Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2014

 NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ, SỊ . . .

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ndị Mmadụ Na-emegbu Ndị Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ha?

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ndị Mmadụ Na-emegbu Ndị Ọ Na-enweghị Ka Ọ Hà Ha?

Ọtụtụ ebe na Baịbụl kọọrọ anyị otú ụfọdụ ndị si megbuo ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Nebọt bụ otu n’ime ndị ahụ e megburu. * Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ atọ gara aga mgbe Ehab na-achị Izrel. N’oge ahụ, Ehab hapụrụ nwunye ya bụ́ Jezibel ka o gbuo Nebọt na ụmụ ya, ka Ehab nwee ike iwere ubi vaịn Nebọt. (1 Ndị Eze 21:1-16; 2 Ndị Eze 9:26) Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-eme ibe ha ụdị ihe a?

‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’—Taịtọs 1:2

O nwere otu ihe gbara ọkpụrụkpụ kpatara ya. Ihe ahụ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke apụghị ịgha ụgha. (Taịtọs 1:2) Olee otú ihe a Baịbụl kwuru si gbasa mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha? Mgbe Chineke kechara ụmụ mmadụ, ọ gwara ha na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha enupụrụ ya isi. Ihe Chineke kwuru mezuru n’ihi na kemgbe ụmụ mmadụ nupụụrụ ya isi n’ogige Iden, ọnwụ na-agba ndị mmadụ ose n’anya. Onye mbụ nwụrụ n’ụwa bụ Ebel. Ọ bụ nwanne ya bụ́ Ken gburu ya. Ihe mekwaranụ Ken ji gbuo nwanne ya bụ na obi tara Ken mmiri.—Jenesis 2:16, 17; 4:8.

Baịbụl gwara anyị na kemgbe ahụ, ‘ndị mmadụ na-achị mmadụ ibe ha ọchịchị nchigbu.’ (Ekliziastis 8:9) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Mgbe ụmụ Izrel chọrọ ka ha bido nwewe ndị eze ga na-achị ha, Jehova gwara ha na ndị ga-abụ ndị eze ha ga na-emegbu ha. Otú ha ga-esi na-emegbu ha ga-eme ka ha kpọkuo Chineke ka o nyere ha aka. (1 Samuel 8:11-18) Mgbe nwoke maara ihe aha ya bụ Sọlọmọn na-achị ụmụ Izrel, ọ manyere ha ịkwụ ụtụ isi buru ibu. (1 Ndị Eze 11:43; 12:3, 4) E nwekwara ndị eze ọjọọ mere ihe dị njọ karịa Sọlọmọn. Otu n’ime ha bụ Ehab. Ndị eze ahụ chịgburu ụmụ Izrel achịgbu. Chegodị echiche. Ọ bụrụ na Chineke mere ka a ghara inwe eze megburu ndị ọ na-achị, ndị mmadụ hà gaara ekweta na ihe Chineke kwuru bụ eziokwu?

‘Ndị mmadụ na-achị mmadụ ibe ha ọchịchị nchigbu.’—Ekliziastis 8:9

Anyị kwesịkwara icheta na Setan kwuru na ihe mere ndị mmadụ ji efe Chineke bụ ihe ọma ọ na-emere ha. (Job 1:9, 10; 2:4) Ọ bụrụ na Chineke emee ka ndị na-efe ya ghara inwe nsogbu ọ bụla, ọ́ gaghị egosi na ihe Ekwensu kwuru bụ eziokwu? Ọ bụrụ na Chineke emee ka a ghara inwe onye ga-emegbu ibe ya, ọ́ gaghị egosi na ọ bụ ezigbo onye ụgha? O mee otú ahụ, ọtụtụ ndị nwere ike iche na ụmụ mmadụ nwedịrị ike ịchị onwe ha n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na mmadụ enweghị ike ịchị onwe ya. (Jeremaya 10:23) Anyị kwesịrị ikpewe ekpere ka Alaeze Chineke bịa n’ihi na ọ gwụla ya ga-eme ka mmegbu kwụsị.

Nke a ọ̀ pụtara na Chineke gbara nkịtị, na-ele ụmụ mmadụ n’anya n’anya ka ha na-echi ibe ha ọnụ n’ala? Mbanụ. Ka anyị leba anya n’ihe abụọ gosiri na ọ gbachighị nkịtị. Nke mbụ bụ na Chineke na-eme ka ndị mmadụ mata na mmegbu bụ ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gbara ihe niile Jezibel mere Nebọt na ezinụlọ ya n’anwụ. Baịbụl mekwara ka anyị mata na o nwere otu onye dị ezigbo ike nke na-akpata ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa. Ma, onye a achọghị ka ndị mmadụ mata onye ọ bụ. (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrịnt 11:14) Baịbụl gwara anyị na onye ahụ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ihe mere Chineke ji gwa anyị onye na-akpata mmegbu na ihe ọjọọ niile bụ ka anyị ghara ịna-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ na-emegbu ndị ọzọ. Nke a ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.

Ihe nke abụọ gosiri na Chineke agbachighị nkịtị bụ na ọ na-eme ka obi sie anyị ike na mmegbu ga-akwụsị. Otú o si gbaa Ehab na Jezibel n’anwụ, maa ha ikpe ma taa ha na ndị ọ dị ka ọ dị ha ahụhụ na-eme ka obi sie anyị ike na ndị ajọ omume niile ga-emecha jiri isi ha buru ihe ha metere. (Abụ Ọma 52:1-5) Chineke kwekwara anyị nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-edozi nsogbu niile ajọ omume kpataara ndị hụrụ ya n’anya. * N’oge ahụ, Nebọt na ụmụ ya ga-adị ndụ na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. O nwekwaghị onye ga na-emegbu ibe ya mgbe ahụ.—Abụ Ọma 37:34.

^ para. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” nke gbara n’Ụlọ Nche a.

^ para. 8 Gụọ isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Baịbụl Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.