Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2014

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

Agha nke Ghasasịrị Ụwa

Agha nke Ghasasịrị Ụwa

Otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ụmụ okorobịa hapụrụ ụlọ ha gawa agha. Ha ji obi ha niile gawa agha ahụ maka na ihe na-ewu mgbe ahụ bụ na nwa okorobịa ọ bụla kwesịrị ịlụrụ ala nna ya ọgụ. Otu onye Amerịka nke so gaa agha ahụ n’afọ 1914 dere, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na m na-aga agha a.”

Ma mgbe obere oge gafere, ihe ha tụrụ anya ya abụghịzi ihe ha hụrụ n’ihi na agha ahụ bidoro kpawa ha ezé. E nweghị onye ma na ndị agha ga-alụ agha ahụ na Beljọm nakwa na Frans ruo ọtụtụ afọ. N’oge ahụ, a na-akpọ agha ahụ “Agha Ukwu.” Ma, a na-akpọzi ya agha ụwa nke mbụ.

Otu ihe mere e ji kpọọ ya agha ukwu bụ na o riri isi ọtụtụ ndị. Ụfọdụ akwụkwọ kwuru na agha ahụ gburu nde mmadụ iri, merụọkwa nde mmadụ iri abụọ ahụ́. Ihe ọzọ mere o ji bụrụ agha ukwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe a gaara eme ka a ghara ịlụ agha ahụ, ma e meghị ha. Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nọ na Yurop akwụsịghị ọgba aghara e nwere na Yurop, mgbe ha na-amatala ihe na-emenụ, agha ebirila ọkụ n’ebe niile n’ụwa. Nke ka nke bụ na “Agha Ukwu” ahụ kpara ụwa aka ọjọọ. Mkpamkpa ọ kpara n’ụwa ka na-enye ụmụ mmadụ nsogbu taa.

 OTÚ AGHA ỤWA NKE MBỤ SI BIRI ỌKỤ N’EBE NIILE

Ihe kpatara agha ụwa nke mbụ ahụ bụ na ụfọdụ ndị mere ihe ha na-ekwesịghị ime. Otu akwụkwọ kwuru na ndị na-achị Yurop ‘amaghị na ihe ha kpebiri ime n’afọ 1914 ga-eme ka njinji jie n’ụwa.’—The Fall of the Dynasties—The Collapse of the Old Order 1905-1922.

Mba ndị na-akpa ike na Yurop malitere ịlụso ibe ha agha mgbe e gbuchara onye kwesịrị ịnọchi eze ndị Ọstria. Ụbọchị ole na ole agha ahụ malitere, a jụrụ onyeisi ala Jamanị ihe kpatara agha ahụ. Ọ zara ná mwute, sị: “Ònye makwanụ?”

Mgbe ndị ọnụ na-eru n’okwu na Yurop kpebiri ihe ha chọrọ ime, ha amaghịdị nsogbu ọ ga-akpatara ndị mmadụ. Ma mgbe obere oge gafere, anya meghere ndị agha ahụ nọ n’ọgbọ agha. Ha chọpụtara na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha emeghị ihe ha kwesịrị ime nakwa na ndị ụkọchukwu ha ghọgburu ha. Ha chọpụtakwara na ndị ọchịagha ha duhiere ha. Olee otú o si bụrụ na a ghọgburu ha ma duhie ha?

Ha chọpụtara na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha emeghị ihe ha kwesịrị ime nakwa na ndị ụkọchukwu ha ghọgburu ha. Ha chọpụtakwara na ndị ọchịagha ha duhiere ha

Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha kwere ha nkwa na agha ahụ ga-eme ka ụwa ka mma. Onyeisi ala Jamanị kwuru, sị: “Ihe mere anyị ji alụ agha a bụ ka udo dịrị n’ala anyị ka ụlọ ọrụ anyị nwee ike ịna-arụpụta ihe, ka ihe ndị anyị ketara n’aka ndị nna nna anyị ghara ifu ọhịa nakwa ka ihe kara anyị mma n’ọdịnihu.” N’oge ahụ, onyeisi ala Amerịka, bụ́ Woodrow Wilson, kwuru na ihe mere e ji alụ agha ahụ bụ na “ọ ga-eme ka e nwee ọchịchị onye kwuo uche ya n’ebe niile n’ụwa.” Na Briten, ndị mmadụ chere na agha ahụ bụ “agha ga-eme ka agha niile bie.” Ma, ihe niile a ha tụrụ anya ha enweghị nke nwere isi.

Ndị ụkọchukwu ji obi ha niile kwado agha ahụ. Otu akwụkwọ kwuru na “ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị kwesịrị ịkụziri ndị mmadụ okwu Chineke, gbara ndị mmadụ ume ka ha gaa agha. Agha ahụ mere ka ndị mmadụ kpọọ ibe ha asị.” Ndị ụkọchukwu mere ka ndị mmadụ kpọkwuo ibe ha asị kama ime ka ha hụ ibe ha n’anya. Otu akwụkwọ nke kọrọ ihe mere n’oge ahụ sịrị na “ndị ụkọchukwu na ndị pastọ emeghị ka ndị mmadụ ghọta na ha kwesịrị iji ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ala nna ha. Ọtụtụ ndị ụkọchukwu mere ihe kaara ha mfe. Ha sịrị na mmadụ ịbụ Onye Kraịst na onye ahụ ife ala nna ya bụ otu ihe. Ha gbara ndị agha ahụ ume ka ha gburịta ibe ha n’aha Onye nzọpụta ha n’agbanyeghị chọọchị onye nke ọ bụla n’ime ha na-aga.”

Ndị ọchịagha ha kwere ha nkwa na ọ gaghị egbu oge ha emerie ndị iro ha. Ma, ihe agaghị otú ha kwuru. N’oge na-adịghị anya, o doro ndị agha ahụ anya na o nweghị ndị ga-emeri ibe ha n’agha ahụ. Mgbe obere oge gafere, ọtụtụ nde ndị agha hụsiri anya n’ọgbọ agha. Otu nwoke nke kọrọ ihe mere n’oge ahụ sịrị na ‘e nwere ike ikwu na mmadụ atatụbeghị ụdị ahụhụ ndị agha ahụ tara.’ N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị nọ na-anwụ n’agha ahụ, ndị ọchịagha nọ na-akpọga ọtụtụ ndị agha ha n’ọgbọ agha ka ha kwawa mgbọ. Nke a mere ka ọtụtụ ndị agha bido inupụrụ ndị ọchịagha ha isi.

Olee nsogbu agha ụwa nke mbụ ahụ kpataara ndị mmadụ? E nwere otu akwụkwọ nke kọrọ ihe otu nwoke so gaa agha ahụ kwuru. Ọ sịrị na agha ahụ ‘ghasasịrị otú ndị mmadụ si eche echiche na otú ha si akpa àgwà.’ Agha ahụ lakwara ọchịchị obodo ụfọdụ n’iyi. Ọ kpatara ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ mere ka e gbuo ọtụtụ ndị mmadụ otú a na-egbutụbeghị. Mgbe agha ahụ biri, ndị mmadụ bidoziri na-agba abụbọ ọrụ ma na-eme ngagharị iwe ka a gbanweere ha ndị ọchịchị.

Gịnị mere agha ahụ ji ghasaa ọtụtụ ihe n’ụwa? Agha ahụ ọ̀ dapụtara n’onwe ya, ka ò nwere ihe ọzọ kpatara ya? Azịza ajụjụ ndị a hà nwere ike inyere anyị aka ka anyị mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?