Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche  |  Disemba 2013

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ọ̀ BAARA ANYỊ URU?

Uru Chineke Baara Anyị

Uru Chineke Baara Anyị

Ndị dọkịta na-ekwu na ọ bụrụgodị na mmadụ nwere ego ga-ezuru ya igbo mkpa ya, ọ bụghị ya ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ. Ihe gosiri na ihe a ha kwuru bụ eziokwu bụ na ndị mmadụ na-achọ ime ihe ụfọdụ pụrụ iche ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. Ụfọdụ na-ewepụta oge ha na-ekiri ihe ndị e kere eke, na-amụ egwú, na-ese ihe osise ma na-eme ihe ndị ọzọ ka ha mara ma hà ga na-enwe obi ụtọ. Ma, ihe a niile anaghị eme ka ha nwee ezigbo obi ụtọ ma ọ bụ ka ndụ ha nwee isi.

Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi

Ihe e dere n’akwụkwọ Jenesis isi nke mbụ ruo isi nke atọ, gosiri na mgbe Chineke kechara Adam na Iv, ya na ha na-ekwurịta okwu ọtụtụ ugboro. Nke ahụ mere ka ha mata onye ọ bụ. (Jenesis 3:8-10) Ọ na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Onye kere ha dịrị ná mma n’ihi na o keghị ha ka ha nọrọ n’amaghị ya. Ọtụtụ ebe na Baịbụl gosiri na ọ dị mkpa ka ụmụ mmadụ mata onye kere ha.

Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru na “obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ mata Chineke, ndụ anyị ga-enwe isi, anyị enweekwa obi ụtọ. Oleekwanụ otú anyị ga-esi amata Chineke? Jizọs gwara anyị, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Olee otú okwu niile si n’ọnụ Chineke, ya bụ, ihe Chineke kwuru na Baịbụl, ga-esi eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, ndụ anyị enweekwa isi? Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha.

Anyị Chọrọ Onye Ga Na-edu Anyị

Ebe ọ bụla ị gara taa, ị ga-ahụ na e nwere ọtụtụ ndị ọrụ ha bụ ịgwa ndị mmadụ otú ha ga-esi na-enwe obi ụtọ, otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma, otú mmadụ na ndị ezinụlọ ya ga-esi na-ebi n’udo, otú e si edozi esemokwu, na ihe ndị ọzọ. Ma, a sị ka e kwuwe, ò nwere onye ọzọ ga-eduzi ụmụ mmadụ ma gwa ha otú ha ga-esi na-ebi ndụ ma ọ́ bụghị Onye kere ha, ya bụ, Jehova Chineke?

Baịbụl na-akọrọ anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. O yiri akwụkwọ na-akọwa otú kamera ọhụrụ si arụ ọrụ

 Ka e were ya na ị zụtara kamera ma ọ bụ kọmputa ọhụrụ. Ị ga-atụ anya na ndị rụrụ ya ga-etinyere gị akwụkwọ kọwara otú o si arụ ọrụ. E nwere ike ikwu na Baịbụl yiri ụdị akwụkwọ ahụ. Chineke nyere ya ụmụ mmadụ ka ha si na ya mata otú ha kwesịrị isi na-ebi ndụ. Baịbụl kwuru ihe ụmụ mmadụ ga na-eme ka ndụ ha nwee isi.

Baịbụl gwakwara ụmụ mmadụ ihe ndị nwere ike ime ka ndụ ha laa n’iyi. Ndị mmadụ nwere ike ịgwa anyị ihe ndị anyị chọrọ ịnụ ma ọ bụ ihe ndị anyị chere ga-akara anyị mfe ime. Ma, ọ̀ bụ na ihe agaghị akara anyị mma ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Onye kere anyị gwara anyị?

“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso. A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.”—Aịzaya 48:17, 18

Baịbụl gwara anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ na ihe ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma

Ọ bụ eziokwu na Jehova Chineke na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-eme, ma ọ naghị amanye anyị amanye ka anyị mee ha. N’eziokwu, ọ hụrụ anyị n’anya, ọ chọkwara ka ihe dịrị anyị ná mma. Ọ bụ ya mere o ji gwa anyị, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso. A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu! Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri, ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.” (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụrụ na anyị emee ihe Chineke kwuru, ihe ga-adịrị anyị ná mma. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịmata Chineke.

Anyị Chọrọ Onye Ga-aza Anyị Ajụjụ Ndị Na-agbagwoju Anyị Anya

Ụfọdụ ndị chere na ha ekwesịghị ikwere na Chineke maka na e nwere ọtụtụ ihe na-agbagwoju ha anya ma na-eme ka ha chee na ikwere na Chineke abaraghị ha uru. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịjụ, sị: ‘Gịnị mere ndị ezi omume ji ata ahụhụ?’ ‘Gịnị mere ụfọdụ ụmụ ọhụrụ na-enweghị ihe ha mere ji enwe nkwarụ?’ ‘Gịnị mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na ajụjụ ndị a dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na anyị amata azịza ha, ihe nwere ike ịkara anyị mma. Ma, kama ikwuwe na ọ bụ Chineke mere imi na anya ji dị anyị otú a, ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru.

Akwụkwọ Jenesis isi nke atọ kọọrọ anyị gbasara Setan. O kwuru na Setan mere ka à ga-asị na ọ bụ agwọ ka ọ ghọgbuo Adam na Iv ka ha nupụrụ Jehova Chineke isi ma rie mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ. Mgbe ọ bịakwutere Iv, ọ sịrị ya: “Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Jenesis 2:16, 17; 3:4, 5.

Setan na-ekwu na Chineke bụ onye ụgha nakwa na otú o si achị ndị o kere adịghị mma. Ọ na-ekwukwa na ihe ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ọ bụrụ na ha emee ihe o kwuru. Olee otú a ga-esi amata ma ihe a Setan kwuru ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha? Jehova kpebiri ka e jiri nwayọọ nwayọọ dozie ya ka onye ukwu na onye nta jiri  anya ya hụ ma ihe ahụ Setan kwuru ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha. Chineke sikwa otú ahụ nye Setan na ndị òtù ya ohere ka ha gosi ma ihe ọ̀ ga-akara ụmụ mmadụ mma ma ha gbakụta Chineke azụ.

Gịnị ka gịnwa chere? Ihe ahụ Setan kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Ụmụ mmadụ hà ga-achịli onwe ha? Ihe ọ̀ ga-akara ha mma ma ha gbakụta Chineke azụ? Ahụhụ, ọrịa, ikpe mkpegbu, ọnwụ, mpụ, omume rụrụ arụ, agha, na ihe ọjọọ ndị ọzọ juru ebe niile n’ụwa kemgbe ọtụtụ narị afọ na-egosi na mbọ niile ụmụ mmadụ gbarala ịchị onwe ha akụọla afọ n’ala. Baịbụl mere ka anyị mata na ọ bụghị Chineke kpataara ụmụ mmadụ ahụhụ ha na-ata, kama ọ gwara anyị ihe na-akpata ya. Ọ sịrị na ọ bụ n’ihi ‘ọchịchị nchịgbu ụmụ mmadụ na-achị ibe ha.’—Ekliziastis 8:9.

Ọ̀ bụ na ihe ndị a anyị lebarala anya anaghị egosi na anyị kwesịrị ịgakwuru Chineke ka ọ zaa anyị ajụjụ ndị na-agbagwoju anyị anya ma gwa anyị ihe ga-akwụsị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata? Olee ihe Chineke ga-emere anyị?

Anyị Chọrọ Ka Chineke Nyere Anyị Aka

O teela ụmụ mmadụ chọwara ka ha kwụsị ọrịa, nká, na ọnwụ. Ma, ihe na-ebe ka na-ebe n’agbanyeghị mbọ ha gbarala nakwa nnukwu ego ha mefurula. Ụfọdụ ndị chere na o nwere ọgwụ ma ọ bụ mmiri ọ ga-abụ ha ṅụọ ma ọ bụ ebe ọ ga-abụ ha biri, ha agaghị emekata kaa nká. Ma, o nweghị nke nwere isi.

Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o bu n’obi ka ihe gaziere ha nakwa ka ha na-enwe obi ụtọ. O chefubeghị ihe ahụ o bu n’obi kee ha. (Jenesis 1:27, 28; Aịzaya 45:18) Jehova Chineke kwuru na ihe ọ bụla o bu n’obi ime ga-emezurịrị. (Aịzaya 55:10, 11) Baịbụl gwara anyị na Chineke kwere nkwa ime ka ụwa ghọọ paradaịs otú ahụ ọ dị mgbe o kere Adam na Iv. Akwụkwọ Mkpughe kwuru, sị: ‘Jehova Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’ (Mkpughe 21:4) Olee otú Chineke ga-esi eme ka ihe ọma a niile o kwere ná nkwa mezuo, oleekwa otú nkwa ndị a o kwere nwere ike isi baara anyị uru?

Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka uche Chineke mee n’ụwa. Ọtụtụ ndị ma ihe a Jizọs kwuru, ha na-ekwukwa ya mgbe ha na-ekpe Ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) N’eziokwu, Jehova Chineke ga-eji Alaeze a wepụ nsogbu niile ọchịchị ụmụ mmadụ kpataara ndị mmadụ ma mee ka ụwa ghọọ paradaịs otú ahụ o kwere ná nkwa. * (Daniel 2:44; 2 Pita 3:13) Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe a Chineke kwere ná nkwa baara anyị uru?

 Jizọs Kraịst kwuru ihe dị mkpa anyị ga-emerịrị. Ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’eziokwu, ebe ọ bụ na Chineke na-enyere anyị aka, anyị nwere ike ịdị ndụ n’ụwa mgbe ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ihe a Chineke kwere ná nkwa so n’ihe ga-eme ka obi sie gị ike na Chineke baara anyị uru.

Ugbu A Bụ Oge Anyị Kwesịrị Iche Echiche Gbasara Chineke

Ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Pọl onyeozi gwara ndị Atens okwu gbasara Chineke n’obodo Ariopagọs, nke dị n’Atens. Ọ sịrị ha: “Ya onwe ya na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile. N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ, ọbụna dị ka ụfọdụ ndị na-ede abụ uri n’etiti unu kwuru, ‘N’ihi na anyị bụkwa ndị ọ mụrụ.’”—Ọrụ Ndịozi 17:25, 28.

Ihe ahụ Pọl gwara ndị Atens ka bụkwa eziokwu n’ihi na ọ bụ Onye kere anyị na-enye anyị nri anyị na-eri na mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ya mere ka anyị na-eku ume. N’eziokwu, ọ bụrụ na Jehova anaghị emere anyị ihe ọma ndị a, anyị agaraghị anọ ndụ. Ma, gịnị mere Chineke ji ka na-emere ụmụ mmadụ ihe ọma a niile, ma hà na-eche banyere ya ma ọ bụ na ha anaghị eche? Pọl kwuru na ihe kpatara ya bụ “ka ha wee chọọ Chineke, ka ha wee sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ Ndịozi 17:27.

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu Chineke na ihe ndị o bu n’obi ime? Ị̀ ga-achọ ịmatakwu ihe ndị o kwuru ka anyị na-eme ka ihe dịrị anyị ná mma ugbu a, dịkwara anyị ná mma ruo mgbe ebighị ebi? Ọ bụrụ na ị chọrọ, anyị na-agba gị ume ka ị gwa Onyeàmà Jehova nyere gị magazin a ma ọ bụ gị ezitere ndị bipụtara Ụlọ Nche a ozi. Obi ga-atọ ha ụtọ inyere gị aka.

^ para. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Alaeze ahụ ga-esi eme ka uche Chineke mee n’ụwa, gụọ isi nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike ịgụ ya n’Ịntanet ma ọ bụ danloduo ya n’adres anyị bụ́ www.jw.org/ig.