’anya?

‘CHINEKE HỤRỤ ỤWA N’ANYA’

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa, keekwa ụmụ anụmanụ, osisi, na ụmụ mmadụ. Otú ụmụ irighiri ihe anyị na-anaghị eji anya nkịtị ahụ si maa mma gosiri na ọ ga-abụrịrị onye ma ihe karịa mmadụ kere ha. Ọtụtụ ndị na-ekele Chineke kwa ụbọchị na o mere ka ha dị ndụ. Ha makwa na ọ bụ Chineke na-enye ha ikuku ha na-ekuru, mmiri ha na-aṅụ, nri ha na-eri, na ihe ndị ọzọ na-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ.

Anyị kwesịrị ịna-ekele Chineke maka ihe ọma ndị a ọ na-emere anyị n’ihi na ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa ya ji anyị ndụ. (Abụ Ọma 104:10-28; 145:15, 16; Ọrụ Ndịozi 4:24) Anyị ga-aghọta na Chineke hụrụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche banyere ihe ndị ọ na-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ. Pọl onyeozi kwuru banyere ihe Chineke na-emere anyị, sị: ‘Chineke na-enye mmadụ  niile ndụ na ume na ihe niile. Ọ na-emekwa ka anyị na-ejegharị ma na-adị ndụ.’—Ọrụ Ndịozi 17:25, 28.

Ma, ọ bụghị naanị ihe ndị a a na-ahụ anya Chineke na-emere anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe ọzọ bụ na o kere anyị ka anyị mata onye ọ bụ nakwa ka anyị na ya dịrị ná mma. (Matiu 5:3) Ọ bụ otú a o si kee anyị mere ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi ji nwee olileanya iso ná ndị ezinụlọ ya, ya bụ, ịghọ ‘ụmụ ya.’—Ndị Rom 8:19-21.

Akwụkwọ Jọn 3:16 kwukwara otú ọzọ Chineke si gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. O kwuru na Chineke zitere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, n’ụwa ka ọ kụziere anyị banyere Chineke bụ́ Nna ya ma nwụọ n’ihi anyị. Ma, ọtụtụ ndị nwere ike ịsị na ha aghọtaghị ihe mere Jizọs ji nwụọ n’ihi ụmụ mmadụ na otú ọnwụ ya si egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru mere Jizọs ji nwụọ nakwa uru ọnwụ ya baara ụmụ mmadụ.

‘O NYERE NAANỊ OTU ỌKPARA YA’

Mmadụ niile na-arịa ọrịa, na-aka nká, na-anwụkwa anwụ. Ma mgbe Jehova Chineke kere ụmụ mmadụ, o keghị ha ka ha na-anwụ anwụ ma ọ bụ na-arịa ọrịa. O bu n’obi ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ha ga na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na ha erubereghị ya isi, ha ga-anwụ. (Jenesis 2:17) Nwoke mbụ Chineke kere nupụụrụ ya isi ma kpatara onwe ya na ụmụ ya ọnwụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”—Ndị Rom 5:12.

Ma, Chineke “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Ọ bụ ya mere na mgbe Adam kpachaara anya nupụrụ ya isi, o mere ka Adam jiri isi ya buru ihe o metere. Ọ maghị mmadụ niile ikpe ka ha tagbuo onwe ha n’ahụhụ ma nwụfuo n’ihi mmehie Adam. Kama ịma ha ikpe ọnwụ ebighị ebi, o sooro iwu ya bụ́ “mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi,” ya bụ, na onye ọ bụla mere ihe ọjọọ ga-eji isi ya buru ihe o metere. Nke a mere ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi nwee olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Ọpụpụ 21:23) Ajụjụ bụzi: Olee otú ndụ ahụ zuru okè Adam tufuru ga-esi ruo ụmụ mmadụ aka ọzọ? Azịza ya bụ na onye zuru okè otú ahụ Adam zuru ga-eji ndụ ya chụọ àjà.

Jizọs ji obi ya niile bịa n’ụwa ma jiri ndụ ya chụọ àjà ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie na ọnwụ

O doro anya na e nweghị nwa Adam ga-achụli àjà ahụ ma e wezụga Jizọs. (Abụ Ọma 49:6-9) Jizọs ebuteghị mmehie ọ bụla mgbe a mụrụ ya. O zuru okè otú Adam zuru. N’ihi ya, mgbe Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà, ọ gbapụtara ụmụ mmadụ ná mmehie. Nke a mere ka ụmụ Adam na Iv nwee olileanya izu okè otú ahụ Adam na Iv zuburu okè. (Ndị Rom 3:23, 24; 6:23) Ò nwere ihe anyị kwesịrị ime ka ịhụnanya a na-enweghị atụ baara anyị uru?

 “ONYE Ọ BỤLA NKE KWERE NA YA”

Akwụkwọ Jọn 3:16 kwukwara na ọnwụ Jizọs ga-eme ka ‘onye ọ bụla nke kwere na ya ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.’ Nke a pụtara na e nwere ihe onye ọ bụla chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi kwesịrị ime. Anyị kwesịrị ikwere na Jizọs ma na-erubere ya isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ‘ịdị ndụ ebighị ebi.’

I nwere ike ịjụ, sị: ‘Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere Jizọs isi ebe ọ bụ na ọ sịrị na “onye ọ bụla nke kwere na ya” ga-adị ndụ ebighị ebi?’ N’eziokwu, ikwere na Jizọs ma ọ bụ inwe okwukwe na ya dị ezigbo mkpa. Ma, anyị kwesịrị icheta na Baịbụl gosiri na mmadụ inwe okwukwe na Jizọs abụghị naanị ikwere na ya. Ihe onye ọ bụla nke chọrọ ka Chineke gọzie ya ga-eme abụghị naanị ịmata na Jizọs bụ Onye nzọpụta anyị. Kama, onye ahụ kwesịkwara iji obi ya niile na-eme ihe Jizọs kụziri. Ọ bụrụ na onye ahụ emeghị ihe gosiri na o nwere okwukwe, ihe ọ na-eme bụ ihe efu. Baịbụl kwuru, sị: “Okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.” (Jems 2:26) Ihe ọ pụtara bụ na onye kweere na Jizọs ga-enwe okwukwe na ya, ya bụ, ọ ga na-eme ihe o kweere.

Pọl kwuru, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile . . . Ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.” (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) Ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị, anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-eme ihe dị Jizọs mma, kama ịna-eme ihe dị anyị mma. Ihe kwesịrị ịka anyị mkpa ná ndụ bụ ime ihe Jizọs kụziiri anyị. Ime ihe Jizọs kụziiri anyị gbasakwara ụdị àgwà anyị na-akpa na ihe niile anyị na-eme ná ndụ. Gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jizọs ma nwee okwukwe na ya?

‘ONYE Ọ BỤLA NKE KWERE NA YA AGAGHỊ ALA N’IYI, KAMA Ọ GA-ENWE NDỤ EBIGHỊ EBI’

Akwụkwọ Jọn 3:16 kwukwara ihe Chineke ga-emere ndị na-erubere ya isi ma nwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs chụrụ. Ihe Chineke buuru ha n’obi bụ ka ha ‘ghara ịla n’iyi, kama ka ha nwee ndụ ebighị ebi.’ E nwere ụzọ ebe abụọ ndị na-erubere Chineke isi ga-anọ nweta ndụ ebighị ebi.

E nwere ndị Jizọs kwere nkwa na ha ga-enweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya na-aga ịkwadebere ha ebe ha na ya ga-anọ chịa ụwa. (Jọn 14:2, 3; Ndị Filipaị 3:20, 21) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe “ga-abụ ndị nchụàjà nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.”—Mkpughe 20:6.

Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-eso ya achị. Jizọs kwuru gbasara ha, sị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” (Luk 12:32) “Ìgwè atụrụ nta” ahụ hà ga-adị ole? Mkpughe 14:1, 4 sịrị: “M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ ahụ [ya bụ, Jizọs Kraịst] ka o guzo n’Ugwu Zayọn [nke dị n’eluigwe], ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha. . . . E si n’etiti ụmụ mmadụ zụta ha dị ka mkpụrụ mbụ a zụtaara Chineke na Nwa Atụrụ ahụ.” Otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ bụ “ìgwè atụrụ nta” n’eziokwu ma e were ha tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ ndị dịrịla ndụ n’ụwa. Ebe ọ bụ na e kwuru na ha ga-abụ ndị eze, olee ndị ha ga-achị?

Jizọs kwukwara na e nwere ndị ọzọ Alaeze ahụ nke ga-esi n’eluigwe na-achị ga-abara uru. Na Jọn 10:16, Jizọs kwuru, sị: “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a; m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m, ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” Ndị so n’atụrụ ọzọ a nwere olileanya ịdị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi otú Chineke chọburu ka Adam na Iv dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Oleekwanụ otú anyị si mara na ọ bụ n’ụwa ka ha ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi?

Ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru otú ụwa ga-adị mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. Ọ bụrụ na ị chọrọ  ịhụ ebe ndị ahụ, gụọ Abụ Ọma 37:9-11; 46:8, 9; 72:7, 8, 16; Aịzaya 35:5, 6; 65:21-23; Matiu 5:5; Jọn 5:28, 29; Mkpughe 21:4. Ebe ndị ahụ kwuru na oge na-abịa mgbe agha, ụkọ nri, ọrịa na ọnwụ ga-abụ ihe mgbe ochie. Ha kwukwara na oge na-abịa mgbe ndị ezi omume ga-arụ ụlọ nke ha, kọọ ubi ha ma zụọ ụmụ ha n’ebe obi ga-eru ha niile ala. * Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka ihe ọma ndị a ruo gị aka? Obi kwesịrị isi anyị ike na nkwa ndị a Chineke kwere ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

IHE CHINEKE MEERE ANYỊ ENWEGHỊ ATỤ

Ọ bụrụ na i chebara ihe Chineke meerela gị na ndị ọzọ echiche, ị ga-achọpụta na ha dị ọtụtụ. O nyere anyị ndụ na ọgụgụ isi na ihe ndị ọzọ na-enyere anyị aka ná ndụ. O mekwara ka ahụ́ na-agbasitụ anyị ike. Nke ka nke bụ na ọnwụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, nwụrụ n’ihi anyị ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma ndị ọzọ ruo anyị aka. Ọ bụ ya bụ ihe anyị mụtara na Jọn 3:16.

N’eziokwu, ụdị obi ụtọ anyị ga-enwe mgbe Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ bido ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa enweghị atụ. Udo ga-adị ebe niile, ebe niile ga-amakwa mma, o nwekwaghị onye ga-arịa ọrịa. N’oge ahụ, agha, ụkọ nri, na ọnwụ agakwaghị adị. Ọ bụ gị ga-ekpebi ma ihe ọma ndị a hà ga-eru gị aka ka ọ̀ bụ na ha agaghị eru gị aka. Ajụjụ i kwesịziri ịjụ onwe gị bụ: Gịnị ka m na-emere Chineke?

^ para. 24 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere amụma ndị ahụ, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ka Chineke Chọrọ Ka M Jiri Ndụ M Mee?

Chineke ọ̀ ga-agwa gị ná nrọ ma ọ bụ kpugheere gị ma ọ bụkwanụ kpọọ gị n’ụzọ pụrụ iche tupu gị amata ihe ọ chọrọ ka i jiri ndụ gị mee? Gụọ ihe a ka ị mata ihe Baịbụl kwuru.