Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE DISEMBA 2013

 AKỤKỌ NDỤ

Emere M Ka Ozi Jehova Bụrụ Ihe Mbụ ná Ndụ M

Emere M Ka Ozi Jehova Bụrụ Ihe Mbụ ná Ndụ M

Mgbe m gachara kọleji n’ọnwa mbụ nke afọ 1937, m banyere n’otu mahadum dị na steeti a na-akpọ Ayowa, n’Amerịka. Mahadum a dị nso n’ebe anyị bi. N’oge ahụ, anaghị m enwe ohere n’ihi na ana m aga akwụkwọ, na-arụkwa ọrụ iji nweta ego m ji akwụ ụgwọ akwụkwọ. Kemgbe m bụ nwata, ihe m chọrọ ime ná ndụ m bụ ịmụta otú e si arụ nnukwu ụlọ elu na àkwà mmiri ndị toro ezigbo ogologo.

O nwere otu ihe mere ná mbido afọ 1942, mgbe ọ fọrọ ọnwa ole na ole ka m gụchaa akwụkwọ na mahadum ma nweta akara ugo mmụta. N’oge ahụ, mba Amerịka esorola mba ndị ọzọ lụwa Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka otu onye n’ime mmadụ abụọ mụ na ha bi gwara m ka m gaa na nke ụmụ okorobịa bi n’ala ụlọ anyị ka mụ na otu nwoke na-abịa na nke ha kwurịta okwu. Mgbe m gara, m hụrụ nwoke ahụ. Aha ya bụ John O. (Johnny) Brehmer. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Otú o si jiri Baịbụl na-aza ajụjụ ọ bụla a jụrụ ya juru m anya. Obi tọrọ m ụtọ, mụ ekweta ka Johnny kụziwere m Baịbụl. M mechakwara soro ya na-ekwusa ozi ọma mgbe ọ bụla m nwere ohere.

Aha papa Johnny bụ Otto. Ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova mgbe ọ na-arụ ọrụ n’otu ụlọ akụ̀ dị n’obodo Wọlnọt, nke dị na steeti a na-akpọ Ayowa. Ọ bụ onyeisi ụlọ akụ̀ ahụ n’oge ahụ. Ma, ọ hapụrụ ọrụ ahụ bido ikwusa ozi ọma oge niile. Àgwà ọma ya na ndị ezinụlọ ya na-akpa mechara mee ka m kpebie ime otu ihe dị mkpa m mere ná ndụ m.

EKPEBIRI M IHE M GA-EME

Otu ụbọchị, otu onyeisi na mahadum anyị gwara m na ọ ga-esiri ha ike inye m asambodo maka na anaghịzi m eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Echetara m na ihe m mere mgbe ahụ bụ ikpegara Jehova Chineke ekpere, rịọ ya ka o nyere m aka ka m mata ihe m kwesịrị ime. Obere oge ihe a mechara, a kpọrọ m ka m gaa hụ otu ọkachamara na-akụziri anyị ihe. Ọ gwara m na o nwere onye ziteere ya ozi na ya chọrọ onye injinia ga na-arụrụ ya ọrụ, ya enye onye ahụ aha m n’ihi na o chere na m ga-achọ inweta ọrụ ahụ. Ekelere m ọkachamara ahụ ma gwa ya na mụ ekpebiela iji ndụ m jeere Jehova ozi. N’abalị iri na asaa n’ọnwa Jun nke afọ 1942, e mere m baptizim. Obere oge e mechara m baptizim, a họpụtara m ka m kwusawa ozi ọma oge niile.

Ná ngwụcha afọ 1942 ahụ, m natara akwụkwọ ozi kwuru ka m bịa ghọọ onye agha. N’ihi ya, m gara n’ihu ndị na-ahọpụta ndị agha ka m kọwaara ha ihe mere na achọghị m ịbụ onye agha. M gosiri ha ihe ndị ọkachamara kụziiri m ihe na mahadum dere gbasara m. Ha dere na m bụ ezigbo mmadụ, bụrụkwa ọkaibe n’ọrụ injinia. N’agbanyeghị ihe ọma niile ahụ e dere gbasara m, ha gwara m ka m kwụọ puku dọla iri (ihe karịrị otu nde naịra na narị puku naịra ise). Ha tụkwara m mkpọrọ afọ ise n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo Levinwọt, nke dị na steeti a na-akpọ Kansas.

IHE NDỊ MERE MGBE M NỌ N’ỤLỌ MKPỌRỌ

A tụkwara ihe karịrị narị ụmụ okorobịa abụọ na iri atọ bụ́ Ndịàmà Jehova mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Levinwọt. N’ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị na-arụ ọrụ n’ubi  e nwere n’ebe ahụ, e nwekwara ọtụtụ ndị na-eche anyị nche. Ụfọdụ n’ime ha ma na Ndịàmà Jehova anaghị alụ agha, ha kwetakwara na ihe anyị na-ekwu bụ eziokwu.

Ụfọdụ n’ime ndị nche ahụ na-enye anyị ohere ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe. Ha na-enyekwara anyị aka ka anyị na-enweta akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ kwudịrị ka a na-ewetara ya magazin Consolation ọ bụla e bipụtara (a na-akpọ ya Teta! ugbu a).

OTÚ M SI PỤTA N’ỤLỌ MKPỌRỌ MA KWUSAWA OZI ỌMA NÁ MBA ỌZỌ

Otú ụlọ mkpọrọ ahụ dị na Levinwọt dị ugbu a. Anyị dị narị mmadụ abụọ na iri atọ a tụrụ mkpọrọ na ya

Mgbe m nọrọ afọ atọ n’ime afọ ise e kwuru na m ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ, a hapụrụ m. Ihe a mere n’abalị iri na isii nke ọnwa Febụwarị n’afọ 1946. N’oge ahụ, Agha Ụwa nke Abụọ ebiela. M bidoghachiri ikwusa ozi ọma oge niile n’egbughị oge. A gwara m ka m gaghachi n’obodo Levinwọt kwusawa ozi ọma. Ezigbo egwu tụrụ m n’ihi na ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ kpọrọ Ndịàmà Jehova asị. Ihe ọzọ bụ na inweta ọrụ m ga na-arụ na ebe m ga-ebi siiri m ezigbo ike.

Echetara m ihe mere otu ụbọchị m gara ozi ọma. M hụrụ otu nwoke na-eche nche n’ụlọ mkpọrọ ahụ m nọbu. Ọ sịrị m, “Si n’ụlọ m pụọ!” Ozugbo ahụ, elere m ya anya n’aka ma hụ na o ji osisi e ji akụ bọl. Ụjọ tụrụ m, mụ esi n’ụlọ ya pụọ ozugbo. Mgbe m gara n’ụlọ ọzọ, otu nwaanyị pụtara ma sị m, “Chere, m na-abịa.” Ọ kwachiri ụzọ ma banye n’ime ụlọ. Anọ m ebe ahụ na-eche ya, ma ihe m hụziri bụ onye si na windo wụọ m mmiri e ji saa efere. Ọ wụzuru m ya ahụ́. N’agbanyeghị ihe ndị a, Chineke gọziri ozi ọma m na-ekwusa. Emechara m nụ na ụfọdụ ndị m nyere akwụkwọ e ji amụ Baịbụl ghọrọ Ndịàmà Jehova.

N’afọ 1943, Ndịàmà Jehova bidoro ụlọ akwụkwọ ọhụrụ n’obodo Niu Yọk, bụ́ ebe a na-azụ ndị ga-aga mba ọzọ na-ekwusa ozi ọma. A kpọrọ m ka m bịa gụọ akwụkwọ na ya. M so ná ndị gụrụ akwụkwọ na klas ya nke iri. Anyị gụchara n’abalị asatọ n’ọnwa Febụwarị nke afọ 1948, e ziga m Gana ka m gaa kwusawa ozi ọma. E mechara kpọwa ụlọ akwụkwọ ahụ Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

Mgbe m rutere Gana, a gwara m ka m kwusawara ndị ọrụ gọọmenti na ndị si Yurop bịa Gana ozi ọma. Ná ngwụcha izu ọ bụla, m na-eleta ọgbakọ Ndịàmà Jehova, mụ na ha na-esokwa aga ozi ọma. M na-agakwa n’ebe a na-enweghị ọtụtụ Ndịàmà Jehova ma kụziere Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ otú e si ekwusa ozi ọma. M na-agakwa agba ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Kot devụa ume.

N’oge ahụ m na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị ahụ, m mụtara ime ihe ndị Afrịka na-eme. Dị ka ihe atụ, m na-ehi n’ụlọ akịrịka, na-eji aka nkịtị eri nri, na-etukwurukwa ala n’èzí anyụ nsị otú ahụ ndị Izrel mere mgbe ha nọ n’ala ịkpa. (Diuteronomi 23:12-14) Ihe ndị a mụ na ndị ọzọ si mba ọzọ bịa ikwusa ozi ọma  na-eme mere ka ndị mmadụ na-akọ akụkọ ọma gbasara anyị. Ụfọdụ ụmụ nwaanyị ndị di ha bụ ndị ọrụ gọọmenti malitere ịmụ Baịbụl. Ụmụ nwaanyị ahụ mechara nyere anyị ezigbo aka. N’oge ndị ọjọọ chọrọ ime ka a chụlaa anyị, ha nyere di ha nsogbu ka ha hụ na a chụlaghị anyị. Ndị di ha gere ha ntị. A chụlaghịzi anyị.

M mechara rịa ọrịa ịba otú ọtụtụ ndị ọzọ si mba ọzọ bịa izi ozi ọma n’Afrịka rịakwara. Ezigbo ahụ́ ọkụ mere m, oké oyi kpakwara m aka ọjọọ nke na ọ fọrọ obere ka ịba ahụ baa m n’isi. Mgbe ụfọdụ, m na-ejide agba m aka ka ọ kwụsị ịma jijiji. N’agbanyeghị ya, m ka nọ na-enwe obi ụtọ n’ozi ọma m na-ekwusa.

N’ime afọ anọ mbụ m nọrọ n’Afrịka, mụ na nwanna nwaanyị aha ya bụ Eva Hallquist nọ na-ederịta akwụkwọ ozi. Mụ na ya matara n’oge m chọrọ ịhapụ Amerịka bịawa Afrịka. M nụrụ n’oge ahụ na o so n’ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke iri abụọ na otu n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. M nụkwara na ha ga-eme ememme ngụcha akwụkwọ ha n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Julaị nke afọ 1953 ná mgbakọ mba niile Ndịàmà Jehova ga-enwe ná nnukwu ámá egwuregwu Yankii, nke dị na Niu Yọk. N’ihi ya, mụ na otu onye na-akwọ ụgbọ mmiri kparịtara, ya ekweta na ọ bụrụ na m rụọrọ ya ọrụ n’ụgbọ mmiri ya, ọ ga-eburu m n’efu ruo Amerịka.

O were anyị abalị iri abụọ na abụọ tupu anyị eruo Amerịka. Mụ na Eva hụziri n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ gwa ya na m chọrọ ịlụ ya. Mụ na Eva mechara lụọ, ya abịa soro m kwusawa ozi ọma na Gana.

OTÚ ANYỊ SI NYERE NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ AKA

Mgbe mụ na nwunye m kwusarala ozi ọma ọtụtụ afọ n’Afrịka, mama m detaara m akwụkwọ ozi, kwuo na ọrịa kansa ji papa m aka ọjọọ. M rịọrọ ka e nyetụ m oge ka mụ na nwunye m laa Amerịka gaa nyere papa m aka. Mgbe anyị ruru, ọrịa ahụ kara njọ. Obere oge, papa m nwụrụ.

Mgbe anyị laghachiri Gana ma nọruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ anọ, anyị natara ozi na ahụ́ na-arịa mama m. Ụfọdụ ndị enyi anyị gwara anyị na ọ ga-aka mma ka anyị lọta bịa lekọta ya. Anyị kwetara. Ma, ịhapụ ọrụ anyị adịrịghị anyị mfe ebe ọ bụ na anyị anọteela aka n’Afrịka. N’oge ahụ, m kwusaala ozi ọma afọ anọ n’ebe ahụ naanị m, mụ na nwunye ekwusaakwa ya afọ iri na otu. Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị laghachiri Amerịka.

Mgbe anyị gara hụ eze otu obodo dị na Gana

Mụ na nwunye m lekọtara mama m ruo ọtụtụ afọ. Anyị na-enyekwara ya aka ka ọ na-aga ọmụmụ ihe mgbe o kwere ya. Ma, ọ nwụrụ n’abalị iri na asaa n’ọnwa Jenụwarị nke afọ 1976. Ọ dị afọ iri asatọ na isii mgbe ọ nwụrụ. Ma, mgbe afọ itoolu gachara, nke ka njọ mere. Ndị dọkịta chọpụtara na nwunye m na-arịa ọrịa kansa. Anyị gbalịrị ike anyị niile ka a gwọọ ya, ma ọrịa ahụ mechara gbuo ya n’abalị anọ n’ọnwa Jun nke afọ 1985, mgbe ọ dị afọ iri asaa.

IHE NDỊ ỌZỌ MERE NÁ NDỤ M

N’afọ 1988, a kpọrọ m ka m bịa ememme a ga-eji nyefee Chineke ụlọ ndị a rụrụ ọhụrụ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Gana. Agaghị m echefu ụbọchị ahụ echefu. Mgbe m gara Gana n’afọ 1948, Ndịàmà Jehova nọ na ya ebughị ibu. Ma, mgbe m bịara ememme a n’afọ 1988, Ndịàmà Jehova nọ na Gana akarịala puku mmadụ iri atọ na puku anọ. Ugbu a, ọ fọrọ obere ka ha ruo otu narị puku mmadụ na puku iri na anọ.

Afọ abụọ m gachara Gana, ya bụ, n’abalị isii n’ọnwa Ọgọst nke afọ 1990, alụrụ m Betty Miller. Ya na nwunye m mbụ bụ ezigbo enyi. Mụ na ya ji ozi Jehova mere ihe mbụ ná ndụ anyị. Anyị na-atụ anya mgbe anyị ga-ahụ nne na nna anyị ochie, hụkwa nne na nna anyị na nwunye m mbụ n’oge ụwa ga-aghọ paradaịs.—Ọrụ 24:15.

Obi na-atọ m ezigbo ụtọ mgbe ọ bụla m chetara na mụ ejeerela Jehova ozi ihe karịrị afọ iri asaa. M na-ekele ya mgbe niile maka otú o si mee ka m jiri ozi ya mere ihe mbụ ná ndụ m. N’agbanyeghị na akarịala m afọ iri itoolu ugbu a, Jehova, bụ́ Injinịa kachanụ, ka na-enye m ike m ji na-efe ya.