Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE FEBỤWARỊ 2014

 ṄOMIE OKWUKWE HA | ỊLAỊJA

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị Ihe Ọjọọ Ndị Mere n’Oge Ọ Nọ Ndụ

Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị Ihe Ọjọọ Ndị Mere n’Oge Ọ Nọ Ndụ

ỊLAỊJA nọ na-aga ije na ndagwurugwu Jọdan. Izu ole na ole agafeela kemgbe ọ hapụrụ Ugwu Horeb ma chee ihu n’ebe ugwu Izrel. Ugbu a, o rutela n’Izrel ma chọpụta na ihe agbanwetụwala. Ebe niile akpọghịzi nkụ otú ọ kpọrọ n’oge oké ọkọchị kọrọ n’Izrel. Ndị ọrụ ubi akọwala ihe n’ubi ha n’ihi na mmiri ezowela obere obere. O nwere ike ịbụ na obi dịtụ Ịlaịja ụtọ na ala ha adịwala mma. Ma, ihe ka ya mkpa bụ ndị bi n’Izrel. Ọtụtụ n’ime ha ejibeghị ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ha ka na-efe Bel. Ịlaịja ka nwere ọrụ buru ibu ọ ga-arụ. *

Mgbe Ịlaịja rutewere obodo Ebel-mehola, ọ hụrụ ebe ndị mmadụ na-akọ ihe n’ugbo buru ibu. Ha ji ehi iri abụọ na anọ e jikọrọ abụọ abụọ na-akọ ihe n’ugbo ahụ. Onye du ehi abụọ nke ikpeazụ bụ onye Ịlaịja na-achọ. Aha ya bụ Ịlaịsha. Jehova chọrọ ka Ịlaịsha nọchie Ịlaịja. Ebe ọ bụ na o nwere mgbe ọ dị Ịlaịja ka ọ̀ bụ naanị ya bụ onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, o doro anya na obi dị ya ụtọ ịhụ Ịlaịsha.—1 Ndị Eze 18:22; 19:14-19.

Ma, ò wutere Ịlaịja na ya na-aga inyefe onye ọzọ ọrụ ụfọdụ ọ na-arụbu ma ọ bụkwanụ na onye ọzọ ga-anọchi ya otu ụbọchị? Anyị amaghị, ma anyị agakwanụghị asị na ụdị ihe ahụ agbataghị ya n’obi. Ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na Ịlaịja “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) Nke ọ bụla ọ bụ, Baịbụl kwuru na ‘Ịlaịja gafetara n’ebe Ịlaịsha nọ wee wụkwasị Ịlaịsha uwe e ji mara ya.’ (1 Ndị Eze 19:19) O nwere ike ịbụ na e ji akpụkpọ atụrụ ma ọ bụ akpụkpọ ewu mee uwe ahụ e ji mara Ịlaịja. Uwe ahụ na-egosi na e nwere ọrụ pụrụ iche Jehova nyere Ịlaịja. O nwere ihe uwe ahụ ọ wụkwasịrị n’ubu Ịlaịsha pụtara. O gosiri na Ịlaịja mere ihe Jehova gwara ya. Ọ họpụtara Ịlaịsha ka ọ nọchie ya. O gosikwara na Ịlaịja tụkwasịrị Chineke ya obi, nke mere o ji rubere ya isi.

Ịlaịja wedara onwe ya ala gaa họpụta Ịlaịsha ka ọ bụrụ onye ga-anọchi ya

Ịlaịsha chọkwara inyere onye amụma a merela agadi aka. Ma, ọ bụghị ozugbo ahụ ka ọ ga-anọchi Ịlaịja. Kama ịnọchi ya mgbe ahụ, o weturu onwe ya ala jeere Ịlaịja ozi ihe dị ka afọ isii. Ọ bụ ya mere e ji mechaa kpọwa ya “onye wụsara mmiri n’aka Ịlaịja.” (2 Ndị Eze 3:11) O doro anya na obi dị Ịlaịja ụtọ na ya nwetara nwoke a na-agba mbọ nke nyeere ya ezigbo aka. Ọ ga-abụ na mgbe obere oge gafere, ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi. O doro anya na otú ha si na-agbarịta ibe ha ume nyeere ha aka ịtachi obi n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ala ha. N’oge ahụ, ihe ọjọọ eze ha, bụ́ Ehab, na-eme karịrị akarị.

Ndị mmadụ hà emegbutụla gị? A na-emegbu ọtụtụ n’ime anyị n’ihi na arụrụala juru ụwa n’oge a. Ọ bụrụ na anyị emete onye hụrụ Chineke n’anya enyi, onye ahụ ga-enyere anyị aka idi ihe ọjọọ anyị na-ahụ. O nwere ọtụtụ ihe okwukwe Ịlaịja ga-akụziri anyị gbasara otú anyị ga-esi die mmegbu a na-emegbu anyị.

“BILIE, GBADAA KA I ZUTE EHAB EZE IZREL”

Ịlaịja na Ịlaịsha gbasiri mbọ ike ka ha nyere ndị Izrel aka ka ha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ  na ha zụrụ ndị amụma ndị ọzọ. O nwere ike ịbụ na ha na-akpọkọta ha otu ebe na-akụziri ha ihe. Ma, mgbe obere oge gafere, Jehova gwara Ịlaịja ọrụ ọhụrụ ọ ga-arụ. Ọ sịrị Ịlaịja: “Bilie, gbadaa ka i zute Ehab eze Izrel.” (1 Ndị Eze 21:18) Gịnị ka Ehab mere?

Ehab akwụsịla ife Chineke. Kemgbe ndị Izrel nwewere ndị eze, ọ bụ ya bụ eze kacha njọ chịtụrụla Izrel. Ọ lụrụ Jezibel, bụ́ nwaanyị na-efe Bel ma mee ka ọtụtụ ndị fewezie Bel n’Izrel. (1 Ndị Eze 16:31-33) Ọ na-abụ ndị na-efe Bel fewe Bel, ha na-akwa iko aghara aghara, na-achụ ụmụaka n’àjà ma na-eme omenala ha ndị ọzọ rụrụ arụ. Ihe ọzọ bụ na ọ dịbeghị anya Ehab nupụụrụ Jehova isi. Jehova gwara ya ka o gbuo eze ọjọọ ndị Siria bụ́ Ben-hedad. Ma, o meghị ihe Jehova kwuru. O nwere ike ịbụ na ihe mere Ehab egbughị eze ahụ bụ na ọ tụrụ anya na eze ahụ ga-enye ya ego. (1 Ndị Eze, isi nke 20) Ma ugbu a, otú Ehab na Jezibel si hụ ego n’anya, otú ha si na-egbu ndị mmadụ, na oké ọchịchọ ha akala njọ.

Obí Ehab dị na Sameria. O buru ezigbo ibu. O nwekwara obí ọzọ na Jezril. Jezril dị ihe dị ka kilomita iri atọ na asaa ma e si Sameria gawa ya. E nwere otu ubi vaịn dị n’akụkụ obí ahụ dị na Jezril. Onye nwe ubi ahụ bụ nwoke a na-akpọ Nebọt. Ma, Ehab nọ na-achọ otú ọ ga-esi enweta ubi vaịn ahụ. Ehab kpọrọ Nebọt ma gwa ya ka ya kwụọ ya ụgwọ ma were ubi ahụ ma ọ bụkwanụ ka ya were ya nye ya ala n’ebe ọzọ. Ma, Nebọt sịrị ya: “Tụfịakwa! Dị ka Jehova si ele ihe anya, agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m hà.” (1 Ndị Eze 21:3) Nebọt ọ̀ na-emere eze ya isi ike? Ọtụtụ ndị chere otú ahụ. Ma, ihe a ọ gwara eze gosiri na ọ chọrọ ime ihe Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha mee. Jehova gwara ụmụ Izrel na o nweghị onye ga-eresị onye ọzọ ala ezinụlọ ya ketara, ala ahụ aghọzie nke onye ahụ e resịrị ya. (Levitikọs 25:23-28) Nebọt achọghị imebi iwu Chineke. O nwere okwukwe, obi sikwara ya ike. Ọ bụ ya mere o ji gwa Ehab ihe ahụ ọ gwara ya n’agbanyeghị na ọ ma na Ehab bụ ajọ mmadụ.

Ma, o nweghị ihe Ehab ji iwu Jehova kpọrọ. Mgbe ya na Nebọt hụchara, ọ lara n’ụlọ ya, “nọrọ ná mwute ma gbarụọ ihu” maka na Nebọt emeghị ihe ọ chọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “O wee dinara n’ihe ndina ya, ma chee ihu ya ebe ọzọ, o righịkwa nri.” (1 Ndị Eze 21:4) Mgbe Jezibel hụrụ di ya ka o dewere ihu ka nwatakịrị na-ewe iwe na-enweghị isi na ọdụ, ọ kpara nkata otú di ya ga-esi enweta ala ahụ ọ chọrọ. Nkata ahụ ọ kpara ga-emekwa ka e gbuo otu ezinụlọ na-efe Chineke.

O nweghị onye ga-agụcha akụkọ nkata ahụ ọ kpara ma ghara ịkpọ n’ubu. Jezibel ma na iwu Chineke kwuru na ọ dịkarịa ala, a ga-enwerịrị mmadụ abụọ ga-agba akaebe na mmadụ mere ihe dị oké njọ tupu a maa onye ahụ ikpe. (Diuterọnọmi 19:15) N’ihi ya, o ji aha Ehab degara ndị a ma ama n’obodo Jezril akwụkwọ ozi ka ha chọta ụmụ nwoke abụọ ga-ebo Nebọt ebubo ụgha nke ga-eme ka a maa ya ikpe ọnwụ. Nkata a ọ kpara gara otú ọ chọrọ ya. “Ndị ikom abụọ na-abaghị n’ihe” boro Nebọt ebubo ụgha. Nke a mere ka e jiri nkume tụgbuo Nebọt. Ma, ọ bụghị ebe ahụ ka okwu biri.  E gbukwara ụmụ Nebọt. * (1 Ndị Eze 21:5-14; Levitikọs 24:16; 2 Ndị Eze 9:26) Ehab gosiri na ọ bụghịzi ya bụ onyeisi ezinụlọ ya. Ọ hapụrụ nwunye ya ka ọ kpawa ike otú ọ chọrọ ma gbuo ndị ahụ na-enweghị ihe ha mere.

Chegodị otú obi dị Ịlaịja mgbe Jehova gwara ya ihe Ehab na nwunye ya mere. Obi anaghị adị ndị ezi omume mma mgbe ọ bụla o yiri ka ndị ajọ omume hà na-emekpọ ndị ezi omume ọnụ. (Abụ Ọma 73:3-5, 12, 13) Taa, anyị na-ahụkarị ebe ndị mmadụ na-emegbu mmadụ ibe ha. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ bụ ndị sịrị na ha na-anọchi anya Chineke. Ma, akụkọ Nebọt na-akasi anyị obi. Ọ na-egosi anyị na o nweghị ihe mmadụ nwere ike izoro Jehova. Ọ na-ahụ ihe niile na-emenụ. (Ndị Hibru 4:13) Ma, gịnị ka ọ na-eme ma ọ hụ ebe ndị mmadụ na-emegbu ndị ọzọ?

“ONYE IRO M, Ị̀ CHỌRỌWO M BỊA?”

Jehova zipụrụ Ịlaịja ka ọ gakwuru Ehab. Chineke gwara ya hoo haa ebe ọ ga-ahụ Ehab. Ọ sịrị ya: “Ọ nọ n’ubi vaịn Nebọt.” (1 Ndị Eze 21:18) Mgbe Jezibel gwara Ehab na ubi Nebọt bụzi nke ya, Ehab si n’ebe o dina bilie gawa ịhụ ubi ahụ. Ma, o nweghị mgbe ọ gbatara ya n’obi na Jehova na-ahụ ihe na-emenụ. Weregodị ya na ị na-ahụ ka Ehab na-agagharị n’ubi vaịn ahụ, na-ekwe n’isi ma na-eche otú ubi ahụ ga-esi maa mma mgbe o mezichara ya. Ma mgbe ọ na-ama ihe na-eme, Ịlaịja wụchiri. Ihu gbarụrụ Ehab ozugbo, ya asị Ịlaịja: “Onye iro m, ị̀ chọrọwo m bịa?”—1 Ndị Eze 21:20.

“Onye iro m, ị̀ chọrọwo m bịa?”

Ihe a Ehab kwuru gosiri na ọ dị iberiibe. Ihe mbụ gosiri na ọ dị iberiibe bụ na ọ jụrụ Ịlaịja ma ‘ọ̀ chọrọwo ya bịa?’ Nke a gosiri na Jehova anaghị abatadị ya n’obi. Jehova ahụla ya kemgbe. Ọ hụrụ ka Ehab kpachaara anya mee ihe na-adịghị mma ma na-enwezi obi ụtọ na Jezibel egbuola Nebọt na ụmụ ya, ubi abụrụzie nke ya. Chineke hụrụ ihe dị n’obi Ehab ma chọpụta na ọ hụbigara akụ̀ n’anya ókè nke na ọ makwaghị ihe bụ́ imetere mmadụ ibe ya ebere, ime obiọma ma ọ bụ ikpe ikpe ziri ezi. Ihe nke abụọ gosiri na ọ dị iberiibe bụ na ọ kpọrọ Ịlaịja ‘onye iro ya.’ Ihe a Ehab kwuru gosiri na ọ kpọrọ onye ya na Jehova Chineke bụ enyi asị, bụ́ onye gaara enyere ya aka ka ọ ghara ịbanye ná nsogbu.

Iberiibe a Ehab mere na-akụziri anyị ihe. Ọ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile  na Jehova Chineke na-ahụ ihe niile. Ebe ọ bụ na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ na-amasị ya inyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị mere ihe ọjọọ ka anyị nwee ike ịhapụ ihe ọjọọ ahụ. Ọ na-ejikarị ndị bụ́ enyi ya enyere anyị aka, ya bụ, ụmụ mmadụ ndị na-agwa mmadụ ibe ha okwu Chineke otú ahụ Ịlaịja mere. Ọ ga-abụ ihe jọgburu onwe ya ma anyị were ndị enyi Chineke ka ndị iro anyị.—Abụ Ọma 141:5.

Weregodị ya na ị na-ahụ Ịlaịja mgbe ọ zara Ehab, sị: “Achọrọwo m gị bịa.” Ịlaịja ma na Ehab bụ onye ohi, onye na-egbu ọchụ, na onye na-enupụrụ Jehova Chineke isi. Ọ bụ maka na obi siri Ịlaịja ike mere o ji nwee ike ịsa eze ọjọọ ahụ okwu. Ịlaịja gwaziri Ehab ihe Chineke kpebiri ime ya. Jehova ma na ihe ọjọọ abaala Ehab na ndị ezinụlọ ya n’ụmị, ndị ọzọ esorokwa ha mewe ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere Ịlaịja ji gwa Ehab na Chineke ekpebiela na ya “ga-ebibi” ezinụlọ eze, bibiekwa Jezibel.—1 Ndị Eze 21:20-26.

Ọtụtụ ndị taa chere na ndị ajọ omume agaghị aghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. Ma, Ịlaịja echeghị otú ahụ. Ihe akụkọ Ehab na-akụziri anyị abụghị naanị na Jehova Chineke na-ahụ ihe niile na-emenụ, ọ na-akụzikwara anyị na ọ ga-eme ka ndị ajọ omume jiri isi ha buru ihe ha metere. Baịbụl gwara anyị na oge na-abịa mgbe ọ ga-eme ka mmegbu na ihe ọjọọ niile kwụsị. (Abụ Ọma 37:10, 11) Ma i nwere ike ịjụ, sị: ‘Nke a ọ̀ pụtara na ihe dị Chineke mkpa bụ ịta ndị ajọ omume ahụhụ? Ọ̀ bụ na ọ naghị eme ebere?’

“Ị̀ HỤWO OTÚ EHAB SI WEDA ONWE YA ALA?”

O nwere ike ịbụ na ihe Ehab mere mgbe ọ nụchara ihe Chineke chọrọ ime ya na ezinụlọ ya tụrụ Ịlaịja n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “O wee ruo na ngwa ngwa Ehab nụrụ okwu ndị a, ọ dọwara uwe ya wee yiri ákwà iru uju; o wee buo ọnụ ma yiri ákwà iru uju dinara ala ma na-eje ije ná mwute.” (1 Ndị Eze 21:27) Ihe a Ehab mere ọ̀ pụtara na o chegharịala?

Anyị nwere ike ikwu na ihe ahụ ọ nụrụ mere ka ọ kwụsịtụ àgwà ọjọọ ya. O jisiri ike weda onwe ya ala n’agbanyeghị na ọ dị mpako. Ma, ò ji obi ya niile chegharịa? Ka anyị weregodị ihe eze ọjọọ ọzọ aha ya bụ Manase mere tụnyere ihe Ehab mere. Manase mere ihe ọjọọ karịa Ehab. Mgbe Jehova tara Manase ahụhụ, o wedara onwe ya ala ma kpọkuo Jehova ka o nyere ya aka. Ma, o nwekwara ihe ọzọ o mere. Ọ hapụrụ ihe ọjọọ niile ọ na-eme ma wepụsịa arụsị ndị e nwere n’Izrel, o jisikwara ike na-efe Jehova, na-agbakwa ụmụ Izrel ume ka ha mewekwa otú ahụ. (2 Ihe E Mere 33:1-17) Ehab ò mere ụdị ihe ahụ Manase mechara mee? Ọ dị mwute na o meghị otú ahụ.

Jehova ọ̀ hụrụ ihe Ehab mere mgbe ọ nụrụ ihe ahụ a gwara ya? Jehova sịrị Ịlaịja: “Ị̀ hụwo otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m? Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eweta ọdachi ahụ n’ụbọchị ya. Ọ bụ n’ụbọchị nwa ya ka m ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ụlọ ya.” (1 Ndị Eze 21:29) Nke a ọ̀ pụtara na Jehova agbagharala Ehab? Mba. Naanị ihe ga-eme ka Chineke gbaghara mmadụ bụ ma onye ahụ jiri obi ya niile chegharịa. (Ezikiel 33:14-16) Ma, ebe ọ bụ na Ehab gositụrụ na ihe o mere wutere ya, Jehova metụụrụ ya ebere. Ebere Chineke meere Ehab bụ na Ehab agaghị ahụ mgbe a ga-egbu ndị ezinụlọ ya niile.

Jehova agbanweghị ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme Ehab. Jehova mechara jụọ ndị mmụọ ozi ya otú kacha mma a ga-esi ghọgbuo Ehab ka o soro gaa agha ga-ata isi ya. N’oge na-adịghị anya, Jehova mere ihe o kwuru gbasara Ehab. Mgbe Ehab gara agha ahụ, e merụrụ ya ahụ́, ọbara agbagide ya n’ụgbọ ịnyịnya ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Baịbụl kọrọ ihe niile mere n’ụbọchị ahụ. O kwuru na nkịta rachara ọbara Ehab mgbe a na-asacha ụgbọ ịnyịnya ya. Ọ bụ otú ahụ ka okwu Jehova nke Ịlaịja gwara Ehab si mezuo. Ịlaịja gwara Ehab, sị: “N’ebe ahụ nkịta rachara ọbara Nebọt ka nkịta ga-aracha ọbara gị.”—1 Ndị Eze 21:19; 22:19-22, 34-38.

Otú ahụ Ehab si nwụọ gosiri Ịlaịja, Ịlaịsha, na ndị ọzọ fere Jehova na Jehova echefughị okwukwe Nebọt nwere na obi ike ya. Ebe ọ bụ na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ ga-emerịrị ka ndị ajọ omume ghọrọ mkpụrụ ha kụrụ. Ọ ga-emekwara ha ebere ma ọ bụrụ na ha echegharịa. (Ọnụ Ọgụgụ 14:18) O doro anya na e nwere ezigbo ihe Ịlaịja mụtara n’ihe ahụ mere Ehab ebe ọ bụ na ọ nọ na-edi ihe ọjọọ niile eze Ehab nọ na-eme kemgbe ọtụtụ afọ. È nwetụla mgbe ndị mmadụ megburu gị? Ị̀ ga-achọ ịhụ mgbe Chineke ga-eme ka mmegbu kwụsị? Ọ bụrụ na ị chọrọ, gbalịa ka i nwee okwukwe ka Ịlaịja. Ya na Ịlaịsha nọ na-agwa ndị mmadụ ihe Chineke kwuru n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị ha hụrụ.

^ para. 3 Ndị na-efe Bel kweere na ọ bụ Bel na-eme ka mmiri zoo nakwa na ọ bụ ya na-eme ka ala na-eme nri nke ọma. Ma, Jehova mere ka oké ọkọchị kọọ afọ atọ na ọnwa isii n’ala Izrel ka o gosi ụmụ Izrel na Bel enweghị ike ọ bụla. (1 Ndị Eze, isi nke 18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke gbara n’Ụlọ Nche January 1, 2008 nakwa nke gbara n’Ụlọ Nche April 1, 2008.

^ para. 13 O nwere ike ịbụ na ihe mere Jezibel ji kata obi kpaa nkata ka e gbuo ụmụ Nebọt bụ na ọ ma na ọ bụ ụmụ Nebọt ga-eketa ubi vaịn Nebọt ma Nebọt nwụọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta ihe mere Chineke ji kwe ka ụdị ihe ọjọọ a na-eme, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị” Ọ dị na peeji nke 11 n’Ụlọ Nche a.