Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE NỌVEMBA 2013

 IHE NDỊ NA-EME KA E NWEE OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ

Otú Gị na Nwa Gị Na-eto eto Ga-esi Na-ekwurịta Okwu n’Eseghị Okwu

Otú Gị na Nwa Gị Na-eto eto Ga-esi Na-ekwurịta Okwu n’Eseghị Okwu

“Mgbe nwa m nwaanyị dị afọ iri na anọ, o bidoro ịsa m okwu otú na-adịghị mma. M sị ya, ‘Bịa rie nri,’ ya asị m, ‘Mgbe ọ bụla ọ masịrị m, mụ erie.’ M jụọ ya ma ò mechaala ihe m gwara ya mee, ya asị m, ‘Enyezila m nsogbu.’ Ọtụtụ mgbe, mụ na ya na-abarịta mba.”—MAKI, JAPAN. *

Ọ bụrụ na nwa gị ka na-eto eto, ọ bụ mgbe gị na ya sere okwu ka a ga-amata ma ị̀ ma nke a na-akọ n’ịzụ ụmụ, matakwa ma ị̀ na-enwe ndidi. Otu nwaanyị Brazil aha ya bụ Maria, bụ́ onye nwa ya nwaanyị dị afọ iri na anọ, sịrị: “Ọ na-ewe m ezigbo iwe ma m gwa nwa m ihe ọ ga-eme, ya arụọ m ụka. Nke a na-eme ka mụ na ya barịtawa mba.” Otu nwaanyị Ịtali aha ya bụ Carmela nwekwara ụdị nsogbu ahụ. Ọ sịrị: “Mụ na nwa m nwoke na-abarịtakarị mba. Anyị na-abagide mba ruo mgbe ọ banyere n’ọnụ ụlọ ya kpọchie ụzọ.”

Gịnị mere ụfọdụ ndị na-eto eto ji esesa ndị mụrụ ha okwu? Ọ̀ bụ n’ihi ndị ha na ha na-akpa? O nwere ike ịbụ ya. Baịbụl kwuru na ndị ha na mmadụ na-akpa nwere ike ime ka onye ahụ kpawa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ vidio na ihe ndị ọzọ a na-emepụtara ndị na-eto eto na-eme ka ha chee na inupụrụ ndị mụrụ ha isi enweghị ihe o mere.

Ma e nwekwara ihe ndị ọzọ mere ndị na-eto eto ji esesa ndị mụrụ ha okwu. Ọ bụrụ na ị mata ihe ndị ahụ, ị ga-aghọta ihe i kwesịrị ime iji nyere nwa gị aka. Ka anyị lebagodị anya n’ụfọdụ n’ime ha.

NWA GỊ AMỤTAWALA ICHE ECHICHE KA DIMKPA

Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọrọ dimkpa, ahapụwo m omume nwa ọhụrụ.” (1 Ndị Kọrịnt 13:11) Ihe a Pọl kwuru gosiri  na otú ụmụaka si eche echiche dị iche n’otú ndị toro eto si eche. Olee otú o si dị iche?

Ụmụaka na-aghọta ihe elu elu. Ma, ndị toro eto na-eleru ihe anya, chebara ya echiche nke ọma tupu ha amata ihe ha ga-eme. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị toro eto na-ebu ụzọ chee echiche ma ihe ha chọrọ ime ọ̀ dịkwa mma nakwa otú ndị ọzọ ga-esi ele ihe ahụ anya. O nwekwara ike ịbụ na iche echiche otú ahụ amarala ha ahụ́. Ma, ndị na-eto eto amụtachabeghị ime otú ahụ.

Baịbụl gwara ndị na-eto eto ka ha gbalịa mee ka “ikike iche echiche” ha rụwa ọrụ nke ọma. (Ilu 1:4) Baịbụl gwadịrị Ndị Kraịst niile ka ha jiri “ikike nghọta” ha na-eme ihe niile ha na-eme. (Ndị Rom 12:1, 2; Ndị Hibru 5:14) Ma mgbe ụfọdụ, otú nwa gị si eche echiche nwere ike ime ka ọ rụọ gị ụka. O nwedịrị ike ịrụ gị ụka n’ihe na-enwedịghị ihe ọ bụ ma ọ bụkwanụ kwuo ihe ga-eme ka i chewe ma ọ̀ na-echekwadị echiche. (Ilu 14:12) Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, olee otú ị ga-esi agwa ya okwu ka o nwee ike iche echiche kama gị na ya ịrụwa ụka?

MEGODỊ IHE A: Buru n’obi na o nwere ike ịbụ na nwa gị ahụ na-eto eto echebawarala ihe echiche, n’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe mere o ji kwuo ihe o kwuru bụ ka o gosi na ya amatawala ihe, ọ bụghị na ọ ga-emerịrị ihe ahụ o kwuru. Ị chọọ ịmata ihe dị ya n’obi, buru ụzọ jaa ya mma maka ihe o kwuru. (“Obi dị m ụtọ na i chewala echiche nke ọma n’agbanyeghị na mụ ekwetachaghị ihe niile i kwuru.”) Nyeziere ya aka ka o chebakwuoro ihe ahụ o kwuru echiche. (“Ì chere na ọ bụ otú a i kwuru ya ka e kwesịrị ịna-eme ya mgbe niile?”) Mgbe i kwuru nke a, nwa gị nwere ike ichebara ihe ahụ o kwuru echiche ma kwuzie ihe dị iche n’ihe o kwuburu.

Ma, buru n’obi na mgbe ị na-agbalị ka i mee ka nwa gị mụta iche echiche nke ọma, ọ bụghị mgbe niile ka okwu ga-ebi n’ọnụ gị. Ọ bụrụgodị na o yie ka ọ nabataghị ihe i kwuru, o nwere ike isi n’ihe ahụ unu kwurịtara mụta ihe karịa otú i chere, n’agbanyeghị na o nwere ike ọ gaghị agwa gị ya. E nwere ike mgbe ụbọchị ole na ole gachara, nwa gị ahụ emee ihe ahụ i kwuru ma ọ bụdị kwuwezie na ọ bụ ihe ya nọ na-ekwu kemgbe.

“Mgbe ụfọdụ, obere ihe na-esere mụ na nwa m nwoke okwu. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ maka na m gwara ya ka ọ ghara ịtụfusị ihe oriri ma ọ bụ ka ọ ghara ịchọ nwanne ya ntakịrị okwu. Ma, m chọpụtara na o mewe ihe ahụ, ihe ọ na-achọkarị bụ ka m jụọ ya ihe o bu n’obi na-eme ya ma gosi ya na m ghọtara ihe mere o ji eme ya ma sị ya, ‘Ọ̀ bụ ihe a mere i ji mee ya?’ ma ọ bụkwanụ ‘Ọ̀ bụ ihe a ka i bu n’obi?’ M chọpụtala na a sị na m na-ekwu ụdị ihe a, o nwere ike mụ na ya agaraghị na-ese okwu otú anyị sere.”—Kenji, Japan.

NWA GỊ KA NA-AGBALỊ KA O KPEBIE ỤDỊ MMADỤ Ọ GA-ABỤ

Ndị nne na nna ma ihe na-enye ụmụ ha ohere ka ha kwuo ihe dị ha n’obi

Otu ihe dị mkpa dị n’ịzụ onye na-eto eto bụ ịkwadebe ya maka oge ọ ga-ahapụ ụlọ ndị mụrụ ya gaa biri nke ya. (Jenesis 2:24) Otu n’ime ihe ndị ga-egosi na o toruola ibiri onwe ya bụ na ọ bụ ya ga-ekpebi ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ, ya bụ, ụdị àgwà ọ ga na-akpa, ihe ndị ọ ga-ekwere na ndị ọ na-agaghị ekwere, na ihe ndị ga-amasị ya na ndị na-agaghị amasị ya. Nke a ga-eme ka mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara ya, ọ ga-ebu ụzọ chee echiche nsogbu ga-abịara ya ma ọnwụnwa ahụ merie ya. Ọ ga-ajụkwa onwe ya, sị: ‘Olee ụdị mmadụ m bụ? Olee ihe ndị na-adị m mma na ndị na-anaghị adị m mma? Olee ihe onye dị ka m kwesịrị ime ma ụdị ọnwụnwa a bịara ya?’—2 Pita 3:11.

Baịbụl kọọrọ anyị banyere Josef, bụ́ nwa okorobịa nke kpebiri ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ. Dị ka ihe atụ, mgbe nwunye Pọtịfa nọ na-enye Josef nsogbu ka ya na ya kwaa iko, Josef sịrị: “Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?” (Jenesis 39:9) Josef ma na Chineke kpọrọ ịkwa iko asị n’agbanyeghị na Chineke enyebeghị ụmụ Izrel iwu ka ha ghara ịkwa iko. Ihe a Josef kwuru, ya bụ, “olee otú m ga-esi,” gosiri na o weere ịkwa iko otú Chineke si were ya. O burula ụzọ kpebie ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ.—Ndị Efesọs 5:1.

Nwa gị ka na-agbalị ka o kpebie ụdị mmadụ ọ ga-abụ. Ọ dị mma ka o mee otú ahụ n’ihi na nke a ga-enyere ya aka ka ọ ghara iso ndị ọgbọ ya mee ihe na-adịghị mma. (Ilu 1:10-15) Ma nke a nwekwara ike ime ka ọ na-esiri gị ọnwụ. O mee otú ahụ, olee ihe ị ga-eme?

MEGODỊ IHE A: Kama ikwe ka gị na ya sewe okwu, kwughachi ihe o kwuru. (“Ka m legodị ma m̀ ghọtara ihe i kwuru. Ihe ị na-ekwu bụ na . . . ”) Jụzie ya ajụjụ. (“Gịnị mere i ji kwuo otú ahụ?” ma ọ bụ “Gịnị mere i ji chee na ọ dị mma?”) Jụọ nwa gị ajụjụ ga-eme ka ị mata ihe dị ya n’obi. Hapụ ya ka o kwuo ihe o chere. Ọ bụrụ na ihe ọ chọrọ ime abụghị ihe ọjọọ, ma ya  abụrụ na ọ bụghị ihe gịnwa chọrọ ka o mee, mee ka ọ mata na ị ga-ahapụ ya ka o mee ihe ahụ n’agbanyeghị na ọ dịchaghị gị mma.

Mmadụ ikpebi ụdị mmadụ ọ ga-abụ bara ezigbo uru. A sị ka e kwuwe, Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst ekwesịghị ịdị ka ụmụ ọhụrụ bụ́ “ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.” (Ndị Efesọs 4:14) N’ihi ya, gbaa nwa gị ume ka o kpebie ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ ma ghara ikwe ka ndị ọzọ megharịa ya anya.

“Mgbe ọ bụla m gosiri ụmụ m ndị nwaanyị na m chọrọ ige ntị n’ihe ha na-ekwu, ọ na-aka adịrị ha mfe ige ntị n’ihe mụnwa na-ekwu, ọ bụrụgodị na ọ dị iche na nke ha. Anaghị m amanye ha ka ha kweta ihe m kwuru, kama m na-ahapụ ha ka ha jiri aka ha chee echiche ma ghọta ihe ha kwesịrị ime.”—Ivana, Chek Ripọblik.

ỤKWỤ KWESỊRỊ ISI GỊ IKE N’ALA, MA EJILA AKA IKE ZỤỌ HA

Ụfọdụ ndị na-eto eto na-eme ka obere ụmụaka. Ha na-enyegide ndị mụrụ ha nsogbu ruo mgbe ndị mụrụ ha meere ha ihe ha kwuru. I kwesịrị ịkpachara anya ma ọ bụrụ na ụdị ihe a na-emekarị n’ezinụlọ unu. Ọ bụ eziokwu na ime ihe ụmụ gị kwuru nwere ike ime ka ha kwụsị inye gị nsogbu, ma ime otú ahụ na-akụziri ha na ọ bụrụ na ha enye gị nsogbu, ha ga-enweta ihe ha chọrọ. Ma olee ihe i kwesịrị ime? Mee ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.” (Matiu 5:37) Ndị na-eto eto agaghị na-arụ gị ụka ma ha chọpụta na nsogbu ha na-enye gị agaghị eme ka ị gbanwee obi gị.

Ma nke a apụtaghị na i kwesịrị iji aka ike na-azụ ha. Dị ka ihe atụ, hapụ nwa gị ka o kwuo ihe mere ọ na-agaghị alọta n’oge unu kwuru ka ọ na-alọta. I mee otú ahụ, ọ pụtaghị na nwa ahụ na-atụrụ gị ụka, kama ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́: ‘Mee ka mmadụ niile mara na i nwere ezi uche.’—Ndị Filipaị 4:5.

MEGODỊ IHE A: Gị na ndị ezinụlọ gị nọkọọ kwurịta oge ị chọrọ ka ụmụ gị jiri na-alọta nakwa ihe ndị ọzọ ị chọrọ ka ha na-eme n’ụlọ. Gosi ha na ị dị njikere ige ha ntị na ichebara ihe ha ga-ekwu echiche tupu gị ekpebizie ihe ị chọrọ ka ha na-eme. Otu nwoke bi na Brazil aha ya bụ Roberto sịrị: “Ndị nne na nna kwesịrị ime ka ụmụ ha mata na ha dị njikere imere ha ihe ha kwuru ma ọ bụrụ na ime ihe ahụ agaghị eme ka ha mebie iwu Baịbụl.”

Ma, o nweghị nne ma ọ bụ nna zuru okè. Baịbụl sịrị na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ọ bụrụ na i so kpata ihe seere gị na nwa gị na-eto eto okwu, rịọ ya mgbaghara. Ọ bụrụ na i kweta na ihe i mere adịghị mma, ọ ga-eme ka nwa gị mata na ị dị umeala n’obi, meekwa ka ọ mụta ime ka gị.

“Otu ụbọchị mụ na nwa m sere okwu, m rịọrọ ya mgbaghara mgbe obi dajụrụ m. Nke a mere ka obi dajụọ ya, meekwa ka ọ dịrị ya mfe ige m ntị.”—Kenji, Japan.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe ụfọdụ m na-eme bụ́ ndị so na-akpatara mụ na nwa m esemokwu?

  • Olee otú ihe e dere n’isiokwu a ga-esi enyere m aka ka m na-aghọtakwu ihe mere nwa m ji eme ihe ụfọdụ ọ na-eme?

  • Olee ihe m ga-eme ka mụ na nwa m na-ekwurịta okwu n’eseghị okwu?